Connect with us

Igbo Mass Readings

Igbo Mass Readings for May 26 2024, Ụka Atọ N’Otu Dị Ngọzi

Published

on

Igbo Mass Readings for May 26 2024, Ụka Atọ N’Otu Dị Ngọzi – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 26 2024, Ụka Atọ N’Otu Dị Ngọzi – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:32-34, 39-40

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Diuterọnọmi

Isi Okwu: Onyenweanyị bụ Chineke ma n’eluigwe ma n’ụwa, o nweghị onye ọzọ.

Mosis gwara ndị mmadụ ahụ sị: “Jụọnụ ajụjụ ihe mere na mgbe ochie, tupu ụnụ apụta ụwa, kemgbe Chineke kere mmadụ n’elu ụwa. Sitenụ n’otu akụkụ igwe jụruo ajụjụ na nke ọzọ.

Advertisement

O nweela mgbe ihe ukwu dị ka nke a mere? A nụla ya na ntị mbụ? O nweela ndị nụrụ olu Chineke ka O si n’obi ọkụ na-ekwu okwu, otu a ụnụ si nụ Ya, bịakwa dịkwa ndụ ọzọ?

O nweela chi ọzọ ụnụ nụrụ na ọ nwara ma mee ka ndị ya site n’ala ebe ha bụ ndị ohu pụta dị ka Onyenweanyị Chineke ụnụ meere ụnụ n’ala Ijipt. N’ihi na ọ bụ ike ya dị ukwuu ka oji napụta ụnụ.

Ọ rụkwara ọtụtụ ọrụ ịrịba ama, na ọrụ ịtụnanya, buo agha, meekwa ọtụtụ ihe dị egwu n’ihu anya ụnụ. Ọ bụ ihe niile ndị a ka Onyenweanyị Chineke ụnụ meere ụnụ n’ala Ijipt.

Ụnụ jikwara anya ụnụ hụ ya. Ihe a ka ụnụ ga-eji mata na Onyenweanyị bụ Chineke nwe eluigwe na ụwa; na o nwekwaghị chi ọzọ dịnụ. Ụnụ ga-edeberịrị atụmatụ na iwu Ya niile ndị a m na-enye ụnụ taa; ka o wee dịrị ụnụ na ụmụ na-eso ụnụ n’azụ mma; ka ụnụ wee bie ogologo ndụ n’ala ahụ Onyenweanyị Chineke na-enye ụnụ ruo mgbe ebighị ebi.

Advertisement

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 32:4-6, 9, 18-20, 22, Az. 12

Azịza: Ngọzi dịrị ndị Onyenweanyị họọrọ ka ha bụrụ ndị nke Ya.

1. Okwu Onyenweanyị ziri ezi.

Ọrụ Ya niile kwesịrị ntụkwasa obi.

Ezi omume na ikpe nkwụmọtọ na-amasị Ya.

Advertisement

Obi ọma nke Onyenweanyị jupụtara ụwa n’ọnụ. Azịza.

2. E mere igwe sitena n’okwu ọnụ nke Onyenweanyị.

Iku ume si Ya n’ọnụ ka e jikwara mee kpakpando niile.

N’ihi na O kwuru okwu; ihe wee dị.

Advertisement

O tikwara iwu; Ihe wee kwụrụ. Azịza.

3. Lee, anya Onyenweanyị wụkwasara na ndị na-atụrụ Ya egwu;

ndị tụkwasara obi n’obi ọma ya.

Ka Ọ zọpụta ha n’ọnwụ,

Advertisement

bịakwa chekwaba ha n’ụkọ nri. Azịza.

4. Mkpụrụ obi anyị na-eche Onyenweanyị.

Ọ bụ enyemaka na ekpere anyị.

Biko Onyenweanyị, were obi ọma Gị kpugide anyị;

Advertisement

ebe ọ bụ na anyị tụkwasara obi anyị na Gị. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 8:14-17

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi nke Pọl dị asọ degaara ndị Rom

Isi Okwu: Ụnụ natara mmụọ nke ụmụ nke na-eme anyị na eti “Nna, Ezi Nna m!”

Ndị niile Mmụọ Chineke na-edu bụ ụmụ Chineke. N’ihi na Mmụọ nke ụnụ natara abụghị nke ịbụ ohu ma ọ bụ nke ịlaghachi n’egwu ọzọ. Kama ụnụ natara Mmụọ ịbụ ndị Chineke jiri mere ụmụ.

Advertisement

Otu Mmụọ ahụ na-enyekwa anyị ike itiku Chineke sị: “Nna, Ezi Nna m!” Mmụọ Nsọ ahụ n’onwe Ya sokwa mmụọ anyị na-agba akaebe na anyị bụ ụmụ Chineke.

Ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ Ya, anyị ga-eso Kristi eketa oke n’akụ na ụba dị n’alaeze Chineke. Ọ bụrụ na anyị na Kristi soro hụ ahụhụ, anyị ga-esokwa Ya keta oke n’otito Chineke ga-enye Ya.

MBEKU – Mkpughe 1:8

Aleluya, aleluya!

Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ. Chineke ahụ dị adị, Onye dị ugbu a, na Onye na-abịanụ.

Advertisement

Aleluya!

OZIỌMA – 28:16-20

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Mewenụ ndị mmadụ mmirichukwu n’aha Nna, na Nwa na Mmụọ Nsọ.

Ụmụazụ iri na otu ahụ wee bilie, gaa Galili, ruo ugwu ahụ Jesu sị ha jee. Mgbe ha hụrụ Ya, ha kpọọrọ Ya isi ala. Ma ụfọdụ nwere obi abụọ. Jesu wee bịakwute ha gwa ha okwu sị: “E werela ike niile dị n’eluigwe na nke dị n’ụwa nye M.

Advertisement

N’ihi ya, gaanụ mee mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ M. Na-emenụ ha mmirichukwu n’aha Nna, na Nwa, na Mmụọ Nsọ. Kuzierenụ ha ihe niile M nyere ụnụ n’iwu. Ma matakwanụ na anọnyere M ụnụ mgbe niile ruo ọgwụgwụ ụwa.”

Igbo Mass Readings for May 27 2024, Mọnde Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for May 26 2024, Ụka Atọ N’Otu Dị Ngọzi – Afọ nke Abụọ.

Advertisement

Catholic Lector is the founder of Catholiclectionary.com. I am a Theologian, a commissioned Lector, and Liturgy Minister. I lead the team that operates Catholiclectionary.com which is a Catholic Church-related website that provides you, on daily basis, with the following: (a) Catholic Daily Mass Readings (b) Reflections on the Daily Mass Readings (c) Daily Prayers (d) Catholic Hymns, and (e) Saints of the Day. I and my team work for the collective growth in spiritual lives of all the faithful.

Advertisement

Get Daily Mass Readings through Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.