Igbo Mass Readings for January 28 2024, Ụka nke Anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 28 2024, Ụka nke Anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 18:15-20

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Diuterọnọmi

Isi Okwu: A ga m eme ka onye amụma bilite n’etiti ụnụ.

Mosis gwara ndị mmadụ ahụ sị: “Onyenweanyị Chineke ụnụ ga-eme ka onye amụma dị ka Mụ onwe M, bilite n’etiti ụnụ. Ọ bụ Ya ka ụnụ ga-egere ntị. Ọ bụ ihe a kpọm kwem ka ụnụ rịọrọ Onyenweanyị Chineke ụnụ na Họreb n’ụbọchị nzukọ ahụ, mgbe ụnụ sịrị: “Ka anyị gharakwa ịnụ olu Onyenweanyị Chineke anyị ọzọ.

Ka anyị gharakwa ịhụ nnukwu ọkụ a ọzọ. N’ihi na anyị nụ ya ọzọ ma ọ bụ hụ ya ọzọ, anyị ga-anwụ.” Onyenweanyị ewee gwa m; “Ha rịọtara ya. Aga M esi n’etiti ha kulitere ha onye amụma dị ka gị onwe gị.

Aga M etinye okwu M n’ọnụ Ya. Ọ ga-agwacha ha ihe niile M tiiri Ya n’iwu. E nwee onye ọ bụla jụrụ ige ntị n’okwu M ọ na-ekwu n’aha M, Ọ bụ Mụ onwe M ga-eme ka onye ahụ zaa M azịza ya.

Ma onye amụma ọ bụla ga-eji akara obi ya, zie ozi M na-ezighị n’aha M, ma ọ bụ kwuo okwu n’aha chi ọzọ, onye amụma ahụ ga-anwụ.”

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 94:1-2, 6-9 Az. 8

Azịza: Ụnụ nụ olu Ya taa, ụnụ agbachikwala obi ụnụ.

1. Bịanụ ka anyị kweere Onyenweanyị ukwe añụrị.

Ka anyị too Okwute nke Nzọpụta anyị.

Ka anyị nyenụ Ya ekele;

Ka anyị were obi añụrị bụọrọ Ya abụ ọma. Azịza.

2. Bịanụ ka anyị hulata sekpuoro Ya.

Ka anyị gbuo ikpere ala n’ihu Chi kere anyị.

N’ihi na ọ bụ Chineke anyị.

Anyị bụ ndị Ọ na-echekwa,

bụrụkwa igwe atụrụ nke Ọ na-edu. Azịza

3. Ewoo! a sị nnọọ ụnụ ga-anụ olu Ya taa!

Ụnụ akpọchikwala obi ụnụ dịka na Meriba;

dịka n’ụbọchị Masa n’ime ọzara.

Ebe nna ụnụ ha leghara M.

Ha bururị ụzọ hụ aka ọrụ M ma bịakwa ilegha M. Azịza

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 7:32-35

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt

Isi Okwu: Onye na-enweghị nwunye na-echegbu onwe ya karia maka ọrụ nke Onyenweanyị.

Ma ana m achọ ka ụnụ ghara ichegbu onwe ụnụ banyere ihe nke ụwa. Onye na-enweghị nwunye na-echegbu onwe ya karịa maka ọrụ nke Onyenweanyị, otu ọ ga-esi mee ihe ga-atọ Onyenweanyị ụtọ.

Ma onye nwere nwunye na-echegbu karị onwe ya maka ihe nke ụwa, otu ọ ga-esi mee ihe ga-atọ nwunye ya ụtọ. N’ihi nke a, mkpa ya kewara ụzọ abụọ.

Ma nwanyị na-enweghị di ma ọ bụ nwa-agbọghọ na-enweghị di na-echegbu karị onwe ya maka ọrụ nke Onyenweanyị; otu ọ ga-esi dị nsọ n’ime mmụọ na n’anụ ahụ.

Ma nwanyị nwere di na-echegbu karị onwe ya maka ihe nke ụwa; otu ọ ga esi mee ihe ga-atọ di ya ụtọ. Ana m ekwu nke a maka ọdịmma ụnụ. Ọ bụghị agbụ ka m na-eke ụnụ.

Kama ana m achọ ka ụnụ mee ihe dị mma na nke kwesịrị ekwesị, ka ụnụ wee nye onwe ụnụ n’ijere Onyenweanyị ozi, n’enweghị uche-mgbasasị.

MBEKU – Jọn 6: 63.68

Aleluya, Aleluya!

Onyenweanyị, okwu Gị bụ mmụọ na ndụ. Ọ bụ Gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi.

Aleluya!

OZIỌMA – 1:21-28

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Isi Okwu: Nwoke a nwere Ike Ikuzi nkuzi.

Jesu na ndị Ụmụazụ Ya wee bịaruo n’obodo Kapanọm. N’ụbọchị izuike sonụ, Jesu banyere n’ụlọ nzukọ ha, na-akuzi ihe. Ụzọ O si akuzi nkuzi wee tụ ndị niile nụrụ olu Ya n’anya; n’ihi na Ọ na-ezi ha ihe ka onye nwere ike; ọ bụghị dịka ndị Ode-akwụkwọ.

Mgbe Jesu kpụ okwu n’ọnụ, otu nwoke nwere mmụọ ọjọọ batara n’ụlọ nzukọ ahụ, wee tie mkpu, sị: “Jesu onye Nazaret, gịnị ka anyị na Gị nwekọrọ? Ị bịara n’ebe a ịla anyị n’iyii?

Ama m onye Ị bụ: Onye Nsọ nke Chineke.” Jesu wee gbọja ya, sị: “Kpuchie ọnụ gị, sikwa n’ime ya pụta!” Mmụọ ọjọọ ahụ wee setịa ya, tikwaa mkpu n’olu ike, wee si n’ime ya pụta.

Ọrụ ebube a wee ju mmadụ niile anya, nke mere na ha malitere ịjụrịta ibe ha, sị: “Gịnị bụ nke a? Ọ bụ ozizi ọhụrụ? Nwoke a nwere ike ọ bụla inye ndị mmụọ ọjọọ iwu, ha na-añakwa Ya ntị.” Ngwa ngwa, akụkọ banyere Ya wee gbasa n’ebe niile, n’ala niile dị Galili gburugburu.

Igbo Mass Readings for January 29 2024, Mọnde Izuụka nke Anọ N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for January 28 2024, Ụka nke Anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Last Update: July 3, 2023