Igbo Mass Readings for December 30 2024, Ụbọchị nke Isii N’Izuụka Krismas
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka December 30 2024, Ụbọchị nke Isii N’Izuụka Krismas.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:12-17
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Jọn nke mbụ
Ụmụntakịrị, ana m edere ụnụ akwụkwọozi a, n’ihina a gbagharala ụnụ njọ ụnụ maka ihi Kristi. Ndị nna, ana m edere ụnụ akwụkwoọzi a, n’ihina ụnụ maara onye ahụ nke dịrị site na mbido.
Ụmụokorobịa, ana m edere ụnụ nke a, maka na ụnụ emeriela ajọ onye ahụ. Ụmụntakịrị ana m edekwara ụnụ, n’ihi na ụnụ maara Nna. Ndị nna, ana m edere ụnụ akwụkwọozi a, n’ihi na ụnụ maara onye nke dịrịị site na mbido.
Ụmụokorobịa, ana m edekwara ụnụ, maka na ụnụ dị ike. Okwu Chineke na-anoọgide n’ime ụnụ. Ụnụ emerikwaala ajọ onye ahụ. Ụnụ ahụla ụwa n’anya ma ọ bụ ihe dị ya n’ime.
Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ụwa n’anya ịhụnaanya nke Nna anọghị n’ime ya. N’ihina ihe niile dị n’ụwa dịka ọchịchọ nke anụ ahụ, nke anya na mpako nke ndụ, esighị n’aka Nna bịa, kama ha bụ nke ụwa.
Ụwa na ọchịchọ ọjọọ ya niile na-agafe-agafe, ma onye ahụ na-eme uche Chukwu ga-anọgide ebighịebi.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 96: 7-8, 8-9, 10.
Azịza: Ka eluigwe na ụwa kwebe ukwe añụrị.
1. Toonụ Onyenweanyị, ezinụụlọ niile dị n’ụwa,
toonụ ebube ya na ike ya.
Nye Onyenweanyị otito kwesịrị aha ya. Azịza
2. Wetaranụ ya onyinye n’ụlọnsọ ya.
Sekpuoronụ Onyenweanyị n’ebe ya dị nsọ,
ụwa niile maanụ jijiji n’ihu ya. Azịza
3. Kwusachaanụ n’ụwa niile na Onyenweanyị bụ eze,
ọ kwụwasiri ụwa ike, e nweghị ike ibugharị ya,
Ọ ga-eji ikpe nkwụmọtọ kpee mba niile ikpe. Azịza
MBEKU – Heb: 1:1-2.
ALLELUIA ALLELUIA:
N’oge ochie Chineke sitere n’ụzọ dị iche-iche gwa nna anyị ha okwu site n’ọnụ ndị amụma, n’ọgwụgwụ oge ndị a, ọ gwala anyị okwu site na nwa ya.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 2:36-40
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
O nwere otu onye amụma nwaanyị aha ya bụ Ana, nwa Fanuel, onye si n’agbụrụ Asha. O meela ezi agadị, onye ya na di ya biri naanị afọ asaa site n’agbọghọ ya tupu di ya anwụọ.
Ọ nọrọ ọnọdụ nwaanyị isimkpe ruo iri afọ asatọ na anọ. Ọ pụghị n’ụlọ nsọ Chineke, ebe o ji ibu ọnụ na ekpere na-efe Chineke, abalị na ehihie. Ọ pụtara n’oge ahụ, kelee Chineke, kwupụtakwa maka onye ahụ n’ihu ndị niile na-atụ anya maka nzọpụta nke Jerualem.
Mgbe ha mezuru ihe niile dịka iwu nke Dinwenụ si dị, ha laghachiri na Galili, ruo obodo nke ha bụ Nazret. Nwata ahụ toro, siekwa ike, jupụta n’amamihe, grasịa nke Chineke nọnyekwaara ya.
Igbo Mass Readings for December 31 2024, Ụbọchị nke Asaa N’Izuụka Krismas
Igbo Mass Readings for December 30 2024, Ụbọchị nke Isii N’Izuụka Krismas