Igbo Mass Readings for May 19 2024, Ụka Ndakwasa nke Mmụọ Nsọ – Pentikọst.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 19 2024, Ụka Ndakwasa nke Mmụọ Nsọ – Pentikọst.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi
Isi Okwu: Ha niile wee jupụta na Mmụọ Nsọ, wee malite ikwu okwu.
Mgbe ụbọchị Pentikọst ruru, Ụmụazụ Jesu zukọrọ n’otu ụlọ. Na mberede, oke ụzụ, dịka nke oke ifufe na-efesi ike wee si n’eluigwe, jupụta ụlọ ahụ niile ebe ha nọ.
Ha wee hụ ihe dị ka ọtụtụ ire ọkụ ka ha na-ekesa onwe ha, nọkwasị n’isi onye ọ bụla n’ime ha. Ha niile wee jupụta na Mmụọ Nsọ, wee malite ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche, dịka Mmụọ Nsọ ahụ si nye ha ike ikwuwa okwu.
Na mgbe ahụ, ọtụtụ ndị Juu, ndị na-atụ egwu Chineke, bi na Jerusalem; ndị si na mba niile dị n’okpuru anyanwụ bịa. Mgbe ha nụrụ ụzụ a, oke igwe mmadụ wee gbakọọ.
Ihe a wee gbaa ha gharịị, n’ihi na onye ọ bụla n’ime ha na-anụ ka ndị ozi Jesu na-ekwu okwu n’asụsụ nke ala ya. Ibobo wee nwụọ ha niile n’ahụ. O jukwara ha anya, nke mere ka ha jụọ sị: “Ị nụkwanụ!
Ọ bụkwa ndị a na-ekwu okwu bụ ndị Galili? Olee otu anyị niile n’otu n’otu si anụ ihe ha na-ekwu n’asụsụ ala a mụrụ anyị? Anyị si mba dị iche iche bịa: E nwere ndị Patia na ndị Media na ndị Elam, na ndị si Mesopotamịa, Judia na Kapadosia, na ndị si n’ime Pọntọs na Esia; e nwekwara ndị si na Frijia na Pamfilia, ndị si ljipt n’akụkụ Libia nke dị Sirinị nso, na ndị ọbịa si na Rom bịa.
Ma ndị Juu ma ndị mba ọzọ, ndị a kpọbatara n’okpukpe nke ndị Juu; ndị Krit na ndị Arebịa. Anyị niile na-anụ ka ha na-ekwu n’asụsụ anyị dị iche iche, okwu banyere oke ọrụ niile nke Chineke.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 103: 1, 24, 29-30, 34 Az. 30
Azịza: Onyenweanyị, zidata Mmụọ Gị. Mee ka ihu ụwa dị ọhụrụ.
Ma ọ bụ Aleluya
1. Mkpụrụ obi m, too Onyenweanyị.
Onyenwe m na Chineke m, n’ezie I nweghị atụ!
Ị bara ụba n’ọrụ aka dị iche iche.
Ọ bụ Gị kere ihe jupụtara n’ụwa niile. Azịza.
2. Ọ bụrụ na Ị napụ ha ume ndụ,
ha alaa n’iyii, bịakwa laghachie ghọọ ntụ.
Ọ bụrụ na I zidatara ha Mmụọ Gị, ha ghọọ ihe e ekere eke.
I wee mee ka ihu ụwa dị ọhụrụ. Azịza
3. Ka ebube nke Onyenweanyị dịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Ka Onyenweanyị ñụrịa ọñụ n’ọrụ aka Ya.
Ka ihe m bụrụ n’abụ dị Ya mma n’obi.
Aga m añụrị ọñụ n’Onyenweanyị. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 12:3-7, 12-13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mbụ nke Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt
Isi Okwu: E meela anyị niile mmirichukwu n’ime otu Mmụọ Nsọ ahụ.
Ma ugbu a, achọrọ m ka ụnụ ghọta nke ọma na ọ dịghị onye ọ bụla na-ekwu okwu site n’odudu Mmụọ nke Chineke, na-asị: “Jesu bụ onye a bụrụ ọnụ.”
Ọ dịghịkwa onye ọ bụla pụrụ ikwupụta na, “Jesu bụ Onyenweanyị” ma ọ bụghị site na nduzi nke Mmụọ Nsọ. Onyinye amara dị iche iche dị, ma otu Mmụọ Nsọ ahụ na-enye ha niile.
Oke ije-ozi dị iche iche dịkwa, ma otu Onyenweanyị ahụ ka a na-ejere ozi. Ụdị ike dị iche iche nke e ji arụ ọrụ dịkwa, ma otu Chineke ahụ na-etinye ike ndị a n’ime onye ọ bụla iji jee ozi.
Ọ na-enyekwa onye ọ bụla amara igosi ike nke Mmụọ Nsọ maka ọdịmma mmadụ niile. N’ihi na dịka ahụ mmadụ si bụrụ otu, ma bịakwa nwee ọtụtụ akụkụ ahụ, otu a ka Kristi dịkwa.
Ma ọ bụ ezie na akụkụ ahụ mmadụ dị ọtụtụ, ma ha niile jikọrọ ọnụ bụrụ otu ahụ. Ebe ọ bụ na e meela anyị niile mmirichukwu n’ime otu Mmụọ Nsọ ahụ, anyị abanyela n’otu ahụ nke Kristi ahụ, ma anyị bụ ndị Juu ma ọ bụ ndị Grik, ma anyị bụ ndị ohu, ma ọ bụ ndị nweere onwe ha. E mekwaala ka anyị niile ñụọ ọbara Ya n’ime njikọ nke otu Mmụọ Nsọ ahụ.
UKWE ỌMA
1. Bịa Mmụọ Nsọ n’obi anyị
Si n’eluigwe zidata
Ihe Gị nke dị ebube;
2. Bịa Nna nke ụmụ ogbenye;
Bịa Aka na-enye onyinye;
Mụkesia n’ime obi anyị;
3. Onye Ntasi Obi kacha mma;
Bịa leta obi ndị nke Gị;
Ị dị ụtọ, achọrọ m Gị.
4. Ezumike ndị nọ na ndọlị;
Ntụ-oyi n’oge ekpomọkụ;
Ntasi obi n’oge nsogbu.
5. Zite ihe Gị kacha nsọ,
Ka o jupụta n’ime obi,
Ndị niile kwere na Gị
6. E wepụ Gị o nweghị ihe
Mmadụ nkịtị pụrụ ime,
Mma adịghịkwa na mmadụ.
7. Sachapụ ihe rụrụ arụ,
Wụọ mmiri n’ebe kpọrọ nkụ,
Gwọọ anyị ọrịa na ọnya.
8. Gọzie ekwu nke kpọrọ nkụ.
Ka ihe oyi na-atụ nyara ọkụ.
Duzie ụkwụ gahiere ụzọ.
9. Nye ndị kwerenụ onyinye.
Were onyinye asaa nke Gị,
Nye ndị tụkwasara Gị obi.
10. Were nzọpụta kwụọ ha ụgwọ,
Ụgwọ nke ibi ezigbo ndụ,
Nye ha añụrị ebighị ebi.
Amen.
MBEKU
Aleluya, aleluya!
Bịa Mmụọ Nsọ nọjuo n’obi ndị kwerenụ. Mụnye n’ime ha ọkụ nke ịhụnanya Gị.
Aleluya!
OZIỌMA – 20:19-23
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Isi Okwu: Otu Nna m si zite m otu ahụ ka m si eziga ụnụ. Naranụ Mmụọ Nsọ.
Na mgbede nke ụbọchị Ụka ahụ, bụ ụbọchị mbụ n’izu, Ụmụazụ Jesu zukọrọ, kpọchie ụzọ n’ihi egwu ndị Juu. Mgbe ahụ, Jesu bịara, guzo n’etiti ha, sị ha: “Udo dịrị ụnụ!”
Mgbe O kwusịrị nke a, O gosiri ha aka Ya na akụkụ Ya. Ya mere, Ụmụazụ Ya ñụrịrị ọñụ mgbe ha hụrụ Onyenweanyị. Jesu wee sịkwa ha ọzọ: “Udo dịrị ụnụ! Otu Nna M si zite M, otu ahụ kwa ka M si eziga ụnụ”.
Mgbe O kwusịrị nke a, O kusara ha ume, sị ha: “Naranụ Mmụọ Nsọ. Ọ bụrụ na ụnụ agbaghara onye ọ bụla mmehie ya, a gbagharala onye ahụ. Ọ bụrụkwa na ụnụ ajụ ịgbaghara onye ahụ mmehie ya, a gaghị agbaghara onye ahụ.”
Igbo Mass Readings for May 20 2024, Mọnde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for May 19 2024, Ụka Ndakwasa nke Mmụọ Nsọ – Pentikọst.