Igbo Mass Readings for March 19 2023, Ụka nke Anọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Mbụ
Nke a bụ Igbo Mass Readings for March 19 2023, Ụka nke Anọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Mbụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 16:1.6-7.10-13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mbụ nke Samuel
Isi Okwu: E chiri Devid Eze nke Izrel.
Onyenweanyị gwara Samuel sị: Ngwa, gbajuo mmanụ na mpi gị, gawa. Ana M eziga gị n’ụlọ Jese, onye Betlehem, maka na ejila M aka M họrọ onye eze n’ime ụmụ ya nwoke.
Mgbe Samuel garuru, o lepụrụ anya hụ Eliab wee chee n’obi ya sị: “N’ezie, onye a guzo ebe a bụ onye ahụ Onyenweanyị họọrọ.” Ma Onyenweanyị gwara Samuel sị: “E lekwala anya na mma, ma ọ bụ n’ogologo ya, n’ihi na ajụla M ya.
Anya Chineke ji ahụ ụzọ abụghị anya mmadụ ji ahụ ụzọ. Mmadụ na-ahụ sọ ihe dị n’ihu. Ma Chineke na-ahụ nke dị n’ime obi.” Jese gosịrị Samuel ụmụ ya nwoke asaa, ma Samuel sị Jese: “Onyenweanyị ahọrọghị nke ọ bụla n’ime ndị a.”
Mgbe ahụ ka ọ jụrụ Jese sị: “Ndị a, ọ gwụchaala ụmụ nwoke i nwere?” Ọ zara ya sị: “E nwekwara otu fọdụrụnụ; nke ọdụdụ nwa m. Ọ nọ ebe ọ na-elekọta ụmụ atụrụ m.” Samuel wee gwa Jese: “Zie ozi ka a kpọta ya.
Anyị agaghị anọdụ ala iri ihe ọbụla wee ruo mgbe ọ bịara.” Jese ziri ozi ka akpọta ya. Ọ bụ nwata nwokorobịa, ahụ na-akwọ mụrụmụrụ: anya ya mara ezigbo mma.
Usoro o ji aga ije na ụdị agwa ọ na-akpa dị ụtọ. Onyenweanyị ekwuo sị: “Bịa tee ya mmanụ n’ihi na ọ bụ onye nke a.” Mgbe ahụ ka Samuel ji buru mpi mmanụ ahụ tee ya, ebe ahụ ya na ụmụnne ya guzoro. Mmụọ nke Onyenweanyị wee jide Devid, bịakwa biri n’ime ya, site n’ụbọchị ahụ gawa.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 22, Az. 1
Azịza: Dinwenụ bụ Onye nche m. Onwekwaghị ihe m ga-achọ.
1. Dinwenụ bụ Onye nche m. Onwekwaghị ihe m ga-achọ.
Ebe ahịhịa ndụ juru eju ka Ọ na-enye mezumike.
Ọ na-eduga m n’agịga mmiri doro edo,
iji gbaa mmụọ m na-ada mba ume. Azịza.
2. Ọ na-edu m n’ụzọ ziri ezi. Ọ dị ka ihe Ọ zara n’aha.
Ọ bụrụgodụ na m na-aga na ndagwurugwu ọchịchịrị,
egwu ọ bụla agaghị atụ m.
I ji mkpara na ngu Gị nọnyere m n’ebe ahụ.
Ọ bụ ihe ndị a na-akasi m obi. Azịza
3. I ji aka Gị kwadoro m nnukwu oriri,
nke m ga-eri n’ihu ndị iro m.
I ji aka Gị tee m mmanụ n’isi.
Iko m juru n’ọnụ. Azịza
4. N’ezi okwu, sọ ihe ọma na obiọma ga na-eso m,
ụbọchị ndụ m niile.
Aga m ebi n’ụlọ nke Onyenweanyị ebighị ebi. Azịza
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:8-14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl dị asọ degaara ndị Efesọs
Isi Okwu: Si n’ọnwụ bilite, ka Kristi chakwasa gị.
Na mgbe mbụ ụnụ nọ n’ọchịchịrị. Ma ugbu a ụnụ nọ n’ime Onyenweanyị, ụnụ nọ n’ihe. Ya mere, na-adịnụ ndụ ka ndị nọ n’ihè. N’ihi na ihè na-ewepụta ịdị mma niile na ezi omume niile na ezi okwu niile dị ka mkpụrụ. Jisienụ ike mụta ime ihe na-atọ Onyenweanyị ụtọ.
Ụnụ esola ndị ọzọ n’ọrụ na-abaghị uru nke ha na-arụ n’ọchịchịrị. Kama gbaanụ mmehie ha ọtọ. N’ihi na ihe ha na-eme na nzuzo na-eme ihere, ọ bụladị ikwute ya na ntị.
Ma mgbe a gbara mmehie ha niile ọtọ, wepụta ha n’ihe, mgbe ahụ mmadụ niile ga-ahụcha nke ọma, ụdị ndụ ha na-ebi. N’ihi na ihe ọ bụla e mere ka ọ pụta ihe nke ọma bụ ezi ihe. N’ihi nke a ka o kwuru sị: “Teta, gị onye na-arahụ ụra! Si na ndị nwụrụ anwụ bilie! Kristi ga-amụkesịkwa gị.”
MBEKU – Jọn. 8:12
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Onyenweanyị kwuru sị: Abụ m ihe nke ụwa. Onye ọ bụla na-eso M ga-enwe ihe nke ndụ.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 9:1-41
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Isi Okwu: Ọ pụrụ saa ahụ, wee lọghachi hụwa ụzọ.
Mgbe Jesu na-agafe, Ọ hụrụ otu nwoke kpuru isi site n’oge a mụrụ ya. (Ụmụazụ Ya wee jụọ Ya, sị: “Onye nkuzi, olee onye njọ ya mere e ji mụọ nwoke a n’isi?
Ọ bụ njọ nwoke a, ka ọ bụ nke ndị mụrụ ya?” Jesu wee zaa, sị ha: “Ọ bụghị njọ nwoke a metara; nke ọ na-abụ njọ nne na nna ya metara! Kama o kpuru isi ka e wee mee ka ọrụ Chineke pụta ihe n’ahụ ya.
Aga M arụrịrị ọrụ nke Onye ahụ zitere M mgbe chi na-ejibeghị. N’ihi na abalị na-abịa mgbe mmadụ ọ bụla na-apụghị ịrụ ọrụ. N’oge a, M ka nọ n’ụwa, abụ M ihe nke ụwa.”)
Mgbe Jesu kwusiri nke a, Ọ bụsara ọnụ mmiri n’ala, gwakọta ọnụ mmiri na aja, werekwa aja ahụ a gwọrọ agwọ tee nwoke ahụ n’anya, wee sị ya: “Jee saa ahụ n’ọdọ mmiri Siloam” (nke bụ ma a sụgharịa ya, Onye e zitere ezite).
Nwoke ahụ wee jee, saa ahụ ya, bịa na-ahụ ụzọ ọzọ. Ya mere, ndị agbata obi ya na ndị na-ahụ ya na mbụ ka ọ na-arịọ arịrịọ bịara na-ajụ, sị: “Onye a, ọ bụghị onye ahụ na-anọdụ ala n’oge gara aga na-arịọ arịrịọ?”
Ụfọdụ kwuru sị: “Ọ bụ ya.” Ndị ọzọ ekwuo sị: “Mba! kama o yiri ya.” Ma ya onwe ya sịrị: “Mụ onwe m bụ ya.” Ha wee jụọ ya sị: “Olee otu e si meghee anya gị?”
O wee gwa ha sị: “Nwoke ahụ a na-akpọ Jesu gwọrọ ụrọ, tee m n’anya sị m: Jee saa ahụ gị na Siloam. M wee jee saa ahụ, m, wee hụ ụzọ.” Ha wee sị ya: “Olee ebe onye ahụ nọ?”
O wee sị: “Amaghị m.” Ha wee kpụgara ndị Farisii onye ahụ kpuru isi site na mgbe a mụrụ ya. (Chetakwa na ọ bụ n’ụbọchị izuike ka Jesu gwọrọ aja n’ala wee meghee anya ya).
Ndị Farisii n’onwe ha bịara chọwa ntọala ihe nyeghachiri nwoke ahụ ike ịhụ ụzọ ọzọ. Ọ gwara ha sị: “Ọ gwọrọ ụrọ tee m n’anya: M gaa sachapụ ya, wee hụwa ụzọ.”
Ihe a mere ụfọdụ ndị Farisii ji kwusiwe ike sị: “Nwoke a enweghị ike isi n’aka Chineke, n’ihi na Ọ na-emerụ ụbọchị izuike.” Ma ndị ọzọ bidoro ịrụ ụka sị: “A sị na nwoke a bụ onye njọ, kedụ ka O si nwee ike ime ihe ịrịbaama dị otu a?
Ihe a mere ka ha kewaa ụzọ abụọ. Ha wee jụọ nwoke ahụ kpuburu isi na mbụ sị: “Ebe ọ bụ na O meghere anya gị, kedụ ihe i nwere ikwu maka Ya?” Ọ zara sị: “Ọ bụ onye amụma.”
(Ndị Juu jụrụ ikwere na o kpuburu isi mgbe a mụrụ ya, bịakwa hụwa ụzọ ọzọ, wee ruo mgbe ha jụrụ nne na nna ya sị: “Onye a, ọ bụ nwa ụnụ nwoke?
A sị na onye a bụ nwa ụnụ nwoke, kọwaanụ ma ọ bụ ezie na o kpuru isi mgbe a mụrụ ya? Ụnụ nwere ike ịkọwa ihe kpatara o ji ahụ ụzọ ugbu a? Nne na nna ya zara ha: “Anyị ma na onye a bụ nwa anyị nwoke.
Anyị makwa na o kpuru isi mgbe a mụrụ ya. Ma nke anyị na-amaghị bụzi ka o si ahụ ụzọ ugbu a, ma ọ bụ onye meghere anya ya. Jụọnụ ya! O toruole n’ịzara onwe ya nke ahụ.”
Nne na nna ya nyere ha ụdị azịza a, n’ihi egwu ndị Juu; ebe ọ bụ na ndị Juu ekpebielarị na onye ọ bụla kwupụtara na Jesu bụ E Chiri Echi ahụ, a ga-achụpụ ya n’ụlọ ekpere ha.
Ọ bụ n’ihi ya ka ha jiri kwuo sị: “O toruole n’ịzara onwe ya nke ahụ.” Ọzọkwa, ndị Juu kpọlitekwara nwoke ahụ kpuru isi mgbe a mụrụ ya sị ya: “Kelewe Chineke! Nke mbụ, anyị ma na Nwoke ahụ bụ onye njọ.”
Ma ọ zara ha: “A sị na Ọ bụ onye njọ, nke ahụ bụ nke m na-amaghị. Ma nke m ma bụ na ekpuru m isi na mbụ, ma ugbu a ana m ahụ ụzọ.” Ha jụrụ ya ọzọ sị: “Gịnị ka O mere gị?
Kedụ ka O si meghee anya gị? Ọ zara ha sị: “Ọ bụkwa na ekwuola m ya mbụ, ma ụnụ añaghị m ntị. Gịnị kpatara ụnụ ji chọọ ka m kọọrọ ya ụnụ ọzọ? Ụnụ agwakwala m na ụnụ chọkwara ịbụ ndị na-eso ụzọ Ya?
Ha bigbọrọ ya sị: “Ọ bụkwa gị bụ onye na-eso ụzọ Nwoke ahụ! Anyị na-eso ụzọ Mosis. Anyị ma na Chineke gwara Mosis okwu, ma anyị amaghị ebe Nwoke ahụ si bịa.”
Ma ọ zaghachiri ha: “Ọ bụ akụkọ ifo ka ụnụ na-akọ. Ụnu amaghị ebe O si bịa, ma ọ bụ Ya meghere anya m. Anyị ma na Chineke anaghị anụ olu onye njọ. Mana Ọ na-ege ntị mgbe onye ezi omume na-asọpụrụ Ya na-akpọku Ya.
A nụbeghị ya mbụ, na onye kpuru isi mgbe a mụrụ ya mechara hụwa ụzọ ọzọ. A sị na Nwoke a esighị n’aka Chineke, kedụ ka O si nwee ike ime ihe dị otu a?”)
Ha gbọjara ya sị: “Ta! Ị hụkwara nwa onye a njọ zuru ahụ site n’afọ nne! Ọ bụ okwuchukwu gịnị ka ị na-ekwuru anyị?” Ha wee buru ya, bupụ n’ezi. Mgbe Jesu nụrụ na a chụọla ya.
Ọ chọgidere ya chọta ya, wee jụọ ya: “I kwere na Nwa nke Mmadụ?” O wee zaa Ya: “Nna m ukwu, onye ka Ọ bụ ka m wee kwere na Ya? Jesu zara ya: “Ọ bụ Onye a, na-agwa gị okwu na Onye a, ị na-ele anya.”
Ọ sịrị Ya: “Onyenwe m, ekwere m ekwe.” Ọ bịa gbuoro Jesu isi ala na ikpere ala, wee fee ya. (Jesu wee sị:) “Abịara M n’ime ụwa a iji kewaa ya ka ndị kpuru isi hụwa ụzọ; ka ndị na-ahụ ụzọ kpuo isi.”
Ụfọdụ ndị Farisii nọ n’ebe ahụ jidere aka n’okwu Ya wee sị: “Anyị ji aka na Ị naghị agụnye anyị na ndị kpuru isi?” Jesu zara ha: “A sị na ụnụ kpuru isi, nke ahụ agaghị abụrụ ụnụ njọ. Mana ụnụ na-ekwu sị: “Anyị na-ahụ ụzọ” ma njọ nọ ụnụ n’isi)”.
Igbo Mass Readings for March 20 2023, Nnukwu Emume Ncheta Joseph dị Asọ
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.