Igbo Mass Readings for December 3 2024, Tuzde Izuụka nke Mbụ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka December 3 2024, Tuzde Izuụka nke Mbụ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:1-10

Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya

Ome ga-esi n’ukwu osisi nke Jesse pụta, alaka ga-etopụta na mgbọrọgwụ ya. Mmụọ nke Osebụrụwa ga-adakwasa ya, mmụọ nke amamihe na nghọta, mmụọ nke ndụmọdụ na ike, mmụọ nke ọmụma na iwu nke chukwu.

Ịtụ egwu nke Chukwu ga-abụ ihe na-atọ ya ụtọ. Ọ gaghị eji naanị ihe anya na-ahụ kpee ikpe, nke aga-eji naanị ihe ọ nụrụ na ntị wee kpebie okwu. Kama eziomume ka ọ ga-eji kpeere ndị ogbenye ikpe; o ga-enye ndị dị umeala n’ụwa ikpe nkwụmọtọ.

Okwu ya ga-abụ mkpara igwe ga-akụtu ụwa, ikpe ya ga-ewetara ndị ajọ mmadụ ọnwụ. Eziomume ga-abụ akwa ọ ma n‘ukwu ya, ịkwụdosike ga-abụ ajị o kere n‘ukwu ya.

Nkịta ọhịa na ụmụ atụrụ ga-ebi otu ebe, agụ na ụmụ ewu ga edina. Nwa ehi na ọdụm na nwa ọdụm ga-anọkwa otu ebe; Obere nwa ga na edu ha; Ehi na edi ga na-edina otu ebe; ọdụm ga na-ata ahịhịa ka ehi.

Nwa na-añụ ara ga-egwu egwu n‘ọnụ agwọ, nwa na-eto eto ga-amanye aka n‘ọnụ agwọ ajụaja.

Ha agaghị emebi ma ọ bụ merụọ mmadụ ahụ n’elù ugwu m dị nsọ, n’ihi na ụwa ga-ejùpụta n’amamihe nke Yahweh dịka otu mmiri si jupụta n’osimiri.

N’ụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ nke Jesse, ga akwụrụ dịka ihe akara n’ihu mmadụ niile. Mba niile ga-achọba ya, ebe obibi ya ga adị ebube.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 72:1.7-8. 12-13.17.

Azịza: N’oge ya eziomume ga-achawapụta, udo ga-adịkwa ruo na njedebe ụwa.

1. Nye eze ikpe nkwụmọtọ gị, O Chineke,

nyekwa nwa eze eziomume nke gị,

Ka o were nwee ike ịchị ndị nke gị n’ụzọ ziri ezi,

nyekwa ndị ogbenye ikpe ziri ezi. Azza

2. N’oge ya eziomume ga-achawapụta,

udo ga-adịkwa ruo na njedebe ụwa,

Alaeze ya ga-esi n’osirniri ruo n’osimiri,

bido na mmiri ruo n’isi ngwụcha nke ụwa. Azza

3. Ọ ga-atọhapụ onye ogbenye kpọkuru ya,

na ndịọ niile chọrọ enyemaka ya.

Ọ ga-emere ndị ogbenye na ndị esighị ike ebere,

na azọpụta ndụ ha. Azza

4. Ngọzi dịrị aha ya ebeebe,

ka ọ dịgide dịka anyanwụ

ka agbụrụ niile dị n’ụwa nweta ngọzi na ya

ka mba niile kpọọya onye dị ngọzi. Azza

ALLELUỊA:

ALLELUỊA ALLELUỊA:

Lee, Onyenweanyị ga-abịa n’ebube, Ọ ga-emepe anya ndị nke ya.

ALLELUỊA.

OZIỌMA – 10:21-24

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

N’otu oge ahụ, obi tọrọ Jesu ụtọ site na Mmụọ Nsọ, o wee sị, Ekelee m gị Nna, Dinwenụ nke eluigwe na ụwa, n’ihi na I zobere ihe ndị a n’ebe ndị amamihe na oke mmụta nọ, ma kpugheere ha ụmụntakịrị.

Ee Nna, otu a ka o si masị uche gị dị nsọ. Nna m enyefeela m ihe niile na-aka. Ọ dịghịkwa onye ọ bụla maara onye Nwa ahụ bụ ma ọ bụghị Nna, ma ọ bụ onye Nna ahụ bụ ma ọ bụghị Nwa ahụ, na onye ọ bụla nke Nwa ahụ chọrọ ikpughere ya.

Jesu tụgharịrị gwa ndị na-eso ụzọ ya na nzuzo sị, “Ngọzi dịrị anya hụrụ ihe ụnụ hụrụ! Ana m agwa ụnụ na ọtụtụ ndị amụma na ndị eze mgbe ochie chọsiri ike ịhụ ihe ụnụ na-ahụ, ma ha ahụghị ha, na ịnụ ihe ụnụ na-anụ, ma ha anụghị ha.”

Igbo Mass Readings for December 4 2024, Wenezde Izu Mbụ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị

Igbo Mass Readings for December 3 2024, Tuzde Izuụka nke Mbụ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị

Igbo Mass Readings for December 3 2025, Tuzde Izuụka nke Mbu n'Oge Adventi
Igbo Mass Readings for December 3 2024, Tuzde Izuụka nke Mbu n’Oge Adventi

Last Update: February 11, 2021