Igbo Mass Readings for April 7 2024, Ụka Nke Abụọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Abụọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 7 2024, Ụka Nke Abụọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Abụọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:32-35
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi
Isi Okwu: Ha ji otu obi na otu mmụọ biri.
N’oge ahụ, ọha ndị kwere na Kristi ji otu obi na otu uche n’ibi obi inwekọ ihe ha. Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ha na-asị na ihe ọ bụla ya nwere bụ nke naanị ya.
Kama ha nwekọrọ ihe niile ọnụ. Ndị ozi jikwa ike ha niile, na-agba akaebe banyere mbilite n’ọnwụ nke Onyenweanyị Jesu. Amara nke Chineke pụtakwara ihe n’ahụ ha niile n’ụba, n’ụzọ pụrụ iche.
Ọ dịghị onye ọ bụla n’etiti ha, onye ụmụnna n’ime Kristi hapụrụ ka ọ nọdụ n’ụkọ. Ndị nwere ala ubi, ma ọ bụ ụlọ rere ha, weta ego niile ha retara, tọgbọ ha n’ụkwụ ndị ozi. Ha na-ekesakwa ego ahụ niile, nye onye ọ bụla n’otu n’otu, dịka mkpa ya si dị.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 117:2-4, 15-18, 22- 24. Az. 1
Azịza: Nyenụ Onyenweanyị ekele n’ihi na Ọ dị mma. N’ihi na ịhụnanya Ya enweghị ngwụcha.
Ma ọ bụ Aleluya
1. Ka ụmụ Izrel kwuo sị: “Ịhụnanya Ya enweghị ngwụcha.”
Ka ụmụ Erọn kwuo sị: “Ịhụnanya Ya enweghị ngwụcha.”
Ka ndị niile na-atụrụ Onyenweanyị egwu kwuo sị:
“Ịhụnanya Ya enweghị ngwụcha.” Azịza.
2. A kpagidesiri m ike ka m daa,
ma Onyenweanyị nyeere m aka gbapụta m.
Onyenweanyị bụ ike m na ukwe m,
Ọ bụ Onye nzọpụta m.
Ụda mkpu ọñụ na mmeri,
dị n’ebe obibi nke ndị ezi omume. Azịza
3. Nkume nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ aghọọla ide ji ụlọ.
lhe a bụ ọrụ ebube nke Onyenweanyị,
ma ọ bụkwa ihe ịtụnanya n’ebe anyị nọ.
Taa bụ ụbọchị nke Onyenweanyị mere.
Ka anyị ñụrịanụ ọñụ bịakwa nwee obi añụrị. Azịza
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:1-6
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mbụ nke Jọn dị asọ dere
Isi Okwu: Onye ọ bụla a mụrụ na Chineke emerila ụwa.
Onye ọ bụla kwere na Jesu bụ Kristi ahụ, bụ onye a mụrụ ọzọ site na Chineke. Onye ọ bụla hụrụ Nna n’anya, hụkwara nwa ahụ nna mụrụ n’anya. Otu a ka anyị si ama na anyị na-ahụ ụmụ Chineke n’anya: Anyị na-amata site n’ịhụ Chineke n’anya na site n’idebe Iwu Ya.
N’ihi na ịhụ Chineke n’anya bụ idebezu Iwu Ya. Iwu Ya adịghịkwa arọ karịa ka mmadụ ga-ebuli. N’ihi na onye ọ bụla a mụrụ site na Chineke na-emeri ụwa.
Ma ike ahụ anyị ji emeri ụwa bụ okwukwe anyị. Ma, onye bụ onye na-emeri ụwa? Naanị onye kwere na Jesu bụ Nwa Chineke. Jesu Kristi bụ onye ahụ bịaranụ.
O jiri mmiri nke mmirichukwu na ọbara nke ọnwụ Ya bịa. O jighị naanị mmiri nke mmirichukwu bịa, kama O jiri mmiri na ọbara bịa. Mmụọ Nsọ n’onwe Ya na-agba akaebe na nke a bụ ezi okwu, n’ihi na Mmụọ Nsọ ahụ bụ Onye ezi okwu.
MBEKU
Aleluya, aleluya!
Jesu kwuru sị: “Ikwere n’ihi na ịhụla M. Ngọzi dịrị ndị na-ahụghị n’anya ma kwere.”
Aleluya!
OZIỌMA – 20:19-31
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Isi Okwu: Jesu bịara ka Ọ gasịrị mkpụrụ ụbọchị asatọ.
Na mgbede nke ụbọchị Ụka ahụ, bụ ụbọchị mbụ n’izu, ndị Ụmụazụ Jesu zukọrọ, kpọchie ụzọ n’ihi egwu ndị Juu. Mgbe ahụ, Jesu bịara, guzo n’etiti ha, sị ha: “Udo dịrị ụnụ!”
Mgbe O kwusịrị nke a, O gosịrị ha aka Ya abụọ na akụkụ Ya. Ya mere, ndị Ụmụazụ Ya ñụrịrị ọñụ mghe ha hụrụ Onyenweanyị. Jesu wee sị ha ọzọ: “Udo dịrị ụnụ! Dịka Nna M zitere M, otu a kwa ka M si eziga ụnụ”.
Mgbe O kwusịrị nke a, O kusara ha ume, sị ha: “Naranụ Mmụọ Nsọ. Ndị niile ụnụ gbaghara mmehie ha, a gbagharala ha. Ndị niile ụnụ jụrụ ịgbaghara mmehie ha, a gaghị agbaghara ha.”
Otu onye n’ime ndị ozi iri na abụọ ahụ, Tọmọs, nke a na-akpọ Ejima, esoghị ha nọrọ mgbe Jesu bịara. Ya mere, ndị ozi ibe ya ndị ọzọ, wee sị ya: “Anyị ahụla Onyenweanyị!” Tọmọs wee sị ha: “Ọ bụ naanị mgbe m jiri anya m hụ ebe ntu kpọpuru ya aka.
Ọ bụ naanị mgbe m tinyere aka m n’apa ntu ndị a, ọ bụkwa naanị mgbe m tinyere aka m n’akụkụ ya ebe a mara ya ube, ka m ga-ekwere na O sitela n’ọnwụ bilie.”
Mgbe ụbọchị asatọ gasịrị, ndị Ụmụazụ Ya zukọkwara ọzọ n’ime otu ụlọ. Tọmọs nọkwa n’etiti ha. A kpọchiri ụzọ akpọchi. Ma Jesu batara, guzo n’etiti ha, sị ha: “Udo dịrị ụnụ!” O wee sị Tọmọs, “Weta mkpịsị aka gị tinye n’ebe a. Lelee aka M abụọ.
Setịpụkwa aka gị, tinye ya n’akụkụ M. A bụla onye na-esi agụgọ. Kama bụrụ onye kwere ekwe.” Tọmọs wee tie, sị Ya: “Onyenwe m na Chineke m!” Jesu wee sị ya: “I kweere ugbu a n’ihi na i ji anya gị hụ.
Ma ngọzi dịịrị ndị na-ahụghị m ma kwere.” Ọtụtụ ọrụ ebube ndị ọzọ ka Jesu rụrụ n’ihu ndị Ụmụazụ Ya, ndị a na-edeghị n’ime akwụkwọ a. Ma e dere ndị a ka ụnụ wee kwere na Jesu bụ Kristi ahụ, Nwa Chineke, ka ụnụ wee site n’okwukwe ụnụ nweta ndụ n’aha Ya.
Igbo Mass Readings for April 8 2024, Nnukwu Emume Ikwupụta Ịtụrụ-ime nke Onyeweanyị.
Igbo Mass Readings for April 7 2024, Ụka Nke Abụọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Abụọ.