Igbo Mass Readings for April 30 2024, Tuzde Izuụka nke Ise n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 30 2024, Tuzde n’ime Izuụka nke Ise n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 14:19-28

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi

Ụfọdụ ndị Juu si n’Antiọk na Aịkonium bịaruo ebe ahụ, mee ka ndị mmadụ tụgharịa imegide ha. Ha tụrụ Pọl okwute, dọkpụrụ ya pụọ n’obodo ahụ, chee na ọ nwụọla.

Ma n’oge ndị na-eso ụzọ Jesu bịara gbaa ya gburugburu o biliri laghachi n’ime obodo. N’echi ya, ya na Banabas sooro gaa Debe. Pọl na Banabas zisara oziọma na Debe, mee ka ọtụtụ ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jesu.

E mechaa, ha laghachiri na Listra, Aịkonium na Antiọk. Ha mere ka obi ndị na-eso ụzọ Jesu nọ n’obodo ndị a sie ike, gbakwaa ha ume, ka ha kwụdosie ike n’okwukwe.

Ha gwakwara ha sị, “Anyị niile aghaghị ịta ahụhụ tupu anyị abanye n’Alaeze Chineke.” N’ime nzukọ Kristi niile ndị a, ha họpụtara ndị okenye ga-abụ ndị ndu ha.

Ha ji ekpere na ibuọnụ, nyefee ha n’aka Chineke, onye ha kwenyere na ya. Ha gafere Pisidia, ruo Pamfilịa. Mgbe ha gbasachara oziọma na Pega, ha gbadara Atalịa, si ebe ahụ banye ụgbọ mmiri ruo Antiọk nke Siria, n’ebe ahụ e jiburu ekpere rara ha nye na nchedo na amara nke Chineke, maka ọrụ ịgbasa oziọma nke ha rụzuru ugbu a.

Oge ha garuru Antiọk nke Siria, ha kpọkọrọ ndị otu Kristi niile kọọrọ ha ihe niile Chineke jiri ha rụọ, na otu o si meghere ndị mba ọzọ ọnụụzọ nke okwukwe. Pọl na Banabas nọnyere ndị na-eso ụzọ Jesu bi n’Antiọk ogolgo oge.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 145: 10-11,12-13.21.

Azịza: Ndị enyi gị na-ekwusa otito nke eze gị, O Onyenweanyị.

1. Onyenweanyị ihe niile I kere ga-ekele gị,

ndị kwere na gị ga-agọzi gị.

Ha ga-ekwupụta ebube nke alaeze gị,

ma kwupụtakwa ịdị ike gị. Azịza

2. Ka mmadụ niile mara ọrụ ịtụnaanya gị niile,

na ebube dị elu nke alaeze gị.

Alaeze gị ga-adị ebeebe,

ọchịchị gị na-adị na ndụdụgandụ niile. Azịza

3. Ọnụ m ga-ekwupụta otito nke Onyenweanyị,

 ka ihe niile o kere gọzie aha nsọ ya,

ebeebe ebeebe. Azịza

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Kristi ebiliela ma chakwasịkwa anyị, ndị oji ọbara ya wee gbapụta.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 14: 27-31.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Udo ka m na-ahapụrụ ụnụ. Udo nke m ka m na-enye ụnụ. Ọ bụghị dịka ụwa si enye udo ka m si enye ụnụ. Ka obi ghara ịlọ ụnụ mmiri ka ụnụ gharakwa ịtụ ụjọ.

Ụnụ anụla na-agwara m ụnụ na-aga m ala, ma e mechaa aga m abịakwute ụnụ. N’ihi nke a, ọ bụrụ na ụnụ hụrụ m n’anya, ụnụ gaara ịna-añụrị ọñụ na ana m alakwuru Nna, n’ihina Nna m ka m.

Ugbu a agwala m ụnụ ihe a tupu o mezuo, ka ọ ga-abụ mgbe o mezuru, ụnụ enwee ike ikwere. Bido ugbu a, ọ dịghị ọtụtụ okwu mụ na ụnụ ga-ekwu, n’ihina onye ọchịchị nke ụwa na-abịa.

O nweghị ike ọbụla n’ebe m nọ. Ana m eme dịka Nna m nyere m n’iwu, ka ụwa were mara na a hụrụ m Nna n’anya. Bilienụ ka anyị si n’ebe a pụọ.”

Igbo Mass readings for May 1 2024, Wenezde Izuụka nke Ise n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Igbo Mass Readings for April 30 2024, Tuzde Izuụka nke Ise n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Last Update: April 15, 2022