Igbo Mass Readings for July 23 2024, Tuzde Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 23 2024, Tuzde Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:14-15, 18-20
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Micah
Jiri mkpara onye ncheatụrụ chịga ndị nke gị n’ebe ahịhịa ha ga-eri dị, duokwa igwe atụrụ a bụ ihe nketa gị, bụ ndị bi n’ime oke ọhịa a, ala anaghị amịta mkpụrụ.
Mee ka ha taa nri n’obodo Bashan na Giled dịka na mgbe ochie. Dịka n’ụbọchị ahụ ụnụ siri n’ljipt pụta, aga m egosi ha ihe ịtụnaanya.
Kedụ chi a ga-eji tụnyere gị n’ịgbaghara njọ na ileghara mmehie ndị nke ya anya? Ọ naghị anọgide n’iwe ebighịebi, kama ọ na-enwe mmasị n’igosi ịhụnaanya dị ọkpụ.
Ọ ga-egosi anyị ebere ya ọzọkwa, kpọchapụ mmehie anyị niile, tụnye njọ anyị niile n’ala ala osimiri. Ị ga-egosi Jekọb ntụkwasịobi, gosịkwa Abraham ịhụnaanya gị dị ọkpụ dịka i si nụọrọ nna anyị ha n’iyi site na mgbe ochie.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 85:1-3, 4-5, 6-7
Azịza: Onyenwanyị gosi anyị ịhụnaanya gị dị ọkpụ
1. Onyenweanyị ị gosịla ndị nke gị afọọma gị.
i weghachikwala ọñụ Jekọb,
I kpochapụla arụ ndị nke gị;
ị gbagharala njọ ha niile.
Ị kwụsịrị iwe gị n’ebe anyị nọ;
iwe gị dị ọkụ adajụọla. Azịza
2. Kpọchigha anyị azụ, O Chineke onye nzọpụta anyị,
iwe gị adịla ọkụ n’ebe anyị nọ!
Iwe gị n’ebe anyị nọ ọ ga-adị ebeebe?
Iwe gị ọ ga-eru na ndụdụgandụ niile? Azịza
3. Ọ bụ na ị gaghị enyeghachị anyị ndụ ọzọ,
Ka ndị nke gị nwee añụrị na gị?
Gosị anyị ịhụnaanya gị dị ọkpụ O Onyenweanyị,
nyekwa anyị nzọpụta gị. Azịza
MBEKU – Ps. 25:4, 5
Alleluia, Alleluia:
Mee ka m mata ụzọ gị, O Onyenweanyị, dube m n’ụzọ eziokwu gị.
Alleluia.
OZIỌMA – 12:46-50
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Mgbe Jesu ka nọ na-agwa ndị mmadụ okwu, nne ya na ụmụnne ya bịara kwụrụ n’ezi na-achọ ka ha gwa ya okwu. Otu onye gwara ya sị, “Lee, nne gị na ụmụnne gị kwụ n’ezi na-achọ ịgwa gị okwu”.
Ọ zara ya sị, “Onye bụ nne m, olee ndị bụ ụmụnne m?” Ọ tụrụ ndị na-eso ụzọ ya aka sị, “Ndị a bụ nne m na ụmụnne m!
N’ihina onye ọbụla nke na eme uche Nna m nke bi n’eluigwe bụ nwanne m nwoke, nwanne m nwaanyị na nne m”.
Igbo Mass Readings for July 24 2024, Wenezde Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for July 23 2024, Tuzde Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume