Igbo Mass Readings for March 16 2025, Ụka nke Abụọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Atọ
Nke a bụ Igbo Mass Readings for March 16 2025, Ụka nke Abụọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Atọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 15:5-12, 17-18
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Jenesis
Isi Okwu: “Ọgbụgbandụ Chineke na Ebreham, nwoke nwere okwukwe.”
Chineke kpọpụtara Ebram ezi wee sị ya: “Lee anya na mbara igwe ka ị gụọ kpakpando niile ọnụ ma ọ bụrụ na i nwere ike. Otu ahụ ka mkpụrụ gị ga-adị.” Ebram tụkwasara okwukwe n’Onyenweanyị, Onye gụnyere ya n’onye ezi omume.
Ọ gwara Ebram sị: “Abụ M Dinwenụ. Onye si na Ur nke Kaldịa kpọpụta gị ka ị nweta ala nke a.” Ebram azaa sị: “Onyenwe m Chineke, olee ka m ga-esi mara na m ga-enweta ya?”
Chineke asị ya: “Wetara m otu nwa ehi gbara afọ atọ, otu ewu gbara afọ atọ, otu ebulu gbara afọ atọ, otu nduru na otu nwa kpalakwukwu.” O wetaara ya ihe ndị a niile, bịa kpọwaa nke ọ bụla n’ime ha ụzọ abụọ, dote ọkara n’otu akụkụ ma dotekwa ọkara nke ọzọ n’akụkụ nke ọzọ ebe o chere ọkara nke mbụ ihu.
Ma ọ kpọwaghị nnụnụ abụọ ndị ahụ. Nnụnụ na-eri anụ fedara iri ozu anụ ahụ mana Ebram chụfụrụ ha. Mgbe anyanwụ na-adakpu, Ebram arahụ ụra miri emi; oke ụjọ jidere ya.
Mgbe anyanwụ dachara, ọchịchịrị agbachie ebe niile, Ebram hụrụ ite na-akwụ anwụrụ ọkụ, na ọwa na-enwu ọkụ, ka ha si n’etiti ibe anụ ndị ahụ na-agafe. N’ụbọchị ahụ ka Onyenweanyị na Ebram gbara ndụ.
N’ọgbụgba ndụ ha, Chineke gwara Ebram sị: “Mkpụrụ gị ka M na-enye ala nke a, site n’osimiri ljipt ruo na nnukwu osimiri nke ọzọ.”
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 26:1, 7-9, 13-14 Az. 1
Azịza: Dinwenụ bụ ihe m na enyemaka m.
1. Dinwenụ bụ ihe m na enyemaka m.
Onye ka m ga-atụrụ egwu?
Dinwenụ bụ ebe obibi siri ike nke ndụ m.
Onye ka m ga-agbara ọsọ? Azịza.
2. Onyenwe m, nụrụ olu m mgbe m kpọkuru Gị.
Mee ebere, za m oku.
Ọ bụ Gị ka obi m na-ekwupụta sị:
Chọọ ihu Ya.” Azịza.
3. Onyenwe m, ihu Gị ka m na-achọ;
e zonahụkwala m ihu Gị.
E jikwala iwe chụpụ odibo Gị.
Gị bụ onye enyemaka m. Azịza.
4. Ekwere m na aga m ahụ obi ọma Onyenweanyị n’ala ndị dị ndụ.
Chekwube na Ya; jisie Ya ike;
obi sie gị ike. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 3:17-4:1
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl dị asọ degaara ndị Filipaị
Isi Okwu: Kristi ga-enwogha ahụ anyị ka ọ dị ka nke Ya dị ebube.
Ụmụnna m, bụrụnụ otu n’iñomi ụkpụrụ m tọọrọ ụnụ. Na-eñominụ ndị na-ebi ụdị ndụ ahụ anyị biri. Mụrụnụ ihe n’aka ha, otu ụnụ si mụrụ ihe n’aka anyị.
Agwala m ụnụ ihe a ugboro ugboro n’oge gara aga. Ma taa, ebu m anya mmiri n’anya na-agwakwa ya ụnụ ọzọ: Na-enwere ọtụtụ mmadụ, ndị na-ebi ụdị ndụ na-egosi na ha bụ ndị iro nke obe Kristi.
Ịla n’iyii bụ ihe dị n’akara aka ndị dị otu a. Ha jiri erimeri mere chi ha. Ihe kwesịrị ime ha ihere ka ha ji etu ọnụ. Ha na-atụkwasị uche naanị n’ihe nke ụwa. Ma nke e ji mara anyị bụ na eluigwe bụ obodo anyị.
Ọ bụ n’eluigwe ka Onye Nzọpụta ahụ anyị na-atụ anya Ya, bụ Onyenweanyị Jesu Kristi, ga-esi abịa. Ọ ga-agbanwo ahụ anyị nke a dị nkịrịka ka o nwee oyiyi ọhụrụ, dị ka ahụ Ya nke dị ebube.
Ike Ọ ga-eji eme nke a bụkwa otu ike ahụ O nwere iji mee ka ụwa niile nọrọ n’okpuru ọchịchị Ya. Ya mere, ụmụnna m, m hụrụ n’anya, ndị enyi m ọma, kwụrụnụ chịm n’okwukwe siri ike n’ime Onyenweanyị. Agụụ ụnụ na-agụsi m ike mgbe ọ bụla. Ụnụ bụ ndị m ji eme ọnụ, na-añụrị m, na okpu eze m.
MBEKU – Matiu 17:15
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Olu nke Nna si n’urukpu igwe daa sị: Onye a bụ Nwa M, M hụrụ n’anya. Geenụ Ya ntị.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 9:28-36
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Isi Okwu: “Mgbe Jesu na-ekpe ekpere, ihu Ya gbanwoo.”
Jesu kpọọrọ Pita, na Jọn na Jemis rịgoro n’elu ugwu ikpe ekpere. Mgbe Ọ na-ekpe ekpere, ọdịdị ihu Ya gbanwere. Uwe ya nwupụrụ ọcha, ọ chara nnọọ vaaa, chakarịa ihe ọcha ọ bụla anya mmadụ hụrụla.
Na mberede, mmadụ abụọ bịara na-akpanyere Ya ụka. Ndị ahụ bụ Mosis na Elaịja, ndị siri na mmụọ pụta ihe n’ebube. Ha na Jesu na-akparịta ụka maka ụla Ya, nke a gaje imezu na Jerusalem.
Nnukwu ụra ji Pita na ndị ya na ha nọ. Ma ha jisiri ike mụrụ anya, wee hụ ebube Jesu, hụkwa mmadụ abụọ ndị ahụ Ya na ha guzoro. O wee ruo mgbe mmadụ abụọ ahụ na-ahapụ, Pita sị Jesu “Nna anyị ukwu, ọ dị mma ka anyị nọrọ n’ebe a: Ka anyị wuonụ ụlọ-ikwuu atọ, otu dịrị Gị, otu adịrị Mosis, otu adịkwara Elaịja.”
Ma Pita amaghị ihe ọ na-ekwu ekwu. Mgbe ọ na-ekwu ihe a, igwe oji bịara, kpuchie ha. Oke egwu jidere ha. Ma otu olu siri n’igwe oji tie sị: “Onye a bụ Nwa M, Onye ahụ M họtara ahọta. Nụrụnụ olu Ya!”
Mgbe olu ahụ kwusịrị, naanị Jesu ka a hụrụ. Ma Ụmụazụ kpuchiri ọnụ ha. N’oge ahụ, ha akọrọghị onye ọ bụla akụkọ ọ bụla banyere ihe ha hụrụ.
Igbo Mass readings for March 17 2025,
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.