Igbo Mass Readings for June 20 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 20 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:1-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke abụọ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt
Ụmụnna m, achọrọ m ka ụnụ mata banyere ihe nke amara Chineke rụrụ na nzukọ Kristi niile dị n’ala Masedonia. Mkpagbu na ọnwụnwa buru ibu dakwasara ha ogologo mgbe.
Ma site n’amara Chineke, ọñụ ha nwere buru ibu karịa nke ndịọzọ. Ọnọdụ mkpa na ụkọ nke ha nọ n’ime ya dịka nke ogbenye ọnụntụ. Ma ha sitere n’ụkọ ha, were mgbasapụ aka nye Chineke na mmadụ onyinye afọọma. N’ihina ha nyere dịka ike ha ha.
Dịka m kwuru, ha nyekwara karịa otu a tụrụ anya. Onyinye ha si n’obi ha pụta. Ha jikwa obi ha niile na-arị ka anyị kwe ka ha soro, na-eweta onyinye inyeaka nke a na-ezigara ndị nsọ nọ na Judia.
Anyị atụghịkwa anya nke a. Ha buru ụzọ nye Dinwenụ onwe ha, e mechaa ha nyekwa anyị onwe ha dịka uche nke Chineke siri dị. Nke a mere anyị ji rịọ Taịtus onye malitere ọrụ n’etiti ụnụ, ka ọ rụruo ọrụ amara ahụ n’isi.
Ugbu a, ụnụ bakarịrị ndịọzọ n’ụba n’ihe niile n’okwukwe, n’ikwuwa okwu, n’ihe ọmụma, n’ịnụ ọkụ n’obi, n’igosi ịhụnaanya ụnụ n’ebe anyị nọ – gbaanụ mbọ ka ụnụ hụ na ụnụ karịrị ndịọzọ n’ọrụ amara a.
Ọ bụghị iwu ka m na-enye ụnụ, kama ana m akọrọ ụnụ otu o si anụ ndịọzọ ọkụ n’obi inyere ha aka, ka m wee mata ma ụnụ nwere ịhụnaanya n’eziokwu.
N’ihina ụnụ maara ihe banyere amara nke Dinwenụ anyị, Jesu Kristi. Ọ bụ ezie na Kristi bụ ọgaranya, ma ọ dara ogbenye n’ihi ụnụ, ka ụnụ site n’ịbụ ogbenye ya bụrụ ọgaranya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 146:2, 5-6,7,8-9.
Azịza: Mkpụrụobi m too Chineke.
1. Aga m eto Osebụrụwa n’ụbọchị ndụ m niile,
aga m ekwegara Chineke m ukwe,
oge niile m dị ndụ. Azịza
2. Añụrị bụ nke onye nwere Chineke nke Jekọb
dịka onye enyemaka ya
onye tụkwasịrịobi ya n’Onyenweanyụ bụ Chineke ya
Onye kere eluigwe na ala,
nakwa oke osimiri na ihe niile bi n’ime ya. Azịza
3. Onyenweanyị kwesịrị ntụkwasịobi ebeebe.
Ọ na-enye ndị a na-emegbu emegbu ikpe nkwụmọtọ.
Ọ na-enye ndị agụ na-agụ nri,
ọ na-emekwa ka ndị e ji eji nwere onwe ha. Azịza
4. Onyenweanyị na-eme ka ndịisi hụ ụzọ,
Ọ na-ebulite ndị ibu arọ nyịdara n’ala,
Onyenweanyị hụrụ ndị eziomume n’anya,
Onyenweanyị na-echekwaba ndị ọbịa. Azịza
MBEKU – 1 Jọn 2:5
Alleluia, Alleluia:
Onye ọbụla nke na-edobe okwu nke Kristi, n’ezie ịhụnaanya maka Chineke zuru oke n’ime ya.
Alleluia.
OZIỌMA – 5:43-48
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ụnụ anụla na e kwuru sị, ‘Ị ga-ahụ onye agbataobi gị n’anya, ma kpọọ onyeiro gị asị’.
Ma ana m agwa ụnụ, hụnụ ndịiro ụnụ n’anya, na-ekpekwaranụ ndị na-emegbu ụnụ ekpere, ka ụnụ wee bụrụ ụmụ nke Nna ụnụ bi n’eluigwe n’ihina ọ na eme ka anyanwụ ya chakwasị ma ndị ajọ mmadụ, ma ndị ezigbo mmadụ.
Ọ na-emekwa ka mmiri na-ezoro ma ndị ọma ma ndị ọjọọ. Ọ bụrụ na ụnụ na-ahụ naanị ndị enyi ụnụ n’anya, kedụ ụgwọ ọrụ pụrụ iche ụnụ ga-anata n’aka Chineke?
Ọbụladị ndị ọna ụtụ na-emekwa otu ahụ. Ọ bụrụ na ụnụ na-ekele naanị ụmụnne ụnụ, kedụ ihe pụrụ iche ụnụ mere karịa ndịọzọ?
Ọ bụ na ndị na-ekpere arụsị anaghị eme otu abụ? Ya bụ, hụnụ onwe ụnụ ga-ezu oke dịka Nna ụnụ nke bi n’eluigwe siri zuo oke.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.