Igbo Mass Readings for February 7 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 7 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:20-31. 2:1-4

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis

Chineke sịkwara, “Ka osimiri wepụta ụmụanụ ndị na-egwu mmiri, nakwa ụmụnnunu na-efegharị na mbara igwe”. Chineke abịakwa kee nnukwu anụ ndị ahụ bi n’oke osimiri, nakwa anụ niile dị ndụ na agagharị agagharị, ndị nke mmiri na-ebugharị n’ụdị ha, nakwa nnụnụ igwe niile nwere nku n’ụdị ha.

Chineke hụkwara na ọ dị mma. Chineke gọziri ha sị, “Nweenụ mkpụrụ nke afọ, mụbaanụ ka ụnụ jupụta n’ime osimiri niile, ka ụmụnnụnụ igwe mụbaa n’elu ụwa.” Mgbede bịara, ụtụtụ abịadịkwa: ụbọchị nke ise.

Chineke sịkwara, “Ka ụwa wepụta anụ ndị dị ndụ n’ụdị ha niile, anụụlọ, ihe niile na-arịa na anụọhịa niile n’ụdị ha niile”. O mere otu ahụ. Chineke kekwara anụọhịa niile nke ụwa n’ụdị ha nakwa anụụlọ niile n’ụdị ha, nakwa ihe niile na-akpụ akpụ n’ala n’ụdị ha. Chineke hụkwara na ọ dị mma.

Chineke abịa sịkwa, “Ka anyị kee mmadụ n’oyiyi anyị na n’ụdị anyị, ka ha nwee ike ọchịchị n’ebe azụ mmiri niile dị, n’ebe nnụnụ igwe niile dị, n’ebe anụụlọ niile dị, n’ebe ụwa niile dị, nakwa n’ebe ihe niile e kere eke ji afọ aga ije n’elu ụwa dị”.

Ya mere, Chineke kere mmadụ n’oyiyi onwe ya, n’oyiyo Chineke ka o kere ya, nwoke na nwanyị ka o kere ha. Chineke gọziri ha sị ha, “Nweenụ mkpụrụ nke afọ, mụbaanụ, jupụtanụ n’ime ụwa ma chịwakwanụ ya; nweenụ ike ọchịchị n’ebe azụ dị n’ime osimiri dị, n’ebe nnụnụ nke igwe dị nakwa n’ebe ihe niile dị ndụ na-agagharị agagharị n’elu ụwa dị”.

Chineke sịkwara, “Lee enyela m gị osisi niile na-amịta mkpụrụ nke dị n’elu ụwa niile, na mkpụrụ osisi niile na-amịta mkpụrụ; Ị ga-ewere ha dịka nri gị.

Enyekwala m gị anụọhịa niile dị n’elu ụwa, nnụnụ niile na-efe n’elu, na ihe niile na akpụ akpụ n’elu ala, ihe niile nwere akwụkwọ ndụ ka ọ bụrụ ihe oriri gị. O mee otu ahụ. Chineke hụrụ ihe niile o kere, hụ na ọ dị mma n’ezie. Mgbede abịa, ụtụtụ abịakwa: ụbọchị nke isii.

Ya bụ e kechara Eluigwe na ụwa na ihe niile dị n’ime ya. Ka Chineke rụchara ọrụ okike nke ọ na-arụ, o zuru ike n’ụbọchị nke asaa.

Chineke gọziri ụbọchị nke asaa ahụ bịakwa doo ya nsọ, n’ihina ụbọchị ahụ, Chineke zuru ike mgbe ọ rụchara ọrụ okike ya. Nke a bụ usoro akụkọ Eluigwe na ụwa dịka e si kee ha.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 8:4-5, 6-7, 8-9

Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị, lee ka aha gị siri dị elu n’ụwa niile.

1. M lee anya n’eluigwe i ji aka gị mere,

ya na ọnwa na kpakpando i kere;

gịnị ka mmadụ bụ I ji eche echiche banyere ya,

nwa nke mmadụ na ị na-eleta ya anya? Azịza

2. N’agbanyeghị, i mere ka o jiri obere ihe karịa ndị mmụọọma nta,

I jikwa ugwu na nsọpụrụ chọọ ya mma dịka okpueze.

I mere ya nnaukwu ihe niile e kere eke

were ihe niile dobe n’okpuru ya. Azịza

3. Ọ na-achị ụmụatụrụ na ehi,

ya na ụmụanụọhịa ndịọzọ niile,

Ọ na-achị ụmụnnụnụ nke igwe, azụ dị na mmiri,

na anụ ndịọzọ dị n’osimiri. Azịza

MBEKU – Jemis 1:21

Alleluia, Alleluia:

Werenụ nwaayọ nara okwu ahụ nke a kụrụla n’obi ụnụ dị ka mkpụrụ, nke pụrụ ịzọpụta mkpụrụobi ụnụ.

Alleluia.

OZIỌMA – 7:1-13

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Mgbe ndị Farisii na ụfọdụ ndị odeakwụkwọ si na Jerusalem bịakwutere Jesu, ha chọpụtara na ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya na-eri ihe n’aka rụrụ arụ, ya bụ, ha adịghị akwọ aka ha. N’ihina ndị Farisii na ndị Juu niile adịghị eri ihe n’ebughị ụzọ kwọọ aka ha dịka omenaala ndị okenye ha si dị.

Ọzọ, ọ bụrụ na ha alọta ahịa, ha adịghị eri ihe n’ebughị ụzọ doo onwe ha ọcha. O nwekwara omenaala ndịọzọ ha na-edebe, dịka ịsa iko, na ite, na iko ọlanchara. Ya mere, ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ jụrụ Jesu sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị eso omenaala ndị okenye, kama ha na-eri ihe n’akwọghị aka dịka usoro si dị?”.

Ma ọ sịrị ha, “Aịzaya buziri amụma nke ọma banyere ụnụ ndị ihu abụọ dịka e dere ya n’akwụkwọ sị, ‘Ndị a na-asọpụrụ m n’egbugbere ọnụ ha, ma obi ha dị anya n’ebe m nọ. N’efu ka ha na-akpọ isiala enye m, Na-akụzi nkuzi nke mmadụ ka ọ bụ iwu nke Chineke.

Ụnụ hapụrụ iwu nke Chineke jidesie aka ike n’omenaala nke mmadụ’. O wee sịkwa ha, “Ụnụ nwere ụzọ aghụghọ ụnụ si ajụ idebe iwu Chineke, ka ụnụ wee nwee ike idebezu omenaala ụnụ natara!

N’ihina Mosis sịrị, ‘sọpụrụ nna gị na nne gị’ kwukwaa sị, ‘Onye ọbụla kwujọrọ nne ya mọbụ nna ya kwesịrị ogbugbu’.

Mana ụnụ na-akụzi sị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ asị nne ya mọbụ nna ya, ihe i nweere ike inweta n’aka m bụ ‘Kọban ya bụ ihe e nyere Chineke, iwu ejighịkwa ya ọzọ inyere nne ya mọbụ nna ya aka.

N’ụzọ dị otu a, ụnụ na-eme ka okwu Chineke bụrụ ihe efu, site n’omenaala ụnụ na-enyefe ndịọzọ n’aka. Ọtụtụ ihe dị otu a, ka ụnụ na-emekwa.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for February 7 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2024 (Kindle eBook & Paperback)

X
Scroll to Top

Receive Daily Mass Readings and Reflections via Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.