Igbo Mass Readings for April 16 2023, Ụka Nke Abụọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Mbụ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 16 2023, Ụka Nke Abụọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Mbụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:42-47
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi
Isi Okwu: Ndị niile kwerenụ bikọtara ọnụ, nwekọtakwa ihe niile ọnụ.
Ndị kwere na Kristi nọgidesiri ike n’ekpere, na n’ịmụ ihe ozizi nke ndị ozi. Ha na-ebikwa ndụ mmekọrịta na nke ịnyawa achịcha n’otu, na nke inwekọ ihe.
Chineke gosikwara ọtụtụ ọrụ ebube na ihe ịrịba-ama dị iche iche, site n’aka ndị ozi. Nke a mere ka egwu bịa onye ọ bụla. Ndị niile kwere na Kristi bikọkwara ọnụ, nwekọkwaa ihe n’otu.
Ha na-erekọta n’otu ihe niile ha nwere na nke ha natara, wee kesaa ego, nye ụmụnna n’otu n’otu, dịka mkpa onye ọ bụla si dị. Ha jikwa otu obi na-anọgidesi ike n’Ụlọ Nsọ Chineke kwa ụbọchị.
Ha na-erikọkwa nri ọnụ n’ụlọ, n’obi ụtọ, onye rie, ya enyetụ ibe ya. Ha na-etokwa Chineke. Ihe ha na-eme, na-atọkwa ndị Juu ụtọ. Onyenweanyị na-atụkwasịrị ha kwa ụbọchị ndị niile a na-azọpụta.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 117:2-4, 13-15.22-24. Az. 1
Azịza: Nyenụ Onyenweanyị ekele n’ihi na Ọ dị mma. N’ihi na ịhụnanya Ya enweghị ngwụcha.
Ma ọ bụ Aleluya.
1. Ka ụmụ Izrel kwuo sị: “Ịhụnanya Ya enweghị ngwụcha.”
Ka ụmụ Erọn kwuo sị: “Ịhụnanya Ya enweghị ngwụcha”.
Ka ndị niile na-atụrụ Onyenweanyị egwu kwuo sị:
“Ịhụnanya Ya enweghị ngwụcha”. Azịza.
2. A kpagidesiri m ike ka m daa,
ma Onyenweanyị nyeere m aka gbapụta m.
Onyenweanyị bụ ike m na ukwe m,
Ọ bụ Onye nzọpụta m.
Ụda mkpu ọñụ na mmeri dị n’ebe obibi nke ndị ezi omume. Azịza.
3. Nkume nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ aghọọla ide ji ụlọ.
Ihe a bụ ọrụ ebube nke Onyenweanyị,
ma ọ bụkwa ihe ịtụnanya n’ebe anyị nọ.
Taa bụ ụbọchị ahụ Onyenweanyị mere.
Ka anyị ñụrịanụ ọnụ bịakwa nwee obi añụrị. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:3-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pita dị asọ dere
Isi Okwu: Na nnukwu ebere Ya, O sitela n’ikulite Jesu n’ọnwụ mụgharịa anyị ọzọ.
Ekele dịrị Chineke, na Nna Onyenweanyị Jesu Kristi! N’ihi oke ebere Ya, O nyere anyị ndụ ọhụrụ, ka anyị wee nwee olile anya, site na mbilite n’ọnwụ nke Jesu Kristi.
N’ihi nke a, anyị na-atụ anya na anyị ga-anata ngọzi nke Chineke debeere ndị nke Ya. Chineke debere ụnụ ngọzi nke a n’eluigwe. Ọ bụkwa ngọzi ahụ nke a na-apụghị imebi emebi, ma ọbụ imerụ emerụ, nke na-adịghị agbanwo agbanwo n’ọdịdị ya ma ọ bụkwanụ ree ure.
Ha ga-abụ nke ụnụ, bụ ndị e ji ike nke Chineke chebe site n’okwukwe, ka ha wee ruo nzọpụta ahụ a ga-ekpughe n’oge ikpeazụ. Ñụrịanụ ọñụ n’ihi nke a.
Ọ bụ ezie na ọ dị mkpa ugbu a ka ụnụ nwee mwute nwa oge n’ihi ahụhụ dị iche iche nke ụnụ na-ahụ. Ma ihe mere e ji ata ụnụ ahụhụ ndị a bụ ka e wee mara ma okwukwe ụnụ nwere osikwara ike.
A na-anwa okwukwe ụnụ dị ka a ga-asị na ọ bụ ọlaedo e ji ọkụ na-anwapụta. Ọ bụ ezie na ọlaedo bụ ihe pụrụ imebi emebi, ma a ga-eji ọkụ nwaa ya, ịmata nke bụ ezi ọlaedo, na nke na-abụghị ya.
Ya mere, a ghaghị iji ahụhụ nwapụta okwukwe ụnụ, nke bụ ihe oke ọnụ ahịa karịa ọlaedo, iji hụ ma ọ ga-eguzosikwa ike. Mgbe ahụ ka ụnụ ga-anata otito, na ebube, na nsọpụrụ n’ụbọchị ahụ Jesu ga-alọghachi.
Ụnụ hụrụ Ya n’anya, ọ bụ ezie na ụnụ ahụbeghị Ya anya. Ụnụ kwekwara na Ya, ọ bụ ezie na ụnụ adịghị ahụ Ya anya ugbu a. N’ihi nke a ka ụnụ ji añụrị oke ọñụ, ọñụ nke dị ebube, bụ ọñụ ahụ nke ọnụ na-apụghị ịkọwa. Ụnụ na-añụrịkwa ọñụ n’ihi na ụnụ na-anata ihe ụnụ ji nwee okwukwe, bụ nzọpụta nke mkpụrụobi ụnụ.
MBEKU – Jọn 20:29
Aleluya, aleluya!
Jesu kwuru sị: “Ikwere n’ihi na ị hụla M. Ngọzi dịrị ndị na-ahụghị n’anya ma kwere.”
Aleluya!
OZIỌMA – 20:19-31
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Isi Okwu: Jesu bịara ka Ọ gasịrị mkpụrụ ụbọchị asatọ.
Na mgbede nke ụbọchị Ụka ahụ, bụ ụbọchị mbụ n’izu, ndị Ụmụazụ Jesu zukọrọ, kpọchie ụzọ n’ihi egwu ndị Juu. Mgbe ahụ, Jesu bịara, guzo n’etiti ha, sị ha: “Udo dịrị ụnụ!”
Mgbe O kwusịrị nke a, O gosịrị ha aka Ya abụọ na akụkụ Ya. Ya mere, ndị Ụmụazụ Ya ñụrịrị ọñụ mghe ha hụrụ Onyenweanyị. Jesu wee sị ha ọzọ: “Udo dịrị ụnụ! Dịka Nna M zitere M, otu a kwa ka M si eziga ụnụ”.
Mgbe O kwusịrị nke a, O kusara ha ume, sị ha: “Naranụ Mmụọ Nsọ. Ndị niile ụnụ gbaghara mmehie ha, a gbagharala ha. Ndị niile ụnụ jụrụ ịgbaghara mmehie ha, a gaghị agbaghara ha.”
Otu onye n’ime ndị ozi iri na abụọ ahụ, Tọmọs, nke a na-akpọ Ejima, esoghị ha nọrọ mgbe Jesu bịara. Ya mere, ndị ozi ibe ya ndị ọzọ, wee sị ya: “Anyị ahụla Onyenweanyị!” Tọmọs wee sị ha: “Ọ bụ naanị mgbe m jiri anya m hụ ebe ntu kpọpuru ya aka.
Ọ bụ naanị mgbe m tinyere aka m n’apa ntu ndị a, ọ bụkwa naanị mgbe m tinyere aka m n’akụkụ ya ebe a mara ya ube, ka m ga-ekwere na O sitela n’ọnwụ bilie.”
Mgbe ụbọchị asatọ gasịrị, ndị Ụmụazụ Ya zukọkwara ọzọ n’ime otu ụlọ. Tọmọs nọkwa n’etiti ha. A kpọchiri ụzọ akpọchi. Ma Jesu batara, guzo n’etiti ha, sị ha: “Udo dịrị ụnụ!” O wee sị Tọmọs, “Weta mkpịsị aka gị tinye n’ebe a. Lelee aka M abụọ.
Setịpụkwa aka gị, tinye ya n’akụkụ M. A bụla onye na-esi agụgọ. Kama bụrụ onye kwere ekwe.” Tọmọs wee tie, sị Ya: “Onyenwe m na Chineke m!” Jesu wee sị ya: “I kweere ugbu a n’ihi na i ji anya gị hụ.
Ma ngọzi dịịrị ndị na-ahụghị m ma kwere.” Ọtụtụ ọrụ ebube ndị ọzọ ka Jesu rụrụ n’ihu ndị Ụmụazụ Ya, ndị a na-edeghị n’ime akwụkwọ a. Ma e dere ndị a ka ụnụ wee kwere na Jesu bụ Kristi ahụ, Nwa Chineke, ka ụnụ wee site n’okwukwe ụnụ nweta ndụ n’aha Ya.
Igbo Mass Readings for April 17 2023, Mọnde Izuụka nke Abụọ n’oge Iista
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.