Igbo Mass Readings for March 5 2024, Tuzde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka March 5 2024, Tuzde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:25, 34-43

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Daniel

Azarịa guzoro n’etiti ọkụ a wee bido ikpe ekpere. O! Ahapụkwala anyị ruo mgbe ebighịebi n’ihi aha gị, agbahapụkwala ọgbụgbandụ gị, ewepụkwala ihuọma gị n’ebe anyị nọ, n’ihi enyi gị nwoke Abraham nakwa n’ihi nwodibo gị Aịzik na onye dị nsọ gị Izrel.

Onye nke i kwere nkwa na ụmụ ya ga-adị ka kpakpando nke igwe, nakwa dịka mkpụrụ aja nọ n’akụkụ osimiri. Yahweh, lee, anyị bụzi obodo kacha dị nta n’ụwa niile.

Anyị bụzi ndị e ji eme ihe ọchị n’ụwa niile, n’ihi njọ anyị. Ugbu a, anyị.enweghịkwa onyendu, ma ọ bụ onye amụma, ma ọ bụ onye eze, anyị anaghịkwa achụnyere gị aja nsureọkụ ma ọ bụ aja isiụtọ;

O nweghịkwa ebe anyị nwere ịnọ nye gị ihe mbụ anyị wetara n’ubi anyị, iji nweta afọ-ọma gị. Mana ka ị nara obi dị umeala, na obi loghara elogha dịka aja nsureọkụ nke e ji ewu na ehi chụnyere gị, nakwa nke e ji puku kwuru puku atụrụ gbara abụba chụọ.

Meekwa ka aja anyị na-achụrụ gị dịrị otu a; ka anyị ji obi anyị niile na-efe gị; Ebe ọ bụ na ndị niile chekwubere na gị agaghị agba aka efu. Ugbu a, anyị etinyela obi anyị niile n’ife gị na n’ịtụrụ gị egwu na ịchọkwa ihu gị ọzọ.

Agbawakwala anyị aka. Emesikwala anyị ike n’ihi na ị dị nwayọọ dịkwa obi ebere; Nye anyị nzọpụta nke tosiri ọrụ ebube niile ị na-arụ. Mee ka anyị si n’aha gị nweta otito, ka ọgbaaghara dakwasa ndị niile na-emegbu ụmụodibo gị.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 25:4-5,6-7,8-9.

Azịza: Cheta ebere gị, O Onyenweanyị.

1. Mee ka m mata ụzọ gị, Onyenweanyị,

Kuziere m ụzọ gị,

Dube m n’ụzọ eziokwu gị, ma kuziere m,

N’ihina ọ bụ gị bụ Chineke onye nzọpụta m. Azịza

2. Cheta ebere gị, O Onyenweanyị,

chetakwa ịhụnaanya gị na-enweghị ube,

nke i gosịrị site na mgbe ochie.

Cheta m n’ịhụnaaya gị,

n’ihina ịdị mma, bụrụkwa onye eziomume. Azịza

3. Onyenweanyị dị mma, bụrụkwa onye eziomume,

Ọ na-akụziri ndị mmehie ụzọ;

Ọ na-eduzi ndị umeala n’ihe niile kwụ ọtọ;

Ọ na-akụziri ndị ogbenye ụzọ ya. Azịza

MBEKU – Matiu 4:17.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

“Chegharịanụ, n’ihi na alaeze eluigwe adịla nso.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

OZIỌMA – 18:21-35

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Pita bịakwutere Jesu, jụọ ya sị, “Onyenweanyị ugboro ole ka nwanne m ga-emejọ m, m gbaghara ya? Ọ bụ ugboro asaa?” Jesu azaa ya sị,”Agwaghị m gị na ọ bụghị sọsọ ugboro asaa, kama iri asaa ụzọ asaa.

Ya mere a ga-eji alaeze nke eluigwe tụnyere otu onyeeze chọrọ ka ya na ụmụodibo ya pịazie akụnụụba ya. Mgbe ọ malitere ntụle ya, a kpọtaara ya otu nwodibo nke ji ya puku talent iri.

Ma ebe nwodibo ahụ na-enweghị ike ịkwụghachi ụgwọ ahụ nna ya ukwu nyere iwu ka e ree ya na nwunye ya na ụmụ ya na ihe niile o nwere, ka e wee kwụghachi ụgwọ o ji.

Nke a mere odibo ahụ ji daa n’ala na-arịọ ya sị, ‘Nna m nukwu, biko nwee ndidi n’ebe m nọ, aga m akwụghachi gị ihe niile!” N’ihi obi ebere o nwere n’ebe nwodibo ya nọ, nna ya ukwu hapụrụ ya, kagbukwaa ụgwọ niile o ji.

Ma ka nwodibo ahụ n’onwe ya pụbara, ọ hụrụ otu nwodibo ibe ya nke ji ya otu narị dinarị, ọ tọdoro ya n’akpịrị sị ya, “Kwụghachi m ụgwọ I ji m. Nke a mere nwodibo ibe ya ahụ ji daa n’ala rịọ ya sị, “Nweere m ndidi, aga m akwụghachi gị ụgwọ gị.”

Ma o kweghị. Kama ọ gara tụba ya n’ụlọ mkpọrọ ruo mgbe ọ kwụghachiri ya ụgwọ o ji ya. Mgbe ndị odibo ibe ya hụrụ ihe merenụ, o wutere ha nke ukwuu.

Ha wee gaa kọọrọ nna ha ukwu ihe niile ndị a. N’ihi nke a nna ya ukwu kpọrọ nwodibo ahụ sị ya, “Odibo obi ọjọọ! Agbagharala m gị ụgwọ niile I ji m, n’ihi na ị rịọrọ m arịrịọ.

I cheghị na o kwesịrị ka i mere odibo ibe gị ebere dịka m siri mere gị? N’iwe, nna ya ukwu nyefere ya ndị nche ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ ka ha taa ya ahụhụ ruo mgbe ọ kwụchara ụgwọ niile o ji.

Otu a ka Nna m nke bi n’eluigwe ga-esi meso onye ọbụla n’ime ụnụ ma ọ bụrụ na ụnụ esighị n’ala obi ụnụ gbaghara ụmụnne ụnụ mmehie niile ha mehiere ụnụ.

Igbo Mass readings for March 6 2024, Wenezde n’ime Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.

Igbo Mass Readings for March 5 2024, Tuzde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.

Last Update: October 16, 2021