Igbo Mass Readings for May 11 2025, Ụka Nke Anọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Atọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 11 2025, Ụka Nke Anọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Atọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 13:14, 43-52
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi
Isi Okwu: “Anyị ga-agbaketa ụnụ azụ, jekwuru ndị ọgọ mmụọ.
Ma ha onwe ha siri na Pega bịaruo obodo Antiọk nke dị n’ala Pisidịa. N’ụbọchị izuike ndị Juu, ha wee banye n’ụlọ nzukọ obodo ahụ, nọdụ ala. Mgbe ndị nzukọ ahụ gbasara, ọtụtụ ndị Juu na ọtụtụ ndị mba ọzọ, ndị a kpọbatara n’okpukpe ndị Juu, sooro Pọl na Banabas.
Ndị ozi ahụ wee gwakwuo ha okwu, na-agba ha ume ka ha nọgidesie ike n’ihe ha nụrụ, tụkwasị obi n’amara Chineke. N’ụbọchị izuike ọzọ, ọ fọdụrụ ihe nta ka obodo ahụ niile zukọọ ịnụ okwu Chineke.
Ma mgbe ndị Juu hụrụ igwe mmadụ ahụ, ha bidoro inwe anya ụfụ megide Pọl na Banabas, bịakwa jupụta n’ekworo. Ha wee malite ikwu okwu megide ihe Pọl na-ekwu, na inye ya mkparị.
Ma Pọl na Banabas kwuru okwu n’asọghị anya, sị: “Ọ dị mkpa na mbụ ka e buru ụzọ gwa ụnụ okwu Chineke. Ma ebe ụnụ jụrụ ya, sikwa n’omume na-ekpebi na ụnụ ekwesịghị ịba na ndụ ebighị ebi, lee, anyị ga-ahapụ ụnụ, jekwuru ndị mba ọzọ. N’ihi na otu a ka Onyenweanyị nyere anyị n’iwu sị:
“Ewepụtala M gị iche ka ị bụụrụ ndị mba ọzọ ihe, ka i wee kwusaa ụzọ nzọpụta ruo n’akụkụ ụwa niile”. Mgbe ndị mba ọzọ nọ ebe ahụ nụrụ nke a, obi tọrọ ha ụtọ. Ha wee too okwu Chineke. Ndị niile e debeere ịnata ndụ ebighị ebi wee kwere na Jesu.
Okwu nke Onyenweanyị wee gbasaa n’ebe niile dị n’ala ahụ niile. Ma ndị Juu kpaliri obi ọtụtụ ụmụ nwanyị na-atụ egwu Chineke, ndị a ma ama n’obodo ahụ, na ụmụ nwoke ndị ọha na eze na-asọpụrụ n’obodo ahụ.
Ha wee kpalie nsogbu megide Pọl na Banabas, wee chụpụ ha n’oke-ala ha. Ndị ozi ahụ wee tichapụ aja dị ha n’ụkwụ dịka ihe ịma ikpe megide ha, wee jee obodo Ịkoniọm. Ndị na-eso ụzọ Jesu ndị bi na Antiọk wee jupụta n’ọñụ na Mmụọ Nsọ.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 99:1-3, 5. Az. 3
Azịza: Anyị bụ ndị nke Ya; bụrụkwa ụmụ atụrụ nke igwe atụrụ Ya.
Ma ọ bụ Aleluya
1. Ụwa niile, werenụ ọñụ bụọrọ Onyenweanyị abụ.
Werenụ ọñụ fee Onyenweanyị ofufe.
Werenụ ukwe añụrị bịa n’ihu Ya. Azịza.
2. Maranụ na Onyenweanyị bụ Chineke.
Ọ bụ Ya kere anyị.
Anyị onwe anyị bụ ndị nke Ya.
Bụrụkwa igwe atụrụ ahụ Ọ na-azụ. Azịza.
3. Onyenweanyị dị mma.
Obi ọma Ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
O kwesịrị ntụkwasa obi ruo na ndụdụgandụ niile. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 7:9, 13-17
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mkpughe
Isi Okwu: Nwatụrụ ahụ ga-abụ onye nche ha; Ọ ga-eduga ha ebe mmiri nke ndụ na-asọpụta.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, m wee lee anya, hụ oke igwe mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ. Ha si n’agbụrụ niile, na ebe niile, na mba niile, na asụsụ niile pụta. Ha guzo n’ihu oche eze ahụ na n’ihu Nwatụrụ ahụ.
Ha yikwasara onwe ha uwe-mwụda dị ọcha, jirikwa igu nkwụ n’aka ha. Otu n’ime ndị okenye ahụ wee jụọ m sị: “Ndị a Chineke gbokwasịrị uwe-mwụda dị ọcha, ha bụ ndị ole? Olee ebe ha si bịa?
M wee sị ya: “Nna m ukwu, amaghị m. Gị onwe gị maara”! O wee sị m: “Ndị a bụ ndị siri n’oke mkpagbu ahụ pụta. Ha sakwara uwe-mwụda ha, mekwaa ka ha dị ọcha, n’ime ọbara Nwatụrụ ahụ.
N’ihi nke a ka ha ji kwesị ịnọdụ n’ihu oche-eze Chineke. Ha na-akpọrọ Chineke isi ala, ehihie na abalị n’ime Ụlọ Nsọ Ya. Onye ahụ Nke na-anọkwasị n’oche-eze ahụ, ga-eji aka Ya meere ha ndo.
Agụụ agaghị agụkwa ha ọzọ. Akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ ọzọ, Anyanwụ agaghị achakwa ha ọzọ; okpomọkụ ọ bụla agaghị erutekwa ebe ha ọzọ. N’ihi na Nwatụrụ ahụ, nke nọ n’etiti oche eze ahụ, ga-azụ ha dịka atụrụ. Ọ ga-eduru ha, gaa n’isi mmiri nke ndụ. Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha”.
MBEKU – Jọn 10:14
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị kwuru sị: Abụ M ezigbo Onye nche atụrụ. Amaara M atụrụ M. Atụrụ M makwaara M.
Aleluya!
OZIỌMA – 10:27-30
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Isi Okwu: “Ana M enye igwe atụrụ M ndụ ebighị ebi.’
Jesu kwuru sị: Atụrụ M na-anụ olu M. Mụ onwe M makwaara ha. Ha na-esokwa M. Mụ onwe M na-enyekwa ha ndụ ebighị ebi. Ha agaghị ala n’iyii ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi.
Ọ dịghịkwa onye ọ bụla ga-apụrụ ha n’aka M. Nna M, onye nyere M ha kachasị ihe niile. Ọ dịghịkwa onye ọ bụla pụrụ ịpụnara Nna M ihe n’aka. Mụ na Nna M bụ otu”.
Igbo Mass Readings for May 12 2025, Mọnde Izuụka nke Anọ n’oge Iista
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.