Igbo Mass Readings for March 1 2026, Ụka nke Abụọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Mbụ

Nke a bụ Igbo Mass Readings for March 1 2026, Ụka nke Abụọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 12:1-4

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Jenesis

Isi Okwu: Oku a kpọrọ Ebreham, nna ndị nke Chineke

Onyenweanyị gwara Ebram sị: “Kwapụ n’obodo gị, hapụ ndị ikwu na ibe gị na ụlọ nna gị. Bịa gawa n’ala ahụ M ga-egosi gị. Aga M eme ka ị ghọọ oke obodo.

Aga M agọzi gị, bịakwa mee ka aha gị daa oke ụda, nke na ọ ga-abụ aha e ji enye ngọzi. Aga M agọzi ndị ọ bụla gọziri gị. Ndị ọ bụla ledara gị anya, aga M abụ ha ọnụ.

Agbụrụ niile dị n’ụwa ga-eji gị agọzi onwe ha.” N’ihi ya, Ebram malitere ije dị ka Onyenweanyị siri gwa ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 32: 4-5, 18-22. Az. 22

Azịza: Biko Onyenweanyị, mee ka ịhụnanya Gị dakwasa anyị, ebe anyị tụkwasara nchekwube anyị niile na Gị.

1. N’ihi na okwu nke Onyenweanyị ziri ezi.

Ọrụ aka Ya niile kwesịrị ntụkwasa obi.

Onyenweanyị hụrụ ezi omume na ikpe nkwụmọtọ n’anya.

Ụwa niile jupụtara n’ịhụnanya Ya. Azịza.

2. Anya Onyenweanyị na-ele ndị na-asọpụrụ Ya.

Ọ na-ele ndị tụkwasara obi n’ịhụnanya Ya.

Ka ọ zọpụta ha n’ọnwụ;

bịakwa nye ha nri n’oge ụkọ nri. Azịza.

3. Mkpụrụobi anyị na-eche Onyenweanyị.

Onyenweanyị bụ enyemaka na mgbodo anyị.

Onyenweanyị, mee ka amara Gị dakwasa anyị,

ebe anyị tụkwasara obi anyị niile na Gị. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:8-10

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Nke Abụọ Pọl dị asọ degaara Timoti

Isi Okwu: Chineke na-akpọ anyị oku. Ọ na-enyekwa anyị ihe.

Ihere emela gị ịgbara Onyenweanyị akaebe. Ihere emela gị n’ihi mụ onwe m bụ onye mkpọrọ n’ihi Ya. Kama, dị ka Chineke si nye gị ike na ume, soro kere oke ịta ahụhụ dịịrị gị n’ihi Oziọma ahụ.

Chineke zọpụtara anyị, wee kpọọ anyị ịbụrụ Ya ndị nsọ. Ọ bụghị n’ihi ọrụ ọma anyị, kama n’ihi amara na nzube Ya. O nyere anyị amara nke a n’ime Kristi Jesu tupu e kee ụwa.

Ma ugbu a, O kpugheerela anyị amara ahụ site n’ọbịbịa na ngọzi nke Onye Nzọpụta anyị, Kristi Jesu, Onye merela ka ọnwụ ghara ịdị ire. O sitekwala n’Oziọma Ya kpughee ụzọ e si enweta ezi ndụ na anwụghị anwụ nke ndụ anyị.

MBEKU – Matiu 17:5

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

A nụrụ olu nke Nna ka O siri n’igwe ọcha tie mkpu sị: “Onye a bụ Nwa M, M hụrụ n’anya. Geenụ Ya ntị.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

OZIỌMA – 17:1-9

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Ihu Ya mụkesiri ka anyanwụ.

Jesu kpọọrọ Pita, na Jemis na Jọn nwanne Jemis, duru ha rịgoro otu ugwu dị elu. Ha wee nọdụ iche. Jesu wee nwoghaa onwe Ya n’ihu ha. Ihu Ya wee na-egbukepụ dị ka anyanwụ.

Uwe Ya na-enwu ọcha dị ka ihe. Na mberede, ha hụrụ Mosis na Elaịja, ka ha na Jesu na-akparịta ụka. Pita wee sị Jesu: “Onyenweanyị ọ dị mma ka anyị nọrọ n’ebe a.

Ọ bụrụ na Ị chọrọ, aga m ewu ụlọ ikwuu atọ n’ebe a: otu dịrị Gị, otu dịrị Mosis, otu adịkwara Elaịja.” Pita ka kpụ okwu n’ọnụ, mgbe urukpu na-enwu ọcha bịara, kpugide ha.

Olu wee si n’urukpu ahụ daa, sị: “Onye a bụ Nwa M, M hụrụ n’anya, Onye omume Ya dị M ezi mma. Nụrụnụ okwu Ya!” Mgbe Ụmụazụ Ya nụrụ olu a, oke egwu jidere ha; ha wee daa n’ala, kpuchie ihu ha. Jesu wee bịakwute ha, bitu ha aka, sị: “Bilienụ! ụnụ atụla egwu!”

Mgbe ha welitere anya, ọ dịghịkwa onye ọzọ ha hụrụ ma ọ bụghị naanị Jesu. Mgbe ha si n’elu ugwu ahụ na-arịdata, Jesu dọsiri ha aka na ntị ike, sị: “Ụnụ agwakwala onye ọ bụla ihe ụnụ hụrụ ruo mgbe Nwa nke Mmadụ ga-esilarị n’ọnwụ bilie.”

Igbo Mass readings for March 2 2026,

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for March 1 2026, Ụka nke Abụọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Mbụ.

Last Update: March 9, 2023