Igbo Mass Readings for June 11 2023, Ụka Ahụ na Ọbara Kristi – Afọ nke Mbụ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 11 2023, Ụka Ahụ na Ọbara Kristi – Afọ nke Mbụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:2-3, 14-16
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Diuterọnọmi
Isi Okwu: O nyere ụnụ nri ahụ mana ụnụ na nna ụnụ na-amaghị ihe ọ bụ.
Mosis gwara ndị mmadụ ahụ sị: Chetakwanụ otu Onyenweanyị Chineke ụnụ si duo ụnụ n’ime ọzara iri afọ anọ ndị a niile. O wedara mmụọ ụnụ ala, nwaakwa ụnụ ọnwụnwa ịmata ihe dị ụnụ n’obi, ịchọpụta ma ụnụ ga-edebekwa iwu ya.
N’ihi ya, O wedatara mmụọ ụnụ ala mgbe O mere ka ihe oriri kọọ ụnụ, mgbe O mere ka ụnụ rie mana, nri ahụ ụnụ na nna ụnụ na-amaghị ihe ọ bụ. O mere nke a igosi ụnụ, na izi ụnụ, na ihe na-enye mmadụ ndụ abụghị naanị ihe oriri, kama na mmadụ na-adị ndụ site n’idebe iwu niile si n’ọnụ Onyenweanyị pụta.
Kpacharanụ anya hụ na nganga abanyeghị ụnụ n’obi, ime ka ụnụ chefuo Onyenweanyị Chineke ụnụ, onye mere ka ụnụ site n’ụlọ nke ịbụ ndị ohu n’Ijipt pụta.
Lezie anya ka ụnụ ghara ichefu Chineke, Onye duru ụnụ n’ime ọzara ukwu ahụ dị egwu, ebe agwọ ọjọọ na akpị jupụtara; ebe na-ekpo ọkụ, nke mmiri na-adịghị.
O sitere na nkume nye ụnụ mmiri ọñụñụ. O ji mana nyejuo ụnụ afọ n’ọzara, mana ahụ onye ọ bụla n’ime ụnụ na-amaghị ihe ọ bụ na mbụ. O mere ya n’ihi iweda mmụọ ụnụ ala, na ịnwa ụnụ, ka ntụkwasị obi ụnụ n’ime ya na-eto; ka o sikwa otu a meere ụnụ ihe ọma.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 147:12-15, 19-20. Az. 12.
Azịza: Jerusalem too Onyenweanyị.
Ma ọ bụ Aleluya
1. Jerusalem, doo Onyenweanyị ebube.
Zayọn, too Chineke Gị.
N’ihi na O meela ka ọnụ ụzọ ama Gị sie ike.
Ọ gọziela ụmụ gị nọ n’ime gị. Azịza.
2. O meela ka udo nọrọ n’okee ala gị.
O jiri ọka dị ukwuu kpojuo ọba ụnụ.
Ọ na-etiri ụwa iwu,
na-emekwa ka okwu Ya na-aga were were. Azịza.
3. Ọ gwala Jekọp okwu Ya,
bịakwa nye Izrel atụmatụ na usoro omenala Ya.
O nweghị obodo ọzọ O meere ụdị ihe a.
O meghị ka ndị ọzọ mara usoro omenala Ya, aleluya. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 10:16-17
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt
Isi Okwu: Anyị niile bụ akụkụ ahụ bụ Kristi, Onye bụ otu ogbe achịcha ahụ.
Iko nke ngọzi ahụ anyị na-agọzi n’Oriri Nsọ, ọ bụ na ọ bụghị inwekọ na ịñụkọ ọbara Kristi n’otu? Achịcha ahụ anyị na-anyawa n’Oriri Nsọ, ọ bụ na ọ bụghị inwekọ na irikọ ahụ Kristi n’otu?
Ọ bụ ezie na anyị dị ọtụtụ, ma ọ bụ otu ogbe achịcha ahụ ka anyị na-ata. Nke a na-egosi na anyị niile bụ akụkụ ahụ nke otu anụ ahụ bụ Kristi, onye bụ otu ogbe achịcha ahụ.
UKWE ỌMA: ZAYỌN TOO ONYE NZỌPỤTA GỊ
(1) Zayọn too Onye Nzọpụta gị,
Toonụ Onye eze na Onye nche atụrụ
Kweenụ ukwe, bụbanụ abụ.
(2) Toonụ Ya, too Ya, toosienụ Ya ike
Ọ karịrị otito ụnụ nwere ike inye
Otito ụnụ agaghị ezuru Ya.
(3) Otu ihe pụrụ iche anyị ji eto Ya
Bụ achịcha nke ndụ maka ndị dị ndụ
Nke O debeere anyị n’ụbọchị taa.
(4) N’oriri ikpeazụ ka O ji aka Ya
Nyefee oriri nsọ n’aka Ụmụazụ Ya,
Ka a ghara inwe ihe ịrụ ụka ọ bụla
(5) Werenụ mkpu ọñụ toosienụ Ya ike,
Werenụ añụrị doo Ya ebube,
Were obi ụtọ tie mkpu ọñụ.
(6) Taa bụụrụ anyị nnukwu emume,
Anyị na-echeta ụbọchị mbụ ahụ,
Mgbe O nyere anyị ihe omimi nke a.
(7) N’ihe omimi nke a, Eze agba ọhụrụ,
Jiri oriri nsọ hibe iwu ọhụrụ,
Nke melara aja agba ochie.
(8) Iwu ọhụrụ anọchiela anya iwu ochie,
Eziokwu achụọla onyinyo ọsọ,
Ihe achụsaala ọchịchịrị.
(9) Ihe ahụ Kristi mere na nri ikpeazụ
Ọ bụkwa ya ka anyị na-eme ugbu a,
A ga na-eme ya na ncheta nke Ya.
(10) N’usoro ntọala nsọ I kuziiri anyị,
Ka anyị ji achụnyere Gị aja nke a,
Achịcha na mmanya nke nzọpụta.
(11) Iwu ji onye otu Kristi ọ bụla,
Ikwere na achịcha bụ ahụ Kristi,
Na mmanya bụ ọbara Kristi.
(12) Uche apụghị ịghọta ya, anya apụghị ịhụ Ya,
Ma okwukwe gwara anyị na ọ bụ ezie,
Eziokwu nke si n’igwe.
(13) Ọ bụghị achịcha na mmanya ka a hụrụ,
Kama n’okpuru nke ọ bụla n’ime ha,
Akara dị egwu zoro n’ime ya.
(14) Kristi nọzuru oke na nke ọ bụla,
Ahụ Ya bụ ezigbo ihe oriri,
Ọ bara ya bụ ihe ọñụñụ.
(15) N’oriri, nke ọ bụla a natara,
Kristi zuru oke n’ibe ọ bụla,
N’ebughị ọrụ n’enweghị nkewa.
(16) Ihe onye natara, ka ibe ya natara,
Nnụ kwuru nnụ dị ka otu onye,
E richaa, ọ fọkwara.
(17) Ndị ọma natara ihe ndị ọjọọ natara,
Ma n’ọpụpụ ha, ọ bụghị otu ihe,
Ndị a natara ndụ, ndị ọzọ natara ọnwụ.
(18) Ụwa hụrụ ya ka otu oriri ahụ,
Ọpụpụ abụghịkwa otu ihe ma ọlị,
Ọnwụ jọrọ njọ, ma ndụ mara mma.
(19) A rụkwala ụka, chetakwa na
Mgbe a nyawara ogbe achịcha ọ bụla,
Kristi nọzuru n’ibe nke ọ bụla.
(20) E nweghị ihe ọ bụla na-ekewa Kristi;
A nyawaa achịcha, a nyawaghị Kristi,
O zuru oke n’ibe nke ọ bụla,
O nweghị ihe e bepụrụ na Kristi.
(21) Lee Achịcha Nke Ndị Mmụọma
E mere nri nke ndị nọ n’ije,
Ezigbo nri nke ụmụ Chukwu,
A tụpụkwarala ya nkịta.
(22) Ọ bụ ihe a ka e ziri n’akara
Mgbe e jiri Aịzik chụọ aja
Mgbe e gburu Nwatụrụ Ngabiga
N’achịcha igwe e nyere nna anyị ha.
(23) Jesu ezigbo nri na Onye nche atụrụ,
N’ebere Gị, zụọ anyị lekwaba anyị,
Mee ka anyị hụ ihe ọma Gị,
N’ala ndị dị ndụ.
(24) Ọ bụ sọ Gị ma ihe niile bara uru,
Nke e ji azụ anyị n’ụwa nke a.
Ka anyị rikọọ bụrụ otu n’igwe,
Wee keta oke ụmụ n’obodo nsọ.
MBEKU – Jọn. 6:51-52
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị kwuru sị: Abụ M achịcha dị ndụ nke si n’eluigwe gbadata. Onye ọ bụla riri achịcha nke a ga-adị ndụ ebighị ebi.
Aleluya!
OZIỌMA – 6:51-58
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Isi Okwu: Ahụ m bụ nri ezie, ọbara m bụkwa ihe ọñụñụ n’ezie.
Jesu gwara ndị Juu sị: “Mụ onwe M bụ achịcha ahụ dị ndụ nke si n’eluigwe rịdata. Onye ọ bụla riri achịcha nke a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Achịcha ahụ M ga-enye bụ ahụ M, ka ndị bi n’ụwa wee nwee ndụ”.
N’ihi okwu a, ndị Juu wee malite ịrụrịta ụka n’etiti onwe ha sị: “Olee otu onye a ga-esi enye anyị ahụ Ya ka anyị rie”? Jesu wee sị ha: “N’ịgwa ụnụ eziokwu, ọ bụrụ na ụnụ erighị ahụ Nwa nke Mmadụ, ọ bụrụkwa na ụnụ añụghị ọbara Ya, ụnụ agaghị enwe ndụ n’ime ụnụ.
Onye riri ahụ M, nụọkwa ọbara M, nwere ndụ ebighị ebi. Aga M ekulite Ya n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ. N’ihi na ahụ m bụ nri n’ezie, ọbara M bụkwa ihe ọñụñụ n’ezie. Onye ọ bụla riri ahụ M, ñụọkwa ọbara M, ga-ebi n’ime M, Mụ onwe M ebirikwa n’ime ya.
Otu Nna dị ndụ si zite M, M wee site na Nna na-ebi ndụ, otu ahụ ka onye riri M ga-esite na M na-ebi ndụ. Nke a bụ achịcha ahụ si n’eluigwe rịdata. Ọ bụghị ụdị achịcha ahụ nna ụnụ ha riri wee nwụsịa. Kama onye riri achịcha nke a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”
Igbo Mass Readings for June 12 2023, Mọnde Izuụka nke Iri N’Oge Nkịtị
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.