Igbo Mass Readings for January 19 2025, Ụka nke Abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 19 2025, Ụka nke Abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ..

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 62:1-5

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Aịzaya

Isi Okwu: Ihe gị, na-amasị Onyenweanyị.

N’ihi Zayọn, agaghị m edowe ọnụ m duu. N’ihi Jerusalem, agaghị m anọ jụụ ruo mgbe ezi omume ya were anya ka chi ọbụbọ; na mgbe mmeri ya nwuru vam ka mpioọkụ.

Mba dị iche iche ga-ahụ na Jerusalem emeriela; ndị eze niile ahụkwa ebube gị. A ga-agụ gị aha ọhụrụ nke Onyenweanyị ga-eji ọnụ Ya akpọ. Ị ga-aghọ okpu eze dị ebube n’aka nke Onyenweanyị.

Ị ga-abụkwa okpu eze mara oke mma n’ọba aka Chineke gị. A gakwaghị akpọ gị: “Nwanyị di gbaketere azụ” ọzọ. A gaghịkwa akpọ gị: “Ala tọgbọrọ n’efu” ọzọ.

Kama ihe a ga-akpọ gị bụ: “Obi di ya” A ga-akpọ ala gị: “Nwanyị ya na di ji obi ụtọ biri”, n’ihi na ihe gị masịrị Onyenweanyị. O meela ka ala gị bụrụ ala a lụrụ alụ ka nwunye.

Dịka nwokorobịa si alụrụ nwagbọghọ na-amaghị nwoke, otu ahụ kwa, ka onye ahụ na-ewulite gị elu ga-esi na-alụ gị ka nwunye. Dịka nwoke na-alụ nwunye ọhụrụ si añụrị ọñụ na nwunye ya, otu ahụ kwa ka Chineke gị ga-esi añụrị na gị.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 95:1-3, 7-10 Az. 3

Azịza: Kwupụtanụ ọrụ ịtụnanya nke Dinwenụ n’etiti mmadụ niile.

1. Kweerenụ Dinwenụ ukwe ọhụrụ.

Mba niile, kweerenụ Dinwenụ ukwe.

Kweerenụ Ya ukwe gọzienụ aha Ya. Azịza.

2. Kwupụtanụ enyemaka Ya kwa ụbọchị;

kwupụtanụ otito Ya n’etiti mba niile,

kwupụtanụ ọrụ ịtụnanya Ya n’etiti mmadụ niile. Azịza.

3. Ezi na ụlọ mmadụ niile, nyenụ Dinwenụ,

nyenụ Dinwenụ otito na ike.

Nyenụ Ya otito dịịrị aha Ya. Azịza.

4. Sekpuoronụ Dinwenụ n’ime Ụlọ Nsọ Ya;

ụwa niile, tụbaranụ Ya egwu,

kwupụtanụ na mba niile na “Chineke bụ eze”.

Ọ ga-eji ikpe nkwụmọtọ kpee mmadụ niile ikpe. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 12:4-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt

Isi Okwu: Otu Mmụọ Nsọ ahụ na-enye onye ọ bụla onyinye otu O siri masị Ya.

Onyinye amara dị iche iche dị, ma otu Mmụọ Nsọ ahụ na-enye ha niile. Oke ije ozi dị iche iche dịkwa, ma otu Onyenweanyị ahụ ka a na-ejere ozi. Ụdị ike dị iche iche nke e ji arụ ọrụ dịkwa, ma otu Chineke ahụ na-etinye ike ndị a n’ime onye ọ bụla iji jee ozi.

Ọ na-enyekwa onye ọ bụla amara igosi ike nke Mmụọ Nsọ maka ọdịmma mmadụ niile. Otu ọ dị, otu Mmụọ Nsọ ahụ na-enye otu onye ike ikwu okwu amamihe, nyekwa onye ọzọ ike ikwuwa ihe ọmụma.

Otu Mmụọ Nsọ ahụ na-enye otu onye okwukwe siri ike, nyekwa onye ọzọ ike ịgwọ ndị ọrịa. Mmụọ Nsọ na-enye otu onye nrụpụta nke ọrụ dị ike, nyekwa onye ọzọ ike ibu amụma, nyekwa onye ọzọ ike itule mmụọ dị iche iche.

Ọ na-enye otu onye ike ịsụ asụsụ dị iche iche; nyekwa onye ọzọ ike ịkọwa asụsụ dị iche iche. Ihe ndị a niile ka naanị otu Mmụọ ahụ na-arụsi ike n’ime onye ọ bụla. Ọ na-ekenyekwa onye ọ bụla onyinye amara n’otu n’otu dịka O si chọọ.

MBEKU – Jọn 6, 63. 68

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị, okwu Gị bụ mmụọ; ha bụ ndụ. Ọ bụ Gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi.

Aleluya!

OZIỌMA – 2:1-12

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Isi Okwu: Nke a bụ akara izizi Jesu gosiri. O mere ya na Kena nke Galili.

N’ụbọchị nke atọ, e siri oriri ọlụlụ di na nwunye na Kena nke Galili. Nne Jesu nọ ebe ahụ. A kpọkwara Jesu na Ụmụazụ Ya n’oriri ọlụlụ di na nwunye ahụ.

Mgbe mmanya gwụsịrị, nne Jesu sịrị Ya: “Ha enwekwaghị mmanya.” Jesu wee sị ya: “Nwanyị, olee ụzọ nke a si gbasa Mụ na gị? Oge M erubeghị. “Nne Ya wee sị ndị na-eje ozi: “Meenụ ihe ọ bụla Ọ sị ụnụ mee.”

Dịka omenala ịsa ụkwụ na aka nke ndị Juu si chọọ, ite mmiri nkume isii dọrọ ebe ahụ. Nke ọ bụla n’ime ha na-eri ihe dịka ọgụ udu mmiri, ma ọ bụ ọgụ udu mmiri na iri.

Jesu wee gwa ndị na-eje ozi, sị: “Gbajuonụ ite mmiri ndị a mmiri.” Ha wee gbajupụta ha n’ọnụ. Jesu wee sị ha: “Ngwa, gbapụtanụ ihe nta bugara onye isi oriri.”

Ha wee bugara ya. Onye isi oriri wee detụ mmiri ahụ e mere ka ọ bụrụ mmanya ọnụ. Ọ maghị ebe o si pụta. (Ma ndị na-eje ozi, ndị gbapụtara mmiri ahụ, maara ebe o si).

O wee kpọọ nwoke ahụ na-alụ nwunye, sị ya: “Onye ọ bụla na-ele ọbịa, na-ebu ụzọ bupụta mmanya dị ụtọ. Mgbe ndị mmadụ ñụjuru afọ ha, O wepụta nke na-adịchaghị mma.

Ma gị onwe gị hapụrụ iweta mmanya dị ụtọ ruo ugbu a.!” Ọ bụ na Kena nke Galili ka Jesu rụrụ ihe ịrịba-ama nke mbụ n’ime ọrụ ebube Ya niile. O wee si otu a gosi ebube Ya.

Ụmụazụ Ya wee kwere na Ya. Mgbe nke a gasịrị, Jesu gbadara na Kapanọm, Ya na nne Ya, na ndị ikwu na ibe Ya, na ndị Ụmụazụ Ya. Ha wee nọọ ebe ahụ ụbọchị olemole.

Igbo Mass Readings for January 20 2025, Mọnde Izuụka nke Abụọ N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for January 19 2025, Ụka nke Abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

Last Update: July 3, 2023