Igbo Mass Readings for January 7 2025, Tuezde na-eso Ụka Epifani
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka January 7 2025, Tuezde na-eso Ụka Epifani.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:7-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi mbụ nke Jọn
Ndị m hụrụ n’anya, ka anyị hụrịtanụ onwe anyị n’anya, n’ihina ịhụnaanya si na Chineke pụta. Onye ọbụla nwere ịhụnaanya bụ nwa nke Chukwu. Ọ makwaara Chukwu.
Onye na-enweghị ịhụnaanya amaghị Chukwu, n’ihina Chukwu bụ ịhụnaanya. Otu a ka ịhụnaanya Chineke si pụta ihè n’ebe anyị nọ, na o zitere naanị otu Nwa ya n’ụwa ka anyị nwee ndụ site na ya.
N’ụdị a ka ịhụnaanya dị: Ọ bụghị na anyị ahụla Chineke n’anya, kama, ọ hụrụ anyị n’anya ma zite Nwa ya, ka ọ bụrụ onye aga esi n’aka ya gbaghara njọ anyị.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 72:1-2,3-4,7-8.
Azịza: Onyenweanyị mba niile dị n’ụwa ga-esekpuru gị.
1. Nye eze ikpe nkwụmọtọ gị, O Chineke,
nyekwa nwa eze ezi omume gị,
Ka o were nwee ike ịchị ndị nke gị n’ụzọ ziri ezi,
nyekwa ndị ogbenye ikpe ziri ezi. Azịza
2. Ka ugwu ukwu na ugwu nta niile,
wetara ndị nke gị ozi udo,
N’ụzọ ziri ezi, ọ ga-azọpụta ụmụ ndị ogbenye,
zọọkwa ụmụ ndị nọ na mkpa. Azịza
3. N’oge ya eziomume ga-achawapụta,
udo ga-adịkwa ruo na njedebe ụwa,
alaeze ya ga-esi n’osimiri ruo n’osimiri,
bido na mmiri ruo n’isi ngwụcha nke ụwa. Azịza
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Nnukwu onye amụma ebilitela n’etiti anyị, Chineke abịala ileta ndị nke ya.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 6:34-44.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Ka Jesu rịdatara n’ụgbọ, ọ hụrụ ọtụtụ igwe mmadụ ka ha gbakọrọ. O nwere obi ebere n’ebe ha nọ n’ihina ha dịka atụrụ na-enweghị onye nche. O wee malite ikuziri ha ọtụtụ ihe.
Mgbe chi na eji, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị, “Ebe a bụ ọzara, chi na ejikwa ugbu a, zilaga ha ka ha gaa chọọrọ onwe ha ebe ha ga-azụta nri n’obodo ndị a dị anyị gburugburu.”
Ma Jesu zara ha sị, ‘Nyenụ ha ihe ha ga-eri. Ha wee jụọ ya sị, “Anyị ga-eje ịzụta ogbe achịcha nke narị dinarị abụọ iji nyejuo ha afọ? Ọ jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka ụnụ nwere? Gaanụ chọpụta.”
Mgbe ha chọpụtara, ha zara ya sị, “Ogbe achịcha ise, na azụ abụọ.” O wee nye iwu ka ha niile nọdụ ala n’òtù, n’otù, n’elu ahịhịa ndụ. Ha nọdụrụ ala n’igwe n’igwe, ụfọdụ dị narị mmadụ, ụfọdụ dị iri ise.
Ọ naara ogbe achịcha ise na azụ abụọ ahụ, lelie anya n’eluigwe, gọzie ha, nyawaa ogbe achịcha ndị ahụ, nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha keere ndị mmadụ.
O keere ha niile azụ abụọ ahụ. Ha niile rijukwara afọ. Ha tụtụjuru nkata iri na abụọ site n’iberibe achịcha na azụ fọrọ afọ. Ndị riri ogbe achịcha ise ahụ dị puku mmadụ ise.
Igbo Mass readings for January 8 2025, Wednezde na-eso Ụka Epifani.
Igbo Mass Readings for January 7 2025, Tuezde na-eso Ụka Epifani