Igbo Mass Readings for April 2 2023, Ụka Igu (Ọmụ) Nkwụ – Afọ nke Mbụ

Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 2 2023, Ụka Igu (Ọmụ) Nkwụ – Afọ nke Mbụ.

(N’ebe a ga-agọzi igu)

OZIỌMA – 21:1-11

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Ọ dị ngọzi bụ Onye bịara n’aha Onyenweanyị.

Mgbe ha bịaruru Jerusalem nso, ha batara na Betfage, si ya ruo Ugwu Olivu. N’ebe ahụ Jesu zipụrụ mmadụ abụọ na ndị Ụmụazụ wee sị ha: “Jeenụ n’obobo nta a dị na ncherịta ihu ụnụ.

Ngwa ngwa ụnụ ga-ahụ otu ịnyịnya ibu e libere n’osisi, nke ya na nwa ya nọ. Tọpụnụ ha, sekpụtara M ha. Ọ bụrụ na onye ọ bụla asị ụnụ ihe ọ bụla, gwanụ ya, sị: “Ha dị Onyenweanyị mkpa.

Ọ ga-ezitekwa ha ọsọ ọsọ.” E mere nke a ka e wee mezuo okwu nke onye amụma kwuru sị: “Gwanụ ada Zayọn. Lee, Eze gị na-abịakwute gị, ọ dị umeala, ọ na-anọkwasịkwa n’ịnyịnya ibu, na n’elu nwa ịnyịnya ibu, bụ nwa anụ nke na-ebu ibu.”

Ụmụazụ Ya wee gaa mee ihe Jesu gwara ha. Ha wee sekpụtara Ya nne ịnyịnya ibu ahụ na nwa ya wụkwasị uwe ha n’elu ịnyịnya na nwa ya. Jesu wee nọkwasị dị ka eze.

Oke igwe mmadụ ahụ wee tụsaa akwa mgbokwasị ha n’okporo ụzọ. Ndị ọzọ wee gbubite obodobo akwụkwọ na ngalaba osisi, tụsaa ha n’ụzọ. Ọtụtụ igwe mmadụ ndị na-aga n’ihu Jesu na ndị na-eso Ya n’azụ ji otu olu na-eti mkpu na-asị: “Hozana!

Zọpụta anyị ugbu a, Gị bụ Nwa Devid, Onye Chineke gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa n’aha Onyenweanyị! Hozana! N’ebe kachasị elu!” Mgbe Jesu batara na Jerusalem, mkpọtụ wee dị n’obodo ahụ niile. Ndị mmadụ wee na-ajụ sị: “Onye bụ nwoke a? Igwe mmadụ ahụ wee sị: “Ọ bụ Jesu, Onye amụma ahụ si na Nazaret nke Galili bịa.”

IHE ỌGỤGỤ NKE AJA MISA ỤKA IGU (N’ime Ụlo Ụka)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 50:4-7

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya

Isi Okwu: E kpuchighị m ihu m n’ebe ndị na-akparị m nọ; ama m nke ọma na ihere agaghị eme m.

Onyenweanyị enyela m ire nke nwa azụ; ka m mara otu m ga-esi na-aza ndị ike gwụrụ azịza. O nyela m onyinye nke okwu. Ọ na-emete m n’ụra kwa ụtụtụ ka m chee ntị nụrụ okwu dị ka nwa azụ.

Onyenweanyị emegheela ntị m. N’ebe mụ onwe m nọ, enweghị m ike ọ bụla nke m na-agbaketa azụ. Atọgbọọrọ m ndị na-eti m ihe azụ m; nye ndị na-adọ m aka n’ahụ-ọnụ agba m.

Ekpuchighị m ihu m n’ebe ndị na-akparị m, na-abụ m asọ n’ihu nọ. Onyenweanyị na-enyere m aka, nke mere na mkparị anaghị emetụta m. Akwụbara m ihu m dị ka okwute siri ike. Amaara m na ihere agaghị eme m.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 21:8-9, 17-20, 23-24 Az. 2

Azịza: Onyenwe m na Chineke m, Gịnị kpatara I jiri gbaketa m azụ?

1. Ndị niile hụrụ m na-achị m ọchị;

Ha na-emi m ọnụ, na-efeke isi, na-asi:

O chekwubere n’Onyenweanyị, Ya zọpụtanụ ya.

Ọ bụrụ na ọ bụ enyi ya, Ya bịa tọhapụ ya. Azịza

2. Ọtụtụ nkịta gbara m gburugburu.

Igwe ndị obi ọjọọ nọgidere m.

Ha kpọpuru aka m na ụkwụ m.

E nwere m ike ịgụta ọkpụkpụ m ọnụ. Azịza

3. Ha ekeela uwe m n’etiti onwe ha,

bịakwa were ya fee nza.

Onyenwe m, a gbahapụkwala m.

Onye ọgbụgba ume m, were ọsọ bịa nyere m aka. Azịza

4. Aga m akọrọ ụmụnne m akụkọ aha Gị,

nyekwa Gị otito n’ọgbakọ ha.

Ụnụ bụ ndị na-atụrụ Ya egwu,

nyenụ Onyenweanyị otito, ụmụ Jekọb niile,

tobenụ Ya; Ụmụ Izrel, nyenụ Ya nsọpụrụ. Azịza

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2:6-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl dị asọ degaara ndị Filipaị

Isi Okwu: O budara onwe Ya mana Chineke buliri Ya nnukwu elu.

Jesu n’onwe Ya, dịrịị n’ụdị Chineke site na mbụ, ma O wereghị ịha ka Chineke dị ka ihe Ọ ga-ekwedosi aka ike. Kama, O mere onwe Ya ka onye na-abụghị ihe ọ bụla: O werela ọnọdụ ohu; O mekwara ka a mụọ Ya n’oyiyi mmadụ.

A hụkwara Ya ka Ọ dị ka mmadụ n’oyiyi. O wedatakwara onwe Ya n’ala, wee rube isi ruo n’ọnwụ – bụ ọnwụ nke obe. N’ihi nke a, Chineke ebuliela Ya oke elu.

O jikwa amara nye ya aha ahụ nke kachasị aha niile elu. Ka o wee bụrụ na-akpọọ aha Jesu, ihe niile e kere eke ga-egbu ikpere n’ala, ma ihe niile dị n’elu igwe, ma ihe niile dị n’elu ụwa, ma ndị nke dị n’okpuru ụwa.

Ka ire niile kwupụtakwa na Jesu Kristi bụ Onyenweanyị, ka e wee nye Chineke Nna otito.

MBEKU – Ph. 2:8-9

Kristi wedara onwe Ya ala nke ukwuu; Ọ naara ọnwụ; ọnwụ nke elu obe. Ma Chineke buliri Ya nnukwu elu, were nye Ya aha kachasị aha niile.

AKỤKỌ AHỤHỤ NKE ONYENWEANYỊ JESU KRISTI DỊ KA MATIU SIRI DEE YA

Matiu – 26:14-27:66

Cheta: A gaghị ebu oriọna nke a na-ebu mgbaisi ọma; a gaghị ekele ndị mmadụ nke a na-adụ akara nke obe n’elu akwụkwọ ma ọ bụ n’elu onwe anyị.

K = KRISTI

Ọ = ỌKỌ AKỤKỌ

N =  NDỊ MMADỤ

Ọ: Mgbe ahụ, otu onye n’ime Ụmụazụ iri na abụọ onye a na-akpọ Judas Iskarịọt jekwuuru ndị isi nchụaja, wee sị ha:

N: Gịnị ka ụnụ ga-enye m ka m rara Ya nye ụnụ?

Ọ: Ha wee gụpụta iri mkpụrụ ọlaọcha atọ nye ya. Site n’oge ahụ, Judas malitere na-achọ ohere ọ ga-eji rara Jesu nye n’aka ha. N’ụbọchị mbụ nke Oriri Achịcha na-Ekoghị eko, Ụmụazụ Jesu bịakwutere Ya, jụọ Ya sị:

N: Olee ebe Ị chọrọ ka anyị doziere Gị, ka I wee rie Oriri Ngabiga?

Ọ: Jesu zara ha sị:

K: Jekwurunụ otu nwoke n’ime obodo sị ya, Onye nkuzi sị: “Oge ụla M dị nso. Mụ na Ụmụazụ M ga-eri Oriri Ngabiga n’ụlọ gị.

Ọ: Ụmụazụ Ya mere dị ka Jesu gwara ha. Ha wee dozie Oriri Ngabiga. Ma mgbe o ruru n’anyasị, Jesu na Ụmụazụ Ya iri na abụọ ahụ wee nọdụ n’oche nri. Mgbe ha nọ na-eri nri, Jesu sịrị ha:

K: Ana m agwa ụnụ eziokwu, otu onye n’ime ụnụ ga-arara M nye n’aka ndị ga-egbu m.

Ọ: Okwu a wutere ha nke ukwuu. Ha malitere ịjụ Ya n’otu n’otu sị:

N: Onyenweanyị, ọ bụ m?

Ọ: Ma Jesu zara ha, sị:

K: Ọ bụ onye ahụ mụ na ya na-erikọ nri n’otu efere ga-arara M nye. Nwa nke Mmadụ na-ala dị ka e dere ya n’Akwụkwọ Nsọ. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ, onye a ga-esite n’aka ya rara Nwa nke Mmadụ nye! Ọ gaara-akara nwoke ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.

Ọ: Judas, onye ahụ ga-arara Ya nye biliri ọtọ jụọ Ya, sị:

N: Onye Nkuzi ọ bụ m?

Ọ: Jesu zara sị ya

K: Ee, Ọ bụ gị!

Ọ: Mgbe ha nọ na-eri nri, Jesu weere ogbe achịcha, gọzie ya, nyanwaa ya, nye Ụmụazụ Ya, sị ha:

K: Naranụ M rie. Nke a bụ ahụ M.

Ọ: O wee narakwa iko mmanya, kelee Chineke, wee nye Ụmụazụ Ya, sị:

K: Ụnụ niile, naranụ M nke a, ñụọnụ ya. N’ihi na nke a bụ ọbara M, ọbara nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, nke a na-awụsị n’ihi ọtụtụ mmadụ, ka e wee gbaghara njọ. Ma asị M ụnụ, bido ugbu a wee gaba, agaghị M añụkwa mmanya sitere na mkpụrụ osisi vaịnị ọzọ, ruo ụbọchị ahụ Mụ na ụnụ ga-añụ ya ọhụrụ n’alaeze nke Nna M.

Ọ: Mgbe Jesu na Ụmụazụ Ya bụsịrị abụ otito, ha sitere n’ebe aụu pụọ, jee n’Ugwu Olivu. Mgbe ahụ Jesu gwara Ụmụazụ Ya, sị:

K: N’abalị taa, ụnụ niile ga-ahapụ M gbalaga. N’ihi na e deela ya n’Akwụkwọ Nsọ sị: “Aga m etigbu onye ọzụzụ atụrụ. Atụrụ ya niile ga-agbasasị. Ma mgbe e mere ka M si n’ọnwụ bilie, aga M eburu ụnụ ụzọ gaa Galili.” Ma Pita zara Ya sị:

N: Ọ bụrụ na ndị ọzọ ahapụ Gị gbalaa, agaghị m ahapụ Gị!

Ọ: Jesu wee sị ya:

K: N’ịgwa gị eziokwu, n’abalị taa, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa, ịga-agọnarị m ugboro atọ.

Ọ: Pita wee sị ya:

N: Ọ bụrụna ọ dị mkpa ka m soro Gị nwụọ, agaghị m agọnarị Gị.

Ọ: Otu a kwa ka Ụmụazụ ya ndị ọzọ si kwuo mgbe ahụ. Jesu na Ụmụazụ Ya wee bịaruo otu ogige a na-akpo Getsemane. O wee sị ha:

K: Nọdụnụ n’ebe a, ka M gaa n’ihu nke nta kpee ekpere.

Ọ: Ọ kpọọrọ Pita na ụmụ Zebedi abụọ. O wee malite inwe obi mwute n’ime onwe ya. Obi malitekwara ịlọ ya mmiri. Mgbe ahụ Ọ gwara ha sị:

K: Ọ na-ewute mkpụrụobi M nke ukwu ruo n’ọnwụ. Nọdụnụ n’ebe a; soronụ M na-eche nche.

Ọ: Ọ gara n’ihu nke nta daa n’ala, kpuo ihu ya n’ala kpee ekpere sị:

K: Nna M, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, napụ M iko a. Ma ọ bụghị uche M ka m chọrọ ka o mee, kama ka e mee ihe Ị na-achọ.

Ọ: Jesu wee laghachikwute Ụmụazụ Ya hụ ka ha na-arahụ ụra. O wee sị Pita:

K: Gịnị mere ụnụ enweghị ike isoro M chee nche otu elekere? Na-echenụ nche, na-ekpekwanụ ekpere, ka ụnụ ghara ịdaba n’ọnwụnwa. Mmụọ M kwere ekwe ezie mana anụ ahụ M adịghị ike!

Ọ: O wee hapụ ha, jeekwa ọzọ nke ugboro abụọ, na-ekpe ekpere sị:

K: Nna M, ọ bụrụ na iko a agaghị agabiga, ma ọ bụghị na M ñụrụ ya, ka e mee uche Gị.

Ọ: O wee bịakwa ọzọ, hụ Ụmụazụ Ya ka ha na-arahụ ụra. N’ihi na ụra jisiri ha ike, O wee hapụ ha ọzọ jee, kpee ekpere nke ugboro atọ, na-ekwukwa otu okwu ahụ, O wee kpesịa, laghachikwute Ụmụazụ Ya atọ ahụ sị ha:

K: Ụnụ nọrịrị na-arahụ ụra, na-ezukwa ike? Lee! Oge ọnwụ M dị nso! A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye n’aka ndị mmehie! Bilienụ, ka anyị si n’ebe a pụọ! Lee, onye na-arara M nye nọ nso!

Ọ: Mgbe Jesu ka kpụ okwu n’ọnụ, Judas, otu onye n’ime Ụmụazụ iri na abụọ ahụ, batara, ya na oke igwe mmadụ. Ụfọdụ ji mma agha ha, ndị ọzọ ji osisi. Ndị isi nchụaja na ndị okenye nke ndị Juu zitere ha. Ma Judas agwala ha rị na nzuzo sị:

N: Onye ọ bụla m ga-esutu ọnụ, Onye ahụ bụ Ya, jidenụ Ya.

Ọ: Ngwa ngwa Judas wee bịakwute Jesu, sị Ya:

N: Onye nkuzi, Udo dịrị Gị.

Ọ: Owee sutu Ya ọnụ. Ma Jesu sịrị ya:

K: Enyi M, mee ihe ị bịara ime!

Ọ: Mgbe ahụ, ha bịaruru nso, jide Jesu kwegidesie Ya aka ike. N’otu oge ahụ, otu onye n’ime ndị ha na Jesu nọ mịpụtara mma-agha ya, jiri ya bipụ ntị ohu onye isi nchụaja. Mgbe ahụ Jesu sịrị ya:

K: Mịghachi mma agha gị n’obo! N’ihi na ogbu mma agha ga-ala na mma agha. I chere na M enweghị ike ịrịọ Nna M maka enyemaka ka O zitere M igwe ndị mmụọ ozi ka ha bịa napụta M? Ma ọ bụrụ na Ya zie ha bịa zọpụta M, olee otu a ga-esi emezu ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ?

Ọ: N’oge ahụ, Jesu jụrụ igwe mmadụ ahụ bịaranụ ajụjụ sị:

K: Ụnụ pụtara chịrị mma agha na osisi bịa ijide M, dị ka a ga-asị na M bụ onye ohi? Kwa ụbọchị ka M na-anọdụ n’Ụlọ Nsọ ebe M na-ezi ihe, ma ụnụ ejideghị M. Ma ugbu a, ihe ndị a niile si otu a eme ka e wee mezuo ihe ndị amụma dere n’Akwụkwọ Nsọ.

Ọ: N’oge ihe ndị a niile na-eme, Ụmụazụ Ya hapụrụ Ya, gbalaga. Ma ndị ahụ jidere Jesu, siri ebe ahụ, kpụrụ Ya jee ụlọ Kaịfas, onye isi nchụaja, ebe ndị ode-akwụkwọ na ndị okenye zukọrọ. Ma Pita lara azụ, na-eso Jesu n’ebe dị anya, garuo n’obi onye isi nchụaja. Mgbe ọ batara n’ime obi, ọ nọnyeere ndị nche, ka o wee hụ otu ikpe ga-esi ebi. Ma ndị isi nchụaja na ndị nnọkọ ikpe ahụ niile gbara mbọ ka ha chọta ebubo ụgha ha ga-eji ma Ya ikpe ọnwụ. Ma ọ dịghị nke ha hụrụ, ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị ama ụgha bịara. N’ikpeazụ, ndị akaebe ụgha abụọ pụtara, kwuo sị:

N: Nwoke a kwuru sị: “Enwere m ike ịkwatu Ụlọ Nsọ ukwu Chineke, waghachikwa ya n’ụbọchị atọ.

Ọ: Onye isi nchụaja wee bilie ọtọ, jụọ Jesu, sị:

N: Ị zaghị ihe ọ bụla? Gịnị bụ ama ndị a na-agbagide Gị?

Ọ: Ma Jesu gbara nkịtị. Onye isi nchụaja wee sị Ya:

N: “Eji m aha Chineke dị ndụ nye Gị iwu, sị gị, gwa anyị, ị bụ Kristi ahụ, Nwa-Chineke?”

Ọ: Jesu wee sị ya:

K: Ee, abụ m ya! N’ezie asị m ụnụ, site ugbu a gaba, ụnụ ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka Ọ nọ n’aka nri Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, na-abịakwa n’elu igwe ojii niile nke eluigwe.

Ọ: Mgbe ahụ, Onye isi nchụaja wee dọwaa uwe ya, sị: O kwuluọla Chineke! O lee mkpa ọ dị ịchọkwa ndị akaebe? Ugbu a, ụnụ anụla nkwulu ahụ. Gịnị bụ uche ụnụ?

Ọ: Ha wee zaa, si:

N: Ikpe mara ya, O kwesịrị ịnwụ ọnwụ!

Ọ: Mgbe ahụ, ha malitere ịbụ ya ọnụ mmiri n’ihu, na iti ya oke ihe otiti. Ụfọdụ mara Ya ụra na ntị, were ya na-eme ihe ọchị, na-asị:

N: Buoro anyị amụma, Gị bụ Kristi Onye tiri Gị ihe?

Ọ: Mgbe ahụ, Pita nọdụrụ ala na mbara ezi nke obi ahụ. Otu nwagbọghọ na-eje ozi wee bịakwute ya, sị ya:

N: Ị bụkwanụ otu n’ime ndị na-eso ụzọ Jesu onye Galili.

Ọ: Ma Pita gọrọ n’ihu mmadụ niile nọ ebe ahụ, sị:

N: Amaghị m ihe ị na-ekwu.

Ọ: Mgbe Pita pụrụ jee nọdụ n’ụzọ-mbata, nwa agbọghọ ọzọ hụrụ ya, wee gwa ndị guzoro ebe ahụ, sị:

N: Nwoke a na Jesu onye Nazaret ahụ anọkọkwaala na mbụ!

Ọ: Ma Pita weere ịñụ iyi gọọkwa ọzọ, sị:

N: Amaghị m onye nwoke ahụ bụ.

Ọ: Mgbe nwa oge gasịrị, ndị guzoro ebe ahụ bịara ebe Pita nọ sị ya:

N: N’eziokwu, ị bụkwa otu onye n’ime ha. N’ihi na anyị esitela n’asụsụ ị na-asụ ghọta na-ịbụ onye Galili.

Ọ: Mgbe ahụ Pita malitere idu onwe ya ikwu na ịñụ iyi, na-asị:

N: Amaghi m nwoke ahụ.

Ọ: Ngwa ngwa, mgbe ahụ kwa oke ọkụkọ kwara akwa. Pita wee cheta ihe Jesu gwara ya, sị: “Tupu oke-ọkụkọ akwaa akwa ị ga-agọnarị M ugboro atọ. ” Pita wee pụọ, kwaa akwa ruru ya na mmụọ. Mgbe chi bọrọ, ndị isi nchụaja niile na ndị okenye ndị Juu gbagidere Jesu izu, otu ha ga-esi gbuo Ya. Ha wee kee Ya agbụ, duru Ya pụọ, rara Ya nye n’aka Paịlet, bụ Gọvanọ, onye nọchiri anya ọchịchị ndị Rom n’akụkụ Judia niile n’oge ahụ. Mgbe Judas, onye raara Jesu nye, nụrụ na a mara Ya ikpe ọnwụ, O chigharịrị weghachikwara ndị isi nchụaja na ndị okenye ego ọlaọcha iri atọ ahụ ha kwụrụ ya, wee sị ha:

N: Emehiela m site n’ịrara Onye ikpe na-amaghị nye, ka a gbafuo ọbara Ya!

Ọ: Ma ha sịrị ya:

N: “Nke a agbasaghị anyị. Ọ bụ ihe dịịrị gị.”

Ọ: Judas wee wụsa ego ọlaọcha ahụ niile n’ala n’Ụlọ Nsọ wee pụọ jee kwụgbuo onwe ya. Ma ndị isi nchụaja tụtụkọtara ego ahụ, sị:

N: Ego a bụ ego ọbara. O megidere iwu anyị itinye ya n’akpa ego Ụlọ Nsọ.

Ọ: Ya mere, ha wee kpebie, iji ego ahụ zụta ala ubi, onye ọkpụ-ite ka ọ bụrụ ala ili ndị ọbịa. N’ihi nke a, a na-akpọ ala ahụ “Ala Ọbara” ruo taa. Mgbe ahụ, ka e ji mezuo ihe Jeremaya, onye amụma, kwuru sị: “Ha tụtụkọtara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ bụ ọnụ ahịa ụmụ Izrel kpebiri na ha ga-akwụ n’isi onye ahụ. Ha ji ego ahụ zụọ ala onye ọkpụite, dị ka Onyenweanyị buru ụzọ gwa m.” Jesu wee guzoro n’ihu Paịlet, bụ Gọvanọ. Onye ọchịchị ahụ wee jụọ Ya sị:

N: Ị bụ eze ndị Juu?

Ọ: Jesu wee za ya, sị:

K: Ee, abụ m ya!

Ọ: Ma mgbe ndị isi nchụaja na ndị okenye na-ebo Ya ebubo, Jesu atụpụrụghị ha ọnụ. Paịlet wee sị Ya:

N: Ị na-anụkwa akaebe niile a ha na-agbagide Gị?

Ọ: Ma Jesu ekwughị otu mkpụrụ okwu. Ihe a wee ju Paịlet anya nke ukwuu. N’oge mmemme Ngabiga ọ bụla, ọ bụ omenala na onyeisi ọchịchị obodo na-ahapụrụ ndị Juu otu onye mkpọrọ ndị Juu chọrọ. N’oge ahụ, o nwere otu onye mkpọrọ ọha niile maara, a na-akpọ Barabas. Mgbe ha zukọrọ, Paịlet jụrụ sị:

N: Onye ka ụnụ chọrọ ka m hapụrụ ụnụ, Barabas ka ọ bụ Jesu, onye a na-akpọ Kristi?

Ọ: N’ihi na ọ matara na ha kpụtaara ya Jesu n’ihi anya ụfụ. Mgbe Paịlet nọ n’oche ikpe, nwunye ya zigara ya ozi, sị:

N: Wepụkwa aka gị n’isi nwoke ahụ na-emeghị ihe ọjọọ ọ bụla. N’ihi na ahụjuru m anya na nrọ n’abalị gara aga n’ihi ya.

Ọ: Ma ndị isi nchụaja na ndị okenye rụgidere igwe mmadụ ahụ niile ka ha rịọ Paịlet ka ọ hapụrụ ha Barabas, ma kpọgbuo Jesu. Paịlet jụrụ ha ọzọ, sị:

N: Onye ka ụnụ chọrọ ka m hapụrụ ụnụ?

Ọ: Ha wee zaa, sị:

N: Barabas!

Ọ: Paịlet wee jụọ ha sị:

N: Gịnị ka ụnụ chọrọ ka m jiri Jesu onye a na-akpọ Kristi mee?”

Ọ: Ha niile wee zaa, sị:

N: Kpọgide Ya n’obe!

Ọ: Ma Paịlet jụrụ ha, sị:

N: “Gịnị bụ ihe ọjọọ O mere?”

Ọ: Ma ha nọgidesiri ike na-eti mkpu n’oke olu na-asị:

N: Kpọgide Ya n’obe! Kpọgide ya n’obe!

Ọ: Mgbe Paịlet hụrụ na ajụjụ ya na-ajụ adịghịkwa uru ọ bara, O kpebiri imere ha ihe ga-eme ka ọgba aghara hapụ ịmalite n’etiti ha. O weere mmiri, kwọọ aka ya n’ihu igwe mmadụ ahụ, sị ha:

N: Aka m dị ọcha n’ebe ọbara nwoke a dị. Ihe ọ bụla ụnụ mere ya dị ụnụ n’isi.

Ọ: Mmadụ niile nọ ebe ahụ wee zaghachi ya n’otu olu sị:

N: “Ee! Ka ọbara ya dị n’isi anyị na n’isi ụmụ anyị!”

Ọ: Mgbe ahụ ka Paịlet ji hapụrụ ha Barabas. Ma o buru ụzọ pịa Jesu ụtalị, rara Ya nye, ka a kpọgide Ya n’obe. Mgbe ahụ, ndị agha nke Paịlet, bụ Gọvanọ, kpọọrọ Jesu, banye n’ebe ndị agha bi. Ndị isi agha wee mee ka otu ndị agha ha zukọọ n’ebe Jesu nọ. Ha wee yipụ Ya uwe, yikwasị ya uwe na-acha uhie uhie. Ha wee kpaa okpu eze nke e ji ogwu mee, kpube Ya n’isi. Ha tinyekwara ya osisi n’aka, ka ọ bụrụ mkpa n’aka eze ya. Ha malitere na-egburu Ya ikpere n’ala, werekwa Ya na-akpa ọchị na-asị:

N: Ekele, eze ndị Juu!

Ọ: Ha gbụrụ Ya ọnụ mmiri, narakwa ya osisi ahụ O ji n’aka tie Ya n’isi. Mgbe ha mechara Ya ihe ọchị, ha yipụrụ Ya uwe uhie uhie ahụ ha yibere Ya, wee yikwasịkwa Ya uwe nke aka ya. Ha wee duru Ya pụọ, ịkpọgide Ya n’obe. Mgbe ndị agha ahụ du Jesu pụtara n’ụzọ, ha wee zute otu onye Sirini a na-akpọ Saịmọn. Ha wee manye ya ka o bute obe Jesu. Mgbe ha rutere ebe a na-akpọ Gọlgọta, nke bụ ma a sụgharịa ya, “Ebe Okpokoro isi,” ha nyere Jesu mmanya a gwara ọgwụ ka ọ ñụọ. Ma mgbe O detụrụ ya ọnụ, O kweghị Ya ọñụñụ. Mgbe ha kpọgidesịrị Jesu n’obe, ha fere nza n’etiti onwe ha, wee kesaa uwe Ya. N’elu obe ahụ ha dekwasịrị ebubo ha boro ya, sị: ONYE A BỤ JESU, EZE NDỊ JUU.” Mgbe ahụ, a kpọgidere Ya na ndị ohi abụọ n’obe, otu n’aka nri Ya, otu n’aka ekpe Ya. Ndị na-agafe n’ụzọ na-ekwulu Jesu, na-ekwe n’isi, na-asị:

N: Leenụ onye were ike ịkwatu Ụlọ Nsọ ukwu Chineke wughachikwa ya na mkpụrụ ụbọchị atọ! Zọpụtanụ onwe Gị! Ọ bụrụ na Ị bụ Nwa Chineke, si n’elu obe rịdata.

Ọ: Otu aka ahụ ndị isi nchụaja na ndị ode-akwụkwọ, na ndị okenye jikwara Ya mee ihe ọchị, sị:

N: Ọ zọpụtara ndị ọzọ ma, ike adịghị Ya ịzọpụta onwe Ya! Ọ bụ eze ndị Izrel! Ya si n’elu obe rịdata ugbu a ka anyị kwere na Ya! Ọ tụkwasịrị Chineke obi, na-ekwu na Ya bụ Nwa Chineke, Ya mee, ka Chineke bịa zọpụta Ya ugbu a, ma ọ bụrụ na Chineke chọrọ ọdịmma Ya.

Ọ: Otu aka ahụ ka ndị ohi ndị a kpọgidere Ya na ha n’obe si akparị Ya. Ma site n’elekere iri na abụọ nke ehihie ruo n’elekere atọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachiri obodo ahụ niile. N’oge dịka elekere anọ nke ehihie, Jesu tiri mkpu n’oke olu, sị:

K: “Elaị, Elaị lama sabaktanị”! nke bụ, ma a sụgharịa ya, Chineke m, Chineke m, gịnị mere I ji hapụ naanị M n’ebe a?”

Ọ: Mgbe ụfọdụ mmadụ n’ime ndị guzoro nso nụrụ mkpu a, ha sịrị:

N: Nwoke a na-akpọ Ịlaịja.

Ọ: Ngwa ngwa, otu onye n’ime ha gbaara ọsọ, were ọza detụ ya na mmanya gbara ụka, fanye ya n’osisi, welie ya elu, ime ka Jesu miri ya ñụọ. Ma ndị ọzọ sịrị:

N: Cherenụ ka anyị lee ma Ilaịja ọ ga-abịa ịzọpụta Ya.

Ọ: Ma Jesu jiri oke olu tie mkpu ọzọ, wee kubie ume, nwụọ.

(Onye ọ bụla ga-esekpuru ala nwa ntakịrị oge kpee ekpere n’ime obi)

N’otu ntabi anya ahụ kwa, akwa mgbochi nke dị n’Ụlọ Nsọ ukwu Chineke gbawara ibe abụọ, site n’elu ruo n’ala. Ala mara jijiji. Oke nkume wee gbawasịa. Ọtụtụ ili meghere. E mere ka ọtụtụ ndị nsọ, ndị dara n’ụra ọnwụ bilie. Mgbe Jesu bilitesịrị n’ọnwụ, ndị ahụ sitere n’ọnwụ bilie hapụrụ ili ha bata Jerusalem, wee gosi ọtụtụ mmadụ onwe ha. Mgbe Ọchịagha na ndị ya na ha na-eche Jesu nche hụrụ ala ọma-jijiji na ihe niile merenụ, oke egwu tụrụ ha. Ha wee kwuo sị:

N: “N’eziokwu, Onye a bụ Nwa Chineke.”

Ọ: Ọtụtụ ụmụ nwanyị nọkwa n’ebe ahụ, guzo n’ebe dị anya na-ele ihe na-aga. Ụmụ nwanyị ndị a si Galili soro Jesu, na-enyere ya aka. Ụfọdụ n’ime ha bụ Meri Magdalin, Meri nne Jemis na Josef, na nne Jemis na Jọn bụ ụmụ Zebedi. Mgbe o ruru anyasị, otu onye ọgaranya, aha ya bụ Josef, siri n’obodo Arịmatịa bịa. Nwoke a bụkwa onye na-eso ụzọ Jesu. O jekwuuru Paịlet, rịọ ya ka e bunye ya ozu Jesu. Paịlet wee nye ike ka e bunye Josef ozu Jesu. Josef wee buru ozu Jesu, were ezi akwa ọcha, na-enwu enwu kee ya, wee dọnye Ya n’ili ọhụrụ nke o gwuuru onwe ya na nkume. O jikwa otu nkume buru ibu kwachie ọnụ ụzọ ili ahụ, hapụ ya laa. Ma Meri Magdalin na Meri nke ọzọ nọdụrụ ala na ncherịta ihu nke ili ahụ. Ma n’echi ya, bụ ụbọchị izuike, nke na-eso ụbọchị Nkwadebe nke ndị Juu, ndị isi nchụaja na ndị Farisii zukọrọ, jekwuru Paịlet sị ya:

N: “Nna anyị ukwu, anyị chetara na onye ụgha ahụ kwuru mgbe Ọ dị ndụ sị: “Mgbe ụbọchị atọ gasịrị aga M esi n’ọnwụ bilie.” Nye iwu ka e chegidesịa ili ahụ ike ruo ụbọchị nke atọ, ka ndị na-eso ụzọ Ya ghara ịbịa zuru Ya, laa, gwa ndị mmadụ sị: “O sila n’ọnwụ bilie.” Mgbe ahụ, ụgha nke ikpeazụ adị njọ karịa nke mbụ.

Ọ: Paịlet wee sị ha:

N: “Ụnụ nwere otu ndị agha ndị na-eche nche. Gaanụ kpọrọ ha! Chegidenụ ili ahụ otu ụnụ nwere ike.

Ọ: Ha wee mechisie ili ahụ ike, were nkume mechie ọnụ ya, wee debe otu ndị nche ebe ahụ.

Igbo Mass readings for April 3 2023,

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for April 2 2023, Ụka Igu (Ọmụ) Nkwụ – Afọ nke Mbụ.

Last Update: March 30, 2023