Igbo Mass Readings for June 15 2025, Ụka Atọ N’Otu Dị Ngọzi – Afọ nke Atọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 15 2025, Ụka Atọ N’Otu Dị Ngọzi – Afọ nke Atọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:22-31

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ilu

Isi Okwu: Tupu e kee ụwa, Amamihe adịlarị.

Amamihe nke Chineke na-eti mkpu na-asị: Onyenweanyị kere M n’oge ebum n’uche Ya pụtara ihe, tupu O kee ihe ọ bụla ọzọ. Abụ M mbute ụzọ nke ọrụ ebube Ya site n’ọgbọ niile.

Site na mgbe ochie, n’isi mbido tupu e kee ụwa, apụtala M. A mụọla M tupu ogbu mmiri ọ bụla adị, mgbe a na-enwebeghị isi iyi ma ọ bụ mmiri ọgba n’elu, tupu ugwu ukwu ọ bụla apụta n’ụwa.

A mụọla M tupu ugwu nta ọ bụla apụta, mgbe a na-emebeghị ala na mbara ọhịa ọ bụla, tupu e nwee aja mmiri ọ bụla n’elu ụwa. Anọ M ya mgbe e kere mbara igwe; mgbe ahụ a kpara oke ahụ dị n’etiti mbara igwe na ogbu mmiri.

Mgbe ahụ O mere ka mbara igwe sie ike, bịakwa mee ka ntọala ụwa gbaa mgbọrọgwụ. Mgbe ahụ Ọ kpara oke, nke oke osimiri na-agaghị agafe, iji mee ka mmiri ghara inupụ isi n’iwu Ya.

Mgbe ahụ, anọ M Ya n’akụkụ dịka omenka. Ihe M na-amasị Ya kwa ụbọchị kwa ụbọchị. Oge niile a, ana M egwurị egwu n’ihi Ya, na-egwurịkwa egwu n’elu ụwa. Ihe ụmụ mmadụ na-eme na-amasị M.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 8:4-9. Az. 2

Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị, lee ka aha Gị si dị ebube n’ụwa niile.

1. Mgbe m lechara mbara igwe nke bụ ọrụ mkpịsị aka Gị rụrụ,

bịakwa hụ ọnwa na kpakpando ebe I nyere ha ọnọdụ.

Gịnị bụ mmadụ, nke na Ị na-echeta ya?

Gịnị bụ nwa mmadụ nke na Ị na-akpachapụrụ ya anya? Azịza.

2. I mere ya nke na ọ fọdụrụ nwa ntakịrị ka ọ ghọọ Mmụọma.

I ji ebube na nsọpụrụ kpube ya okpu eze.

I nyere ya ike ka ọ na-achị ihe niile I jiri aka Gị mee,

bịakwa were ihe niile tinye ya n’okpuru ụkwụ. Azịza

3. Ma atụrụ, ma ehi na anụ ọhịa niile.

Ma nnụnụ na-efe n’elu,

ma azụ nọ n’oke osimiri,

na ihe niile na-egwu mmiri

n’okporo ụzọ nke oke osimiri. Azịza

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:1-5

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ ozi Pọl dị asọ degaara ndị Rom

Isi Okwu: Chineke wụsara ịhụnanya n’obi anyị site n’aka Mmụọ Nsọ.

Ebe a gụrụla anyị na ndị ezi omume site n’okwukwe, anyị na Chineke dị n’udo site n’aka Onyenweanyị Jesu Kristi. Jesu akpọbatala anyị n’ime amara Chineke, site n’okwukwe.

Anyị na-erugharịkwa n’ime amara ahụ ugbu a. Anyị na-añụrị ọñụ, n’ihi na anyị nwere olile anya na anyị ga-eketa otito Chineke! Ma ọ bụghị naanị nke a: Anyị na-añụrịkwa ọñụ n’ime mkpagbu anyị niile.

N’ihi na anyị ma na mkpagbu na-arụpụta ndidi. Ndidi na-arụpụtakwa agwa ọma site na nnwale. Agwa ọma na-arụpụta olile anya. Olile anya ahụ adịghịkwa aghọ anyị ahịa. N’ihina Chineke wụsara ịhụnanya Ya n’ime obi anyị site n’aka Mmụọ Nsọ ahụ O nyere anyị.

MBEKU – Mkpughe 1:8

Aleluya, aleluya!

Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ. Chineke ahụ dị adị, Onye dị ugbu a, na Onye na-abịanụ.

Aleluya!

OZIỌMA – 16:12-15

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Isi Okwu: Ihe niile Nna nwere bụ nke m.

Jesu gwara ndị Ụmụazụ ya, sị: enwekwara M ọtụtụ ihe ọzọ M ga-agwa ụnụ. Ma ụnụ agaghị anabata ha ugbu a. Ma mgbe Mmụọ nke eziokwu ahụ bịara, Ọ ga-eduba ụnụ n’eziokwu niile.

Ọ gaghị ekwu naanị n’onwe Ya. Kama Ọ ga-ekwu ihe niile Ọ nụrụ, kọkwaara ụnụ ihe nke gaje ịbịa. Ọ ga-enyekwa M otito. N’ihi na Ọ ga-esite n’aka M nata ihe Ọ ga-akọrọ ụnụ. Ihe niile Nna m nwere bụ nke M. Nke a ka M ji sị na Mmụọ Nsọ ga-esite n’aka M nata ihe Ọ ga-akọrọ ụnụ.

Igbo Mass Readings for June 16 2025,

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for June 15 2025, Ụka Atọ N’Otu Dị Ngọzi – Afọ nke Atọ.

Last Update: April 7, 2023