Igbo Mass Readings for August 12 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 12 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 31:1-8

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Diuterọnọmi

Mosis gakwara n’ihu ịgwa ndị Izrel niile okwu, sị, “Ugbu a, agbaala m otu narị afọ na iri afọ abụọ. Adịghịkwa m ike ịbụ onyendu ụnụ.

Ọ bụghị naanị nke a, Chineke agwakwala m na m agaghị agafe osimiri Jọdan. Yahweh bụ Chineke ụnụ n’onwe ya, ga-ebu ụnụ ụzọ gaa, ikpochapụ mba niile bi n’ala ahụ ụnụ na-aba n’ime ya, tupu ụnụ abịaruo, ka ụnụ wee bichie n’ala ha.

Jọshụa ga-abụ onyendu ụnụ dịka Chineke kwuru. Yahweh ga-ekpochapụ ndị ahụ niile dịka O si merie Sihọn na Ọg, ndị bụ ndịeze ndị Amọ, wee bibie ala ha.

Osebụrụwa ga-eme ka ụnụ merie ha. Ụnụ ga-emesokwa ha dịka m nyere ụnụ n’iwu. Ike agwụla ụnụ, ụnụ amakwala jijiji n’ihu ha n’ihina ụnụ na Yahweh bụ Chineke ụnụ n’onwe ya ga-eso.

O kwesịrị ntụkwasịobi. Ọ gaghị ahapụ ụnụ.” Mosis wee kpọọ Jọshụa n’ihu ụmụ Izrel niile sị ya, ike agwụla gị, obi sie gị ike, n’ihina gị onwe gị ga-edu ndị nke a banye n’ala ahụ Chineke kwere nnanna ha na nkwa.

Yahweh n’onwe ya ga edu gị. Ọ ga-anọnyekwara gị. Ọ gaghị ahapụ gị mọbụ gbakụta gị azụ. Ya bụ atụla egwu, obi adala gị mba.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Deut. 32: 3-4, 7, 8, 9, 12

Azịza: Oke nke Osebụrụwa bụ ndị nke ya.

1. N’ihina aga m ekwusa aha Osebụrụwa

Ndị nke ya ga-akọkwa akụkọ banyere ịdị ukwu ya.

Yahweh bụ oke Nkume anyị ọrụ ya niile zuru oke.

Ụzọ ya niile ziri ezi. Azịza

2. Chetanụ mgbe ochie niile gara aga,

Chịgharịanụ n’obi ụnụ banyere ogologo afọ niile,

nke ọgbọ dị ichiche gara aga

jụanụ nna ụnụ ha ka ha kọọrọ ụnụ

jụkwaanụ ndị okenye ka ha gwa ụnụ. Azịza

3. Mgbe onye kachasị ihe niile elu

kenyere mba niile ala ha,

O jiri aka ya kpebie ebe ndị ọbụla ga-ebi,

Dịka ọnụọgụgụ ụmụ ya siri dị. Azịza

4. Ma oke nke Osebụrụwa bụ ndị nke ya

Ọ họọrọ Jekọb ihe nketa nke ya

Naanị Yahweh bụ onyendu ya

ọ dịghịkwa chi ọzọ nyeere ya aka. Azịza

MBEKU – Matiụ 11:25

Alleluia, Alleluia:

Ana m ekele gị Nna Dinwenụ nke eluigwe na ụwa, n’ihina i kpugheere ụmụntakịrị ihe ndị a I zonahụrụ ndị amamihe na ndị okemmụta.

Alleluia.

OZIỌMA – 18:1-5, 10, 12-14

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

N’oge ahụ ndị na-eso ụzọ Jesu bịakwutere ya jụọ ya sị, “Olee onye kachasị ibe ya ukwuu n’alaeze eluigwe?”

O wee kpọrọ otu nwatakịrị kwụba ya ọtọ n’etiti ha sị, “N’ezie agwa m ụnụ, ọ bụrụ na ụnụ agbanweghị dịka ụmụntakịrị, ụnụ agaghị aba n’alaeze eluigwe.

Onye ọbụla nke wedara onwe ya ala dịka nwatakịrị a, ọ bụ ya kachasị ukwu n’alaeze eluigwe. “Onye ọbụla nke ga-anabata nwatakịrị dị otu a nke ọma n’aha m anabatala m.

Lezienụ anya ka ụnụ ghara ileli otu n’ime ụmụaka ndị a. N’ihina ana m agwa ụnụ na ndị mmụọọma ha nọ n’eluigwe na-ahụ ihu Nna m nke bi n’eluigwe oge niile.

N’ihina Nwa nke mmadụ bịara ịzọpụta ndị furu efu. Gịnị ka ụnụ chere? Ọ bụrụ na otu onye nwere otu narị atụrụ, ma otu n’ime ha agahie ụzọ, ọ bụ na ọ gaghị ahapụ iri itoolu na itoolu ndịọzọ n’elu ugwu gaa ịchọ nke ahụ gahiere ụzọ?

Ọ bụrụ na o nwere ka o si chọta ya, n’ezie agwa m ụnụ, ọ ga-añụrị ọñụ n’ihi ya karịa otu ọ ga-esi ñụrịa n’ihi iri itoolu na itoolu ndịọzọ ahụ na-agahịeghị ụzọ.

Ya mere, ọ bụghị uche Nna m nke bi n’eluigwe ka otu n’ime ụmụaka ndị a laa n’iyi.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for August 12 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 11, 2022