Igbo Mass Readings for March 30 2025, Ụka nke Anọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Atọ

Nke a bụ Igbo Mass Readings for March 30 2025, Ụka nke Anọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Atọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:9-12

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Joshua

Isi Okwu: Ndị nke Chineke mere emume Ngabiga iji cheta Mbata ha n’ala e kwere na nkwa.

Dinwenụ gwara Joshua sị: “Taa ka m si n’ebe ụnụ nọ wepụchaa ihe ihere nke ljipt.” “Ụmụ Izrel manyere ụlọ-ikwuu ha na Gilgal. N’ụbọchị iri na anọ n’ọnwa ahụ, n’anyasị ya, ụmụ Izrel mere emume Ngabiga na mbara ala Jeriko.

N’ụbọchị na-eso emume Ngabiga, ha wee rie nri si n’ala ahụ, bụ achịcha na-ekoghị eko na ọka a rụrụ n’ọkụ n’otu ụbọchị ahụ. Site n’ụbọchị ahụ ha riri ihe si n’obodo ahụ, nri ahụ a na-akpọ Mana akwụsị ịda. Ebe ụmụ Izrel anaghịkwa enweta Mana ọzọ, nri ha na-eri bido n’afọ ahụ gawa n’ihu bụ nri ala Kena mepụtara.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 33:2-7 Az. 9

Azịza: Detụ ọnụ ka ị hụ na Dinwenụ dị ụtọ.

1. Aga m agọzi Dinwenụ mgbe niile.

Otito Ya ga-adị n’ọnụ m mgbe niile;

Mkpụrụobi m ga-eji Dinwenụ na-etu ọnụ.

Ndị umeala ga-anụ ya wee ñụrịa.

Azịza: Detụ ọnụ ka ị hụ na Dinwenụ dị ụtọ.

2. Soro m too Dinwenụ.

Ka anyị jikọọ ọnụ too aha Ya.

Achọwara m Dinwenụ O wee za m oku;

bịakwa zọpụta m n’egwu m niile.

Azịza: Detụ ọnụ ka ị hụ na Dinwenụ dị ụtọ.

3. Lee anya ebe Ọ nọ, ka ọnụ ọchị waa gị.

Ka ihere ghara ikpuchi gị ihu.

Ogbenye nke a kpọkuru Ya:

Dinwenụ anụrụ olu ya;

wee zọpụta ya na nsogbu ya niile.

Azịza: Detụ ọnụ ka ị hụ na Dinwenụ dị ụtọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:17-21

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ nke Abụọ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt

Isi Okwu: Chineke mere ka anyị na ya dị na mma site na Kristi.

Ọ bụrụ na onye ọ bụla ebiri n’ime Kristi, ọ ghọọla ihe e kere ọhụrụ. Ihe e kere ochie agafeela. Ọ bụzi ihe e kere ọhụrụ nọchiri ya! Ihe niile a bụ aka ọrụ Chineke.

Ọ bụ Chineke mere ka anyị na Ya dị na mma site na Kristi. Ọ bụkwa Chineke tinyere n’aka anyị, ọrụ ime ka adịmnamma nke a na-erute ndị mmadụ. Isi ya bụ na Chineke nọ n’ime Kristi na-eme ka Ya na ụwa dị na mma; n’anaghị ndị mmadụ ụgwọ njọ ha.

Ọ bụkwanụ anyị ka e bunyere ozi ịkọrọ ndị mmadụ na ha na Chineke adịla na mma. Ọ pụtara na anyị bụ ndị nọchitere anya Kristi; ka a ga-asị na Chineke n’onwe Ya si n’ọnụ anyị na-akpọ oku, na-arịọ ụmụ mmadụ sị: “Ka ụnụ na Chineke kpezie, dị n’udo.”

Ọ bụ n’ihi anyị ka Chineke jiri mee Onye Ahụ na-enweghị njọ ọ bụla ka Ọ ghọọ njọ, ka anyị wee bụrụ ịdịmma nke Chineke n’ime Kristi.

MBEKU – Luk 15:18

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

A ga m ahapụ ebe a gakwuru nna m gwa ya sị: “Nna, emejọọla m eluigwe na gị.”

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

OZIỌMA – 15:1-3, 11-32

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Isi Okwu: “Nwanne gị nwoke nwụburu anwụ ma bịa dịkwa ndụ ọzọ.”

Ndị ọnaụtụ na ndị mmehie bịakwutere Jesu ka ha wee nụrụ okwuchukwu. Ndị Farisii na ndị Odeakwụkwọ wee malite ntamu sị: “Nwoke a na-anabata ndị mmehie nke ọma, sorokwa ha na-eri, na-añụ.”

N’ihi ya, Jesu wee tụọrọ ha ilu sị: “Otu nwoke nwere ụmụ nwoke abụọ. Nke nta n’ime ha sịrị nna ya: “Nna m, kee ihe gị niile, bunye m nke ruuru m.’ Nna ha wee kewaara ha akụ na ụba dị n’obi ya.

Mgbe ụbọchị olemole gasịrị, nwa ya nwoke nke nta ahụ wee kwakọrọ ngwongwo ya gawa n’ala ọzọ, ebe ọ nọrọ rifuchaa akụ na ụba ya niile site n’ibi ndụ aghara na ịla ihe n’iyii.

Mgbe o mefusịrị ihe niile o nwere, oke ụnwụ siri ike dara n’ala ahụ. Mgbe ọ malitere ịnọ n’ụkọ, ọ bụna nke nri ọnụ, ọ gbakwuuru otu onye ebe ahụ nara ya ọrụ ịbụ onye e goro ego na-azụ ezi nọ n’ubi.

Ọ na-adị ya ka ya were mgbụgbọ ahụ ezi na-ata, wee rijuo afọ. Ma ọ dịghị onye ọ bụla na enye ya ihe ọ bụla ka o rie. Ma mgbe ọ matara onwe ya, ọ jụrụ onwe ya sị: ‘Ọ dị ụmụ odibo ole e goro ego nọ n’obi nna m, na-eme erimeri ka o siri masị ha?

Gịnị mere m ji nọdụ n’ebe a, na-anwụ n’agụụ? Mba! Aga m ahapụ ebe a lakwuru nna m, sị ya: Nna m, biko, emehiela m mejọọ eluigwe, mejọọkwa gị. Ekwesịghị m ka a kpọkwa m nwa gị ọzọ.

Mee m ka abụ m otu n’ime ụmụ odibo i goro ego.” O wee bilie lakwuru nna ya. Ma mgbe ọ ka nọ n’ebe dị anya, nna ya letịrị anya hụ ya, wee meere ya ebere.

Nna ya gbaara ọsọ, wee makụọ ya, bịakwa were ịhụnanya susuo ya ọnụ. Ma nwa ahụ sịrị nna ya: ‘Nna m, emeela m njọ mejọọ eluigwe, mejọọkwuo gị. Ekwesịghị m ka a kpọkwa m nwa gị ọzọ.’

Ma nna ya gwara ụmụ odibo ya: “Meenụ ngwa ngwa. Chịpụta uwe mwụda kachasị mma, yikwasị ya! Gbanyekwa ya mgba-aka n’aka, na akpụkpọ ụkwụ n’ụkwụ!

Sepụtanụ ehi ahụ gbara abụba, gbuonụ ya, ka anyị kpọọnụ oriri, ñụrịkwa ọñụ. N’ihi na nwa m a, nwụburu anwụ, ma bịakwa teta na ndụ ọzọ. O fuburu efu, ma a chọta ya. Ha bidoro oriri na ọñụñụ.

Ma nwa ya nke diọkpara si n’ubi na-alọta. Mgbe o rutere ụlọ nso, wee nụ ụda egwu, hụkwa ndị na-agba egwu, ọ kpọrọ otu nwodibo wee jụọ ya ihe merenụ. Nwodibo ahụ wee sị ya: “Nwanne gị lọtara.

Nna gị wee gbuo nwa ehi ahụ gbara abụba, n’ihi na ọ lọtara n’udo, na ahụ ike.’ Ma o jiri iwe jụ ịbanye n’oriri ahụ. Ma nna ya pụtara rịọwa ya ka ọ bata n’ụlọ.

Ma ọ sịrị nna ya. “Lee afọ ole m taara gị ahụhụ! O nwebeghị mgbe ọ bụla m nupụrụ gị isi. Ma i wepụtabeghị otu nwamkpị nye m ka m na ndị enyi m wee kpọọ oriri.

Ma mgbe nwa gị nke a, ya na ụmụ nwanyị akwụna ripịasịrị ihe niile i ji biri, lọtara, i wee gbuoro ya nwa ehi ahụ gbara abụba?” Nna ya wee sị ya: “Nwa m, mụ na gị nọ mgbe niile.

Ihe niile m nwere bụ nke gị. O kwesịrị ekwesị ka anyị rie, ka obi tọọ anyị ụtọ, ka anyị ñụrịkwa ọñụ, n’ihi na nwanne gị nke a nwụburu anwụ, bịakwa dị ndụ ọzọ. O fuburu efu, e wee chọta ya.

Igbo Mass Readings for March 31 2025, Mọnde Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi

Igbo Mass Readings for March 30 2025, Ụka nke Anọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Atọ.