Igbo Mass Readings for April 21 2024, Ụka Nke Anọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 21 2024, Ụka Nke Anọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:8-12

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi

Isi Okwu: Naanị aha nke a nwere ike ịzọpụta Gị.

Ma Pita, ebe o jupụtara na Mmụọ Nsọ, ọ sịrị ha: “Ndị isi ala! Ndị Okenye! Ọ bụrụ na ihe e ji ekpe anyị ikpe taa bụ n’ihi ọrụ ọma a rụrụ n’ahụ onye ngwọrọ, na otu e si mee ka ahụ dị ya mma, ka o doo ụnụ niile na ndị Izrel niile anya, na ọ bụ n’aha Jesu Kristi Onye Nazaret, Onye ụnụ kpọgburu n’obe, Onye Chineke mere ka O si n’ọnwụ bilie, ka nwoke a guzo n’ebe a n’ihu ụnụ dị ka onye ahụ zuru oke. Jesu bụ Onye ahụ Akwụkwọ Nsọ na-ekwu maka Ya sị:

“Nkume nke ụnụ bụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ aju, aghọọla nkume dị mkpa n’ụlọ ahụ. O nweghị onye ọzọ pụrụ ịzọpụta anyị. N’ihi na ọ dịghị aha ọzọ dị n’okpuru eluigwe, nke Chineke nyere ụmụ mmadụ a ga-eji azọpụta anyị, karịa aha Jesu.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 117:1. 8-9, 21-23, 26, 28-29 Az. 22

Azịza: Nkume ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ, aghọọla nkume dị mkpa n’ụlọ ugbu a.

Ma ọ bụ Aleluya

1. Aleluya, kelenụ Onyenweanyị n’ihi na Ọ dị mma.

Maka na ebere Ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Ọ ka mma ịgbaba n’ime Onyenweanyị karia ịtụkwasa obi na mmadụ.

Ọ ka mma ịgbaba n’ime Onyenweanyị karia ịtụkwasa obi na ndị ọchịchị. Azịza.

2. Aga m ekele Gị n’ihi na Ị zara m oku.

Ị bụ Onye Nzọpụta m.

Nkume ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ aghọọla nkume dị mkpa n’ụlọ ugbu a.

Ihe a bụ aka ọrụ nke Onyenweanyị,

ma ọ bụkwa ihe ịtụnanya n’ebe anyị nọ. Azịza.

3. Ngọzi dịrị Onye bịara n’aha Onyenweanyị.

Anyị si n’ụlọ Onyenweanyị na-agọzi gị.

Aga m ekele gị n’ihi na Ị zara m oku.

Ị bụkwa Onye nzọpụta m.

Kelenụ Onyenweanyị n’ihi na Ọ dị mma.

Obi ọma Ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 3:1-2

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Jọn dị asọ dere

Isi Okwu: “Anyị ga-ahụ Chineke ka O si dị n’Onwe ya!”

Leenụ ụdị ịhụnanya nke Chineke Nna nwere n’ebe anyị nọ! Ọ bụ oke ịhụnanya nke mere ka a kpọọ anyị ụmụ Chineke. Anyị wee bụrụ ụmụ Ya n’eziokwu.

Ma otu ọ dị, n’ihi na ụwa amaghị Chineke, ụwa amaghịkwa anyị. Ndị enyi m ọma, ugbu a, anyị aghọọla ụmụ Chineke. E mebeghị ka ihe anyị ga-abụ n’ọdịnihu pụta ihè. Ma anyị, maara nke ọma na mgbe ọ bụla Chineke ga-eme ka Kristi pụta ihe, anyị ga-adị ka Ya. N’ihi na anyị ga-ahụ Ya dị ka Ọ dị.

MBEKU – Jọn 10:14

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị kwuru sị: Abụ M ezigbo onye nche atụrụ. Amaara M atụrụ M, atụrụ M makwaara M.

Aleluya!

OZIỌMA – 10:11-18

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Isi Okwu: “Ezigbo Onye nche atụrụ na-enye ndụ Ya n’ihi atụrụ Ya.”

Jesu kwuru sị: “Mụ onwe M bụ ezi onye ọzụzụ atụrụ. Ezi onye ọzụzụ atụrụ na-atọgbọ ndụ ya n’ihi atụrụ ya. Ma onye ọrụ e goro ego, adịghị elezi atụrụ ya anya.

Ọ hụ nkịta ọhịa ka ọ na-abịa, ọ na-agbapụ ọsọ, hapụ atụrụ ahụ ka nkịta ọhịa buru ha, ma ọ bụ chụsasịa ha. Ọ kpọghị atụrụ ahụ ihe, n’ihi na ọ bụ onye ọrụ egoro ego.

Mụ onwe M bụ ezi onye ọzụzụ atụrụ. Amaara M atụrụ m, atụrụ M makwaara M. Dịka Nna M si mara M. Mụ onwe M amarakwa Nna M; otu a ka M si mara atụrụ M.

Ana M atọgbọkwa ndụ M n’ihi atụrụ M. E nwekwara M ọtụtụ atụrụ ọzọ, ndị na-anọghị n’ime ogige atụrụ nke a. Aga m akpọbatakwa ha ka m nwee naanị otu ogige.

Ha ga-anụkwa olu M. Mgbe ahụ naanị otu igwe atụrụ na otu onye ọzụzụ atụrụ ga-adị. “Nna M hụrụ m n’anya, n’ihi na ana M atọgbọ ndụ M ka M wee nara ya ọzọ.

Ọ dịghị onye na-anapụ M ndụ M. Ọ bụ mkpebiri n’onwe m ịtọgbọ ndụ m. E nwere m ike ịtọgbọ ya, nweekwa ike iweghachi ya. Nke a bụ ihe Nna M nyere M iwu ka M mee”.

Igbo Mass Readings for April 22 2024, Mọnde Izuụka nke Anọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi

Igbo Mass Readings for April 21 2024, Ụka Nke Anọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Abụọ.