Igbo Mass Readings for December 21 2025, Ụka nke Anọ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Mbụ

Nke a bụ Igbo Mass Readings for December 21 2025, Ụka nke Anọ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Mbụ.

https://youtu.be/uRVWP73DIT0

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:10-14

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya

Isi Okwu: “Nwagbọghọ ahụ dị ime.”

Onyenweanyị gwara Ahaz okwu ọzọ sị: “Rịọ Osebụrụwa Chineke ihe ịriịbaama maka onwe gị. I nwere ike ịrịọ ka ihe ahụ si n’ebe miri emi n’ala mmụọ bịara gị; ma ọ bụ n’ebe dị oke elu nke igwe.

Mana Ahaz zara ya sị: “Mba! Agaghị m anwa Onyenwe m ọnwụnwa.” Onyenweanyị asịkwa ya: ụlọ Devid, ngwa gee ntị ugbu a: “Ọ bụ na o zubeghịrị gị ịkpasu ndị mmadụ iwe?

O ruokwala nke ịkpasu Chineke m iwe? N’ihi ya, ugbu a, Onyenweanyị ga-eji aka Ya enye gị ihe ịrịbaama. Lee ihe ịrịbaama ahụ: Nwagbọghọ ahụ dị ime. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-amụkwa nwa nwoke. Aha a ga-akpọ Ya bụ Ịmmanuel, nke pụtara “Chineke nọnyeere anyị.”

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 23:1-6. Az. 7.10

Azịza: Ka Onyenweanyị bata. Ọ bụ eze nke otito.

1. Onyenweanyị nwe ụwa na ihe niile juru n’ime ya;

Ụwa na mmadụ niile bi n’ime ya.

Ọ bụ Ya guzowere ya n’elu osimiri.

O mere ka o guzosie ike n’elu mmiri. Azịza.

2. Onye ga-agbago n’ugwu nke Onyenweanyị?

Onye ga-eguzo n’ebe nsọ Ya?

Onye aka ya kwụ ọtọ, onye obi ya dị ọcha.

Onye anaghị achọ ihe na-abaghị uru. Azịza.

3. Ọ ga-anata ngọzi n’aka Onyenweanyị.

Natakwa ụgwọ n’aka Chineke onye nzọpụta ya.

Ọ bụ ụdị mmadụ ndị a na-achọ Ya.

Na-achọnụ ihu Chineke nke Jekọb. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:1-7

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Akwụkwọozi nke Pọl dị asọ degaara ndị Rom

Isi Okwu: Jesu Kristi bụ nwa Devid, bụrụkwa Nwa Chineke.

Pọl, odibo Kristi Jesu, onye Chineke kpọrọ ịbụ onye ozi, na onye O wepụtara iche ikwusa Oziọma, na-edetara ụnụ akwụkwọ ozi nke a. Chineke kwere nkwa na mgbe ochie izi anyị Ozi ọma nke a, site n’ọnụ ndị amụma Ya, dịka e dere n’Akwụkwọ Nsọ.

Ozi ọma nke a bụ maka Nwa Ya bụ Onyenweanyị Jesu Kristi. A bịa n’ịghọ mmadụ ọ ghọrọ, a mụrụ Ya n’agbụrụ Devid. A bịa n’ịbụ chi dị nsọ nke ọ bụ, Chineke jiri ike ukwu gosị na ọ bụ Nwa Ya, site n’ime ka O si n’ọnwụ bilie.

Site n’aka Ya, Chineke nyere m amara ịbụ onye ozi n’ihi Kristi, ka m wee mee ka mba niile kwere na Chineke, na-añakwa Ya ntị. Ụnụ ndị bi na Rom, ndị a kpọrọ ịbụ ndị nke Jesu Kristi, sokwa na ndị a niile m ga-eme ka ha kwere na Chineke, ñakwaa Ya ntị.

Ya mere, ana m edetara ụnụ niile ndị bi na Rom, akwụkwọ ozi, ụnụ bụ ndị Chineke hụrụ n’anya, na ndị Ọ kpọrọ ịbụ ndị nsọ. Amara dịrị ụnụ, ya na udo nke si n’aka Chineke Nna na nke Onyenweanyị Jesu Kristi.

MBEKU – Matiu 1:23

Aleluya, aleluya!

Nwagbọghọ ga-atụrụ ime n’amaghị nwoke, bịakwa mụta nwa nwoke. Aha a ga-akpọ ya bụ Ịmmanuel: ihe ọ pụtara bụ: Chineke nọnyeere anyị. 

Aleluya!

OZIỌMA – 1:18-25

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Marịa, onye Josef nwa Devid bịara ịlụrụ, bụ onye mụrụ Jesu.

Otu a ka e si mụọ Jesu Kristi: Mgbe ahụ ikwu na ibe ekwekọrịtala na Josef ga-alụ Marịa nne Jesu. Ma mgbe ha na-ebikọbeghị, a hụrụ na Marịa dị ime site n’ike nke Mmụọ Nsọ.

Ma ebe Josef di ya, bụ onye ezi omume, ọ chọghị ịkpọpụtara ya ọha, kama o zubere ịchụ ya na nzuzo. Ma mgbe ọ na-atụgharị ihe ndị a n’obi ya, mmụọ ozi nke Onyenweanyị gosịrị ya onwe ya na nrọ, sị: “Josef, nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Marịa nwunye gị n’ihi na Nwa ọ dị ime ya sitere n’ike nke Mmụọ Nsọ, Ọ ga-amụ nwa nwoke.

Ị ga-akpọkwa Ya Jesu, n’ihi na Ọ ga-azọpụta ndị nke Ya na mmehie ha niile.” Ihe ndị a niile mere ka e wee mezuo okwu nke Onyenweanyị siri n’ọnụ onye amụma kwuo, sị: “Lee. nwagbọghọ na-amaghị nwoke ga-adị ime, mụta nwa nwoke.

Aha a ga-akpọ Ya bụ Ịmmanuel,” nke isi ya bụ, “Chineke nọnyeere anyị.” Ya mere, mgbe Josef tetara n’ụra, o mere dịka mmụọ ozi nke Onyenweanyị gwara ya, wee kpọrọ Marịa nwunye ya. Ma ọ bakwughị ya ruo mgbe ọ mụchara nwa. Josef wee kpọọ aha ya Jesu.

Igbo Mass readings for December 22 2025,

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for December 21 2025, Ụka nke Anọ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Mbụ.