Igbo Mass Readings for January 9 2024, Tuzde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge na-Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 9 2024, Tuzde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge na-Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:9-20
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwụ mbụ nke Samuel
Otu ụbọchị, mgbe Elkana na ezinụụlọ ya richara ihe oriri ha, ñụchakwaa ịhe ọñụñụ ha n’ụlọ Yahweh na Shịlo, Hana biliri jee n’ihu Yahweh. Mgbe ahụ Elaị onye ụkọchukwu nọ n’oche dị n’akụkụ ọnụụzọ Ụlọnsọ Chineke.
N’ihi oke uru nke obi ya, o jiri anya mmiri kpeere Yahweh ekpere, kwe ya nkwa sị: “Chineke nke igwe ndịagha! ọ bụrụ na ị hụ nsogbu nke ohu gị nwaanyị, ọ bụrụ na I cheta m, ghara ichezọ ohu gị nwaanyị wee nye m nwa nwoke, aga m edoro gị ya nsọ ụbọchị niile nke ndụ ya.
Agụba agaghịkwa aga ya n’isi. Oge ahụ Hana na-ekpe ogologo ekpere n’ihu Yahweh, Elaị nọ na-ele ka egbugbereonu ya si emegharị. Ma Hana na-ekpe ekpere n’obi ya.
Ọ bụ ezie na egbugbereonu ya na-emegharị emegharị, ma o nweghị onye nụrụ olu ya. Ya mere, Elaị chere na mmanya na-egbu ya. Elaị we sị ya, “kedụ mgbe mmanya ga-akwụsị igbu gị? Kwụsị ịñụ oke mmanya, anya doo gị.”
Hana zara ya sị, “mba, nnamukwu, añụghị m nkwụ ọbụla mọbụ mmanya na-aba n’anya. Abụ m nwaanyị nọ na nnukwu nsogbu. Ana m akọrọ Osebụrụwa obi m. Echela na ohu gị nwaanyị bụ onye iberibe. N’oge a niile, esi m n’ihe mgbu nke ala obi m ekpe ekpere.”
Elaị azaghachi ya, “Laa n’udo! Chineke nke Izrel nyekwa gị ihe ị rịọrọ ya!” Hana sị ya, “Biko, na-echeta ohu gị nwaanyị n’ekpere mgbe niile.”
Hana wee si n’ebe ahụ pụọ, rie ihe, ihu agbarụghịkwa ya ọzọ. Elkana na ezinụụlọ ya bilie n’isi ututu kpọọ isiala n’ihu Yahweh, we laghachi n’ụlọ ha na Rama.
Elkana na Hana nwunye ya nwere mmekọ, Yahweh wee nụ ekpere ya. O wee tụrụ ime mụọ nwa nwoke, kpọọ ya Samuel n’ihi na ọ sị, “Arịọtara m ya n’aka Chineke.”
ABỤỌMA NA AZỊZA – 1 Sam 2:1, 4-5, 6-7, 8
Azịza: Obi m na-añụrị ọñụ n’Osebụrụwa, Onye nzọpụta m.
1. Obi m na-añụrị ọñụ nke ukwu n’Osebụrụwa
N’ihina o meela ka ike m dị elu
Ugbu a ka m nwere ọnụ ịgwa ndịiro m okwu
N’ihina ana m añụrị na nzọpụta ya. Azịza
2. A nyajiela ụta ndị bụ dike
Ma e yiwele ndị adịghị ike ike, dịka ajị
Ndị na-eriju afọ na mbụ na-ejezi ọrụ ngo maka ihe oriri
Ma ndị agụụ na-eriju afọ ugbu a
Nwaanyịaga amụtala ụmụ asaa
Ebe nwaanyị ahụ mụjuru ụlọ gbazi aka nwa. Azịza.
3. Yahweh na-eweta ọnwụ, na-eweta ndụ
Ọ na-ezida ndị mmadụ n’ala mmụọ, na-akpọlitekwa ha
Yahweh na-eme ka ụfọdụ daa ogbenye, na-emekwa ka ụfọdụ bụrụ ọgaranya
Ụfọdụ ka ọ na-ebuda ala, ụfọdụ ka ọ na-ebulikwa elu. Azịza.
4. Ọ na-esi na ntụ ekuli ndị ogbenye
Ọ na-esi n’ebe a na-ekpofu ahịhịa welite ndị nọ na mkpa
Nye ha ọnọdụ n’etiti ụmụndieze
Iji nye ha ugwu na nsọpụrụ. Azịza
MBEKU
Alleluia, Alleluia:
Mee ka m ghọta ihe iso ụzọ gị pụtara, ka m wee nwee ike ịchịgharị ọrụ ịtụnaanya gị n’obi m.
Alleluia.
OZIỌMA – 1:21-28
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.
Mgbe Jesu na ndị na-eso ụzọ ya batara na Kapanaum, ọ banyere n’ụlọnzukọ ha ozigbo ahụ n’ụbọchị Sabat na-akụzi ihe.
Nkụzi ya tụrụ ha n’anya, n’ihina ọ kụziiri ha ihe dịka onye nwere ikikere, ọ bụghị dịka ndiodeakwụkwọ ha. Ozigbo ahụ, e nwere otu nwoke mmụọ ọjọọ ji n’ụlọnzukọ ahụ; onye nke tiri mkpu sị, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, Jesu onye Nazaret? Ị bịara ịla anyị n’iyi?
Ama m onye Ị bụ: Onye Nsọ nke Chineke”. Jesu gbọjara ya sị, “Mechie ọnụ, sikwa n’ime ya pụta”. Mmụọ ọjọọ ahụ mere ka ihe ọdụdọ dọọ ya, tikwaa mkpu n’olu ike, wee si n’ime ya pụta.
Ọrụ ebube ahụ juru mmadụ niile anya, nke mere ha jiri malite jụkọrịtaba onwe ha sị “Gịnị bụ nke a? Ọ bụ nkụzi ọhụrụ.
O ji ikikere na-enye ọ bụladị mmụọ ọjọọ iwu, ha wee na-erubere ya isi” Ngwangwa, akụkọ banyere ya wee gbasaa n’ebe niile, n’ala niile dị Galili gburugburu.
Igbo Mass Readings for January 10 2024, Wenezde Izuụka nke Mbụ n’oge na-adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for January 9 2024, Tuzde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge na-Adanyeghị n’Emume.