Igbo Mass Readings for June 6 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 6 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:9-14

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Tobit

Mgbe m lọtara n’abalị ahụ m lichara ya, arahụrụ m n’akụkụ mgbidi obi n’ihina adịghị m ọcha, ekpuchikwaghị m ihu m n’ihina ekpomọkụ dị n’abalị ahụ. Amaghị m na ọkịrị nọ n’elu mgbidi ahụ, nsị ha dabara m n’ime anya nke na ihe ọcha kochiri anya m.

Ejekwuuru m ndị dibịa, ma ha enyeghịrị m aka. Ka ha na-ete m ọgwụ ka ọ na-akawanye njọ. Nke a mere m jiri kpuo isi n’ikpeazụ. Anọrọ m n’ahụghị ụzọ afọ anọ.

Ọnọdụ m metụtara ụmụnne m nke ukwu nke na Ahịka lekọtara m anya afọ abụọ tupu ọ gaba Elimais. Mgbe Ahịka pụrụ, nwunye m na-akpata ego site n’ịkpa akwa.

Ọ na-enweta ego ma o resị ndị mmadụ ihe ndị ọ kpara. Otu mgbe, ha kwụrụ ya ụgwọ ma nyekwa ya otu nwa ewu. Mgbe ọ laghachitere, nwa ewu ahụ bidoro ibe akwa. Ajụrụ m ya sị, “Kedụ ebe i si nweta nwa ewu a?

Ọ bụrụ na e zuru ya ezu weghachiri ya ndị nwe ya n’ihina ọ dịghị mma iri ihe e zutere n’ohi.” Ọ zara m sị: “Ọ bụ onyinye a tụkwasaara m n’elu ụgwọ m.”

Ekwenyeghị m n’ihe o kwuru, ewere iwe ma gwa ya ka o weghachiri ya ndị nwe ya. Ma ọ zaghachiri m sị: “Kedụ ebe ọrụ ịhụnaanya na eziomume gị niile dị? Ị na-eme ka ị mazuru ihe niile.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 112:1-2,7-8, 9.

Azịza: Mkpụrụobi onye eziomume kwụ chịm; nchekwube ya dị n’Onyenweanyị.

1. Alleluịa! Añụrị na-adịrị

onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu,

onye ji ọñụ na-edebe iwu ya!

Ụmụ onye dị otu a ga-abụ ndị nwere ike n’ụwa,

agbụrụ onye ezigbo omume ga-enweta ngọzi. Azịza

2. Ebe obi ya na nchekwube ya dị n’Onyenweanyị.

ọ gaghị atụ egwu ịnata ozi ọjọọ.

O ji ntachị obi emeri egwu ya,

n’ikpeazụ ọ na-emeri ndịiro ya. Azịza

3. Ọ naghị atụfu oge inyere ndị ogbenye aka,

eziomume ya anagị agbanwe agbanwe,

ndị dị otu a na-enweta nsọpụrụ mgbe niile. Azịza

MBEKU – Heb 4:12

Alleluia, Alleluia:

Okwu Chineke dị ndụ, dị ike. Ọ bụkwa ihe nwere ike inyocha echiche na izu niile nke obi.

Alleluia.

OZIỌMA – 12:13-17

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Nịisi ndị Juu zigaara ya ụfọdụ n’ime ndị Farisii na ndị otu Herọd iji kwee ọnya maka ijide Jesu n’okwu ya. Mgbe ha bịakwutere Jesu, ha jụrụ ya sị, “Onyenkuzi, anyị ma na ị bụ onye eziokwu, na ị naghị asọ mmadụ anya, mọbụ onye na-esekpuru ọnọdụ ọbụla mmadụ nọ na ya, kama i ji eziokwu akụzi ụzọ e si efe Chineke.

Gwa anyị o ziri ezi ka anyị na-atụrụ Siza ụtụisi ka ọ bụ na o zighị ezi? Anyị ga-atụ ka ọ bụ na anyị a gaghị atụ?” Ma ebe Jesu mazuru ihu abụọ ha, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere ụnụ ji anwa m?

Weterenụ m otu mkpụrụ ego ka m leruo ya anya”. Ha wetaara ya otu mkpụrụ ego. O wee jụọ ha sị, “Onyinyo na aha onye dị n’elu ego a?”

Ha zara ya sị, “Ọ bụ nke Siza”, Jesu sịrị ha, “Nyenụ Siza ihe bụ nke Siza, nyekwanụ Chukwu ihe bụ nke Chukwu”. Azịza ya nke a tụrụ ha n’anya.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for June 6 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2024 (Kindle eBook & Paperback)

X
Scroll to Top

Receive Daily Mass Readings and Reflections via Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.