Igbo Mass Readings for December 24 2023, Ụka nke Anọ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Abụọ

Nke a bụ Igbo Mass Readings for December 24 2023, Ụka nke Anọ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:1-5, 8-11, 16

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Abụọ nke Samuel

Isi Okwu: Alaeze Devid ga-anọgide oge niile, n’enweghị nsogbu ọ bụla n’ihu Onyenweanyị.

Mgbe Eze Devid biiri n’obi ya, Onyenweanyị mere ka ume ruo ya ala, ka ndị iro gbara ya gburugburu gharakwa inye ya nsogbu ọ bụla. Mgbe ahụ ka ọ gwara onye amụma Netan sị: “Ị hụla, ebi m n’ụlọ Seda, ma igbe ọgbụgbandụ nke Onyenweanyị bi n’ime mkpukpu.”

Netan wee zaa eze sị: “Gaa mee uche gị, n’ihina Chineke nọnyeere gị.” N’abalị ahụ ka Chineke ziri Netan ozi sị ya: “Gaa gwa nwodibo M Devid sị: “Lee ihe Onyenweanyị kwuru: Ọ bụ gị ga-ewuru M ụlọ M ga-ebi na ya?”

“Ọ bụ M kpọpụtara gị n’ogige atụrụ, ebe ị na-azụ igwe atụrụ, ka ị bụrụ ọchịagha ndị nke M bụ Izrel. Anọnyeere M gị ebe ọ bụla ị gara. Ebibiela M ndị iro gị niile n’ihu gị.

Aga M eme ka aha gị daa ụda dịka nke ndị ukwu a ma ama n’elu ụwa. Aga M edokwara ndị nke M Izrel ebe ga-abụ nke ha. Aga M akụnye ha, ka ha wee biri n’ala ha, gharakwa inwe nsogbu ọ bụla.

Ndị ajọ mmadụ ga-akwụsị inye ha ụdị nsogbu ahụ ha na-enwe na mbụ, mgbe M họpụtaara ha ndị ikpe na-elekwa ha anya. Aga M eme ka i zuoro ndị iro gị niile ike.

Onyenweanyị na-egosịkwa gị na Ya ga-ehiwere gị ụlọ. Ụlọ gị na alaeze gị ga-adịgide n’ihu M ruo mgbe ebighị ebi. Oche eze gị ga-akwụrụ chị m ruo mgbe ebighị ebi.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 88:2-5, 27, 29 Az. 2

Azịza: Onyenweanyị aga m ekwe ukwe nke ịhụnanya Gị ruo mgbe ebighị ebi.

1. Onyenweanyị, aga m ekwe ukwe nke ịhụnanya Gị ruo mgbe ebighi ebi.

Na ndụdụgandụ niile, ọnụ m ga-ekwupụta eziokwu Gị.

O were m anya na ịhụnanya Gị na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi;

na ezi okwu Gị guzosiri ike dịka igwe. Azịza.

2. Mụ na Onye M họtara ahọta agbaala ndụ.

Añụụrụ M nwodibo M Devid iyi sị:

Aga M eme ka agbụrụ gị guzosie ike.

Aga M eguzowe oche eze gị ruo mgbe ebighị ebi. Azịza.

3. Ọ ga-asị M: “Ị bụ Nna m, Chineke m, Nkume m na Onye Nzọpụta m.

Aga M ahụ Ya n’anya mgbe niile.

Ọgbụgbandụ Mụ na ya ga-eguzosi ike.” Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 16:25-27

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl dị asọ degaara ndị Rom

Isi Okwu: Ihe omimi ahụ ezoro ezo kemgbe ụwa bidoro ka e mere ka ọ pụta ihe ugbu a.

Ka anyị nye Chineke otito! N’ihi na Ọ pụrụ ime ka ụnụ guzosie ike n’okwukwe dịka Oziọma Jesu Kristi nke m na-ekwusa si dị: na dịka ihe omimi ahụ e kpugherela anyị si dị, bụ nke e zoro ezo site n’ogologo mgbe ochie gara aga.

Ma ugbu a Chineke ekpugheela ya, O sitekwara n’ihe ndị amụma dere n’akwụkwọ mee ka mba niile mara Ya. Chineke ahụ dị ebighị ebi kpughere nke a dịka iwu Ya si dị, ka ụmụ mmadụ wee mụta irubere Chineke isi site n’okwukwe ha nwere na Kristi.

Ya mere, ka otito niile dịrị Chineke. Onye naanị Ya mazuru ihe niile, site na Jesu Kristi, ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.

MBEKU – Luk 1:38

Aleluya, aleluya!

Abụ m odibo nwanyị nke Osebụrụwa. Ka o reere m dịka i siri kwu.

Aleluya!

OZIỌMA – 1:26-38

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Isi Okwu: “Gee ntị, ị ga-atụrụ ime mụkwaa nwa nwoke.”

N’ọnwa nke isii, Chineke zigara mmụọ ozi Gebrel, ka o jee obodo ukwu dị n’ala Galili, a na-akpọ Nazaret. Ọ bụ ka o jekwuru nwagbọghọ na-amaghị nwoke, onye ikwu na ibe kwekọtarala na otu nwoke a na-akpọ Josef, nke si n’agbụrụ Eze Devid pụta, ga-alụ ya.

Aha nwagbọghọ ahụ bụ Marịa. Mmụọ ozi ahụ wee bịakwute Marịa, sị ya: ‘Ekele! I jupụtara n’amara! Onyenweanyị nọnyeere gị!” Ma ụdị ekele nke a gbara ya gharịị, nke na o bidoro na-ajụ onwe ya ihe ụdị ekele nke a pụtara.

Mmụọ ozi ahụ wee sị ya: “Marịa, a tụla egwu, n’ihi na ị natala amara n’aka Chineke. Lee, ị ga-adị ime, bịakwa mụta Nwa Nwoke. Aha ị ga-akpọ Ya bụ Jesu.

Ọ ga-abụ onye ukwu. A ga-akpọkwa Ya, Nwa nke Onye Kachasị Elu. Onyenweanyị Chineke ga-eme ka Ọ bụrụ eze dịka nna ya ochie, bụ Devid. Ọ ga-abụrụ agbụrụ Jekọb eze ruo mgbe ebighị ebi. Ọchịchị Ya agaghị enwe ọgwụgwụ.”

Marịa wee jụọ mmụọ ozi ahụ, sị: “Olee otu ihe a ga-esi eme, ebe m bụ Nwagbọghọ na-amaghị nwoke”? Ma, mmụọ ozi ahụ zara ya sị: “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasị gị, ike Onye Kachasị Elu ga-ekpuchikwa gị.

N’ihi nke a, aga-akpọ Nwa ahụ ị ga-amụ: Onye Nsọ na Nwa Chineke. Lee, nwanne gị bụ Elizabet dị ime nwa nwoke n’agadi ya. Onye ahụ ndị mmadụ na-akpọ nwanyị aga, dị ime ọnwa isii n’ihi na ọ dịghị ihe karịrị Chineke n’omume.”

Marịa wee sị ya: “Lee, abụ m odibo nwanyị nke Osebụrụwa. Ya reere m ka i si kwuo.” Mmụọ ozi ahụ wee pụọ n’ebe ọ nọ.

Igbo Mass Readings for December 25 2022, Ụka Ncheta Ọmụmụ Jesu Kristi – Ụka Ụzọ Ụtụtụ / Igbo Mass Readings for December 25 2022, Ụka Ncheta Ọmụmụ Jesu Kristi – Ụka Ụtụtụ