Igbo Mass Readings for January 14 2024, Ụka nke Abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 14 2024, Ụka nke Abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:3-10, 19

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mbụ nke Samuel

Isi Okwu: Dinwenụ, kwube, nwaodibo Gị na-ege ntị.

Samuel na-ehi ụra n’Ụlọ Nsọ nke Onyenweanyị, ebe igbe ọgbụgba ndụ nke Chineke nọ. Onyenweanyị wee kpọọ Samuel oku. Ọ za Ya sị: “Lee m.” Ọ gbara ọsọ gakwuru Elaị sị ya: “Lee m.

Ọ bụ gị kpọrọ m oku.” Elaị sị ya: “Akpọghị m gị oku. Laghachi n’ụra.” “O wee laghachikwa ịrahụ ụra. “Onyenweanyị akpọkwa Samuel oku ọzọ. O kulitekwa gakwuru Elaị sị: “Lee m.

Ọ bụ gị kpọrọ m oku.” Elaị sị ya: “Nwa m, akpọghị m gị oku. Laghachi azụ rahụ ụra.” N’oge ahụ. Samuel amatabeghị Onyenweanyị nke ọma, n’ihi na Onyenweanyị egosibeghị ya ihe ọ bụla.

Onyenweanyị ewee kpọkwa Samuel oku nke ugboro atọ. O kulitekwa gakwuru Elaị sị ya: “Lee m. Ị kpọrọ m oku”. Mgbe ahụ ka Elaị ji ghọta na ọ bụ Onyenweanyị na-akpọ nwatakịrị ahụ.

O wee sị Samuel: “Laghachi n’ụra. A kpọkwa gị oku ọzọ, za Ya: Onyenweanyị kwube, na nwodibo Gị na-ege ntị.” Mgbe Samuel lakpukwara ebe ọ na-edina, Onyenweanyị bịara gosị ya Onwe Ya.

Ọ kpọkwa oku dịka O si kpọbu ya na mbụ: “Samuel! Samuel!” Samuel za Ya: “Kwube na nwodibo Gị na-ege ntị.” Samuel wee too. Onyenweanyị nọnyekwara ya. O kweghị ka okwu ọ bụla si Samuel n’ọnụ pụta ghara ịdị ire.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 39: 2-4,7-10 Az. 8,9

Azịza: Onyenweanyị, anọ m n’ebe a. A bịara m ime uche Gị.

1. E cheela m Ya! Echeela m Onyenweanyị.

O wee hulatara m, bịakwa tọọ ntị n’ala na mbeku m bekuru Ya.

O wee tinye m ukwe ọ hụrụ n’ọnụ;

abụ otito nke Chineke anyị. Azịza.

2. Ọ bụghị aja na onyinye ịnata ihu ọma na-amasị Gị.

Kama ọ bụ ntị ghere oghe maka ihube isi ka I nyere m.

Aja nsure ọkụ na aja mmehie abụghị ihe Ị chọrọ.

Ya kpatara m ji sị: “Lee m, a bịala m.” Azịza.

3. Iwu e dere n’obodobo akwụkwọ nye m bụ na m ga-eme uche Gị.

Chineke m, ime uche Gị bụ ihe na-amasị m.

Ebu m iwu Gị n’obi m. Azịza.

4. Ezisaala m ozi ikpe nkwụmọtọ Gị n’ime Nzukọ Gị.

Onyenweanyị I ma nke ọma na-ekpuchighị m aka n’ọnụ m. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 6:13-15, 17-20

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt

Isi Okwu: Ahụ ụnụ bụ ihe dị n’ahụ Kristi.

Onye ọzọ na-ekwu sị: “Ihe oriri niile dịịrị afọ, afọ dịịrị ihe oriri niile. “Ma Chineke ga-eme ka afọ na ihe oriri ghara ịdị mkpa ọzọ. Chineke ekeghị ahụ anyị maka ịkwa iko.

Kama ọ dịịrị Onyenweanyị, Onyenweanyị dịkwara ahụ anyị. Ma Chineke mere ka Onyenweanyị, si n’ọnwụ bilie. Ọ ga-ejikwa ike ya mee ka anyị onwe anyị si n’ọnwụ bilie.

Ụnụ amaghị na ahụ ụnụ bụ ihe dị n’ahụ Kristi? Aga m ewere ihe dị n’ahụ Kristi mee ka ọ bụrụ ihe dị n’ahụ nwanyị na-akwa iko? Chineke ekwela! Ma onye ọ bụla na-arapara n’ahụ Onyenweanyị, Ya na ya ga-abụ otu n’ime mmụọ.

Gbanarịnụ ịkwa iko! N’ihi na mmehie ọ bụla ọzọ mmadụ na-emehie adịghị ata anụ ahụ ya ahụhụ ka ịkwa iko. N’ihi na onye ọ bụla na-akwa iko na-emehie megide ahụ ya.

Ma ọ bụ, ụnụ amaghị na ahụ ụnụ bụ Ụlọ Nsọ nke Mmụọ Nsọ, Onye bi n’ime ụnụ, Onye Chineke nyere ụnụ? Ya mere, ụnụ abụghị nke onwe ụnụ, kama nke Chineke. O jiri ihe dara oke ọnụ ahịa gbata ụnụ. N’ihi ya, na-enyenụ Chineke otito n’ahụ ụnụ.

MBEKU – Jọn 14:23

Aleluya, aleluya!

Onye ọ bụla hụrụ M n’anya, ga-ejidesi aka ike n’okwu M. Nna M ga-ahụkwa ya n’anya. Anyị ga-abịakwute ya.

Aleluya!

OZIỌMA – 1:35-42

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Isi Okwu: Ha hụrụ ebe O bi; wee gaa nọnyere ya.

N’echi ya, Jọn pụtakwara ọzọ ebe ahụ, ya na mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya. Mgbe ọ hụrụ Jesu ka Ọ na-agafe, o wee sị: “Leenụ Nwatụrụ Chineke”!

Mgbe mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nụrụ ihe o kwuru, ha hapụrụ ya sobe Jesu. Jesu wee tụgharịa, hụ ka ha na-eso Ya, wee sị ha: “Gịnị ka ụnụ na-achọ?”

Ha wee sị Ya: “Rabaị, olee ebe I bi?” (Ma ihe bụ Rabaị, ma a sụgharịa ya, bụ “Onye nkuzi.”) O wee sị ha, “Bịanụ ka ụnụ hụ.” Ha wee so Ya bịa hụ ebe O bi. Ya na ha wee nọdụ ụbọchị ahụ.

Mgbe ahụ bụ ihe dị ka elekere anọ n’ehihie. Andrụ nwanne Saịmọn Pita, bụ otu onye n’ime mmadụ abụọ ahụ nụrụ ihe Jọn kwuru wee sobe Jesu. Ihe mbụ Andrụ mere bụ na ọ chọtara nwanne ya bụ Saịmọn wee sị ya: “Anyị ahụla Mezaya ahụ” (nke bụ ma a sụgharịa ya, Kristi, ma ọ bụ, Onye ahụ e chiri echi).

O wee kpọrọ Saịmọn kpọgara Jesu. Jesu legidere ya anya wee sị: Gị bụ Saịmọn nwa Jọn. Site ugbu a, a ga na-akpọ gị Sefas, nke bụ Nkume, ma a sụgharịa ya.

Igbo Mass Readings for January 15 2024, Mọnde Izuụka nke Abụọ N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for January 14 2024, Ụka nke Abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Last Update: July 3, 2023