Igbo Mass Readings for June 4 2023, Ụka Atọ N’Otu Dị Ngọzi – Afọ nke Mbụ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 4 2023, Ụka Atọ N’Otu Dị Ngọzi – Afọ nke Mbụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 34:4-6,8-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ọpụpụ
Isi Okwu: Onyenweanyị, Onyenweanyị, Chineke Onye amara na Onye ebere!
N’ụzọ ụtụtụ, Mosis buuru mbadamba nkume abụọ rịgoro n’ugwu Saịnaị dịka Onyenweanyị nyere ya n’iwu. Mgbe Onyenweanyị rịdatara n’ụdị urukpu, O soro Mosis guzoro wee kwupụta na aha Ya bụ “Onyenweanyị”.
Onyenweanyị wee si otu a gafee ya n’ihu tie mkpu sị: Onyenweanyị, Onyenweanyị, Chineke Onye amara na Onye ebere! Onye na-anaghị ewe iwe ọkụ, ma Ọ bara ụba n’obi ọma na idebe nkwa O kwere”.
Mosis wee gbuoro Ya isi ala na ikpere ala. O wee sị: “Onyenweanyị,” ọ bụrụ na ihe m na-amasị Gị, bịa ka anyị na Gị soro. N’ezie, ha bụ ndị isi ike, na dị na-adịghị ekwe ekwe. Ma gbaghara ajọ omume na mmehie anyị Nabata anyị ka ndị nke Gị.”
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – Dan. 3:52-56 Az. 52
Azịza: Otito na ebube dịrị Gị ebighị ebi.
1. Onyenweanyị Chineke nna nna anyị ha, ngọzi dịrị Gị.
Otito na ebube dịrị Gị ebighị ebi.
Ngọzi dịrị aha nsọ Gị dị ebube.
Ebube na otito kacha elu dịrị Gị mgbe niile. Azịza.
2. Ngọzi dịrị Gị n’ụlọ nsọ nke ebube nsọ Gị.
Otito na ebube kacha elu dịrị Gị ebighị ebi. Azịza.
3. Ngọzi dịrị Gị n’oche eze nke alaeze Gị.
Otito na ebube kacha elu dịrị Gị ebighị ebi. Azịza.
4. Ngọzi dịrị Gị bụ Onye na-esi n’oche eze Gị nke dị n’elu ndị Mmụọma wee na-enyonye anya n’omimi nke ụwa.
Otito na ebube kacha elu dịrị Gị ebighị ebi. Azịza
5. Ngọzi dịrị Gị na mbara igwe.
Otito na ebube dịrị Gị ebighị ebị, Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 13:11-13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi nke Abụọ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt
Isi Okwu: Ka ngọzi nke Onyenweanyị Jesu Kristi, na ịhụnanya nke Chineke, na ịdịkọ n’otu nke Mmụọ Nsọ.
Ụmụnna m! Na nkwubi-okwu m, nọdụnụ mma! Gbaanụ mbọ ka ụnụ zuo oke n’ihe niile! Tinyenụ arịrịọ na ndụmọdụ m n’obi! Werenụ otu obi na-eme ihe.
Na-ebinụ n’udo! Chineke nke ịhụnanya na nke udo ga-anọnyekwara ụnụ. Na-enyerịtanụ ibe ụnụ ụdị ekele nke udo ahụ, e jiri mara nwanne na nwanne!
Ndị nsọ, ndị mụ na ha nọ, na-ekelekwa ụnụ. Ka ngọzi nke Onyenweanyị Jesu Kristi, na ịhụnanya nke Chineke, na ịdịkọ n’otu nke Mmụọ Nsọ na-enye, dịrị ụnụ niile.
MBEKU – Mkpughe 1:8
Aleluya, aleluya!
Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ! Chineke ahụ dị adị, Onye dị ugbu a, na Onye na-abịanụ.
Aleluya!
OZIỌMA – 3:16-18
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Isi Okwu: Chineke zitere Nwa ya ka ụwa site na ya nweta nzọpụta.
Jesu gwara Nikọdimọs sị: Chineke hụrụ ụwa n’anya nke na O nyere Sọ Otu Nwa ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya ghara ịla n’iyii, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.
N’ihi na Chineke eziteghị Nwa Ya n’ụwa ka Ọ ma ụwa ikpe, kama ka Ọ zọpụta ụwa. A gaghị ama onye kwere na Ya ikpe, ma a malarị onye na-ekweghị na Ya ikpe, n’ihi na o kweghị na Nwa ahụ Chineke mụrụ naanị Ya.
Igbo Mass Readings for June 5 2023, Mọnde Izuụka nke Itoolu N’Oge Nkịtị
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.