Igbo Mass Readings for December 8 2024, Ụka nke Abụọ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Atọ

Nke a bụ Igbo Mass Readings for December 8 2024, Ụka nke Abụọ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Atọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:1-9

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Baruk

Isi Okwu: Chineke chọrọ igosị mba niile ebube Gị.

Jerusalem, yipụ uwe mkpe na ọnụma gị! Yiri ịma mma nke ebube Chineke ebighị ebi, ebighị ebi! Were ezi omume nke Chineke fụọ onwe Gị n’ahụ gburugburu dịka akwa.

Were ebube Onye dị ebighị ebi, kpuru n’isi ka okpu eze. Ebe ọ bụ na Chineke chọrọ igosị obodo niile nọ n’okpuru eluigwe ebube gị; ebe ọ bụ na aha dị ebịghị ebi, Chineke kpọrọ gị bụ: “Udo sitere n’ezi omume; na ugwu sitere n’ịsọpụrụ Chukwu.”

Jerusalem, bilie! Guzoro n’elu ugwu! Chee ihu n’ọwụwa anyanwụ! Lee ebe ụmụ gị si n’ọwụwa anyanwụ, na ọdịda anyanwụ zukọkwara ọzọ, maka na Onye Nsọ tiri iwu.

Añụrị juru ha obi, n’ihi na Chineke chetara ha. Ọ bụ ezie na ha gbara ụkwụ-ala mgbe ha na-ahapụ gị, mgbe ndị iro duuru ha pụọ. Ma ugbu a, Chineke ji aka Ya, na-edulatara gị ha, dịka ndị eze nwere ugwueze.

N’ihi na Chineke etiela iwu, ka a gbarie ugwu ukwu na ugwu nta niile dị ebighị ebi; ka e kpochie ndagwurugwu nilie, ka ala dị rarịị; ka Izrel nwee ike iji ume na obi iru ala, na-aga n’okpuru ebube Chineke; ka oke ọhịa na osisi niile nwere isi ọma, nwee ike inye Izrel ndo, dịka iwu Chineke si dị. Maka na Chineke ga-eji ihe nke ebube Ya na-atụziri Izrel aka; bịakwa were ebere na izu oke nke Ya na-edu Izrel.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 125:1-6, Az. 3

Azịza: Leenụ ọrụ ebube Onyenweanyị rụụrụ anyị. N’ezie, obi dị anyị ụtọ.

1. Mgbe Onyenweanyị gbapụtara Zayọn n’ọnọdụ ịgba ohu,

ọ dị ka ihe mere na nrọ.

Mgbe ahụ ka ọnụ anyi bụ sọ ọchị,

egbugbere ọnụ anyị bụ sọ abụ. Azịza.

2. Ndị ọgọmmụọ n’onwe ha na-asị:

“Leeny ọrụ ebube Dinwenụ rụụrụ ha!”

Leekwanụ ọrụ ebube Onyenweanyị rụụrụ anyị.

N’ezie, obi dị anyị ụtọ. Azịza

3. Onyenweanyị zọpụta anyị n’ọnọdụ ịgba ohu,

dịka mmiri na-asọ asọ si eme n’ala kpọrọ nkụ.

Ndị bu anya mmiri n’anya na-agha mkpụrụ akụkụ,

ga-eji ọñụ na-aghọ mkpụrụ ya. Azịza

4. Ha bu anya mmiri, buru mkpụrụ akụkụ na-eje n’ubi.

Ha kweere ukwe, buru ihe-owuwe-ubi na-alọta. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:4-6, 8-11.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl dị asọ degaara ndị Filipai

Isi Okwu: Dịnụ ọcha! Ụnụ enwekwala ihe a ga-eji taa ụnụ ụta n’Ụbọchị Kristi.

Mgbe ọ bụla m na-echeta ụnụ niile n’ekpere, eji m ọñụ na-ekpe ya, n’ihi na-echetara m otu ụnụ si nye aka n’ịgbasa Oziọma ahụ, site n’ụbọchị mbụ ụnụ nụrụ ya, ruo taa.

E kwesiri m ike na Onye ahụ bidoro ọrụ ọma a n’ime ụnụ, ga-eji anya Ya hụ na a rụchara ya, mgbe Ụbọchị Kristi Jesu bịaruru. Chineke ma ka ụnụ si agụ m agụụ n’obi.

Ekpere m bụ, ka ịhụnanya ụnụ hụrụ ibe ụnụ na-amụba mmaji kwuru mmaji; ghara ịkwụsị ime ka ụnụ na-eto n’amamihe na nghọta; ka ụnụ wee nwee ike ịchọpụta nke bụ ọkachamma.

Ọ ga-enyere ụnụ aka ịdị ọcha; a ghara ịta ụnụ ụta; ụnụ wee kwadoo maka Ụbọchị Kristi. Mgbe ahụ ka ụnụ ga-eru ezumezu ịdịmma, nke Kristi mịtara n’ime anyị, maka otito na ebube nke Chineke.

MBEKU – Luk 3:4, 6

Aleluya, aleluya!

Dozierenụ Onyenweanyị ụzọ. Meenụ ka ụzọ Ya dị ziziriri. Mmadụ niile ga-ahụ nzọpụta Chineke.

Aleluya!

OZIỌMA – 3:1-6

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Isi Okwu: Ụwa niile ga-ahụ nzọpụta Chineke

N’afọ nke iri na ise kembe Tiberios Siza bidoro chịwa; mgbe Pọntiọs Pailet bụ gọvanọ Judia; Herọd bụ eze nta nke Galili; nwanne ya bụ Filip bụ eze nta ala Ituria na Trakonitis.

Lisanias bụ eze nta nke Abilen; mgbe Anas na Kaịfas chịrị ka nnukwu ụkọchukwu, okwu Chineke bịakwutere Jọn; nwa Zekarịa n’ime ọzara. Ọ gagharịrị n’ọnụmara Jọdan niile, na-ekwupụta mmirichukwu nchegharị maka mgbaghara njọ, dịka e dere ya n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya: “Otu olu na-akpọ n’ọzara: Kwadoonụ ụzọ maka Onyenweanyị.

Meenụ ka okporo ụzọ Ya guzozie. A ga-ekpochi ndagwurugwu niile; a ga-akọda ugwu ukwu na ugwu nta niile. A ga-eme ka ụzọ gbagọrọ agbagọrọ guzozie. A ga-eme ka ụzọ jupụtara n’obu dị rarịị. Mmadụ niile ga-ahụ nzọpụta Chineke.”

Igbo Mass readings for December 9 2024, Emume Ịtụ Ime Marịa dị Ngọzi N’Ejighị Njọ

Igbo Mass Readings for December 8 2024, Ụka nke Abụọ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Atọ.