Igbo Mass Readings for May 21 2023, Ụka Nke Asaa N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 21 2023, Ụka Nke Asaa N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:12-14

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi

Isi Okwu: Ha niile ji otu obi nọgidesi ike n’ekpere

Mgbe ahụ Ụmụazụ iri na otu ahụ siri n’ugwu a na-akpọ Olivet, nke dị Jerusalem nso, ije nke otu ụbọchị izuike, laghachi na Jerusalem. Mgbe ha batara n’obodo, ha wee rịgoo n’ime ụlọ ahụ dị n’ụlọ elu, ebe ha na-anọ.

Ụmụazụ ndị a bụ: Pita na Jọn, Jemis na Andru, Filip na Tọmọs, Batalomi na Matiu, Jemis nwa Alfiọs, na Saịmọn onye Zilọt, na Judas nwa Jemis. Ndị a niile ji otu obi nọgidesi ike n’ekpere, ha na ndị inyom ụfọdụ, na Meri nne Jesu na ndị ikwu na ibe Ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 26:1-4, 7-8 Az. 13

Azịza: Ekwere m na aga m ahụ ihe ọma nke Onyenweanyị n’ala ndị dị ndụ.

Ma ọ bụ Aleluya

1. Onyenweanyị bụ ihe na nzọpụta m.

Onye ka m ga-atụ egwu?

N’Onyenweanyị ka m na-agbaga ọsọ ndụ.

Kedụ onye m ga-asọ anya? Azịza.

2. Sọ otu ihe ka m na-arịọ Onyenweanyị.

Sọ ihe a ka m na-achọ.

Ka m biri n’ụlọ Onyenweanyị ụbọchị ndụ m niile;

ka m mara ịdịmma nke Onyenweanyị;

bịakwa hụ Ụlọ Nsọ Ya. Azịza.

3. Onyenweanyị, nụrụ ụda olu m na-akpọ Gị.

Meere m amara za m oku.

Obi m na-ekwu maka Gị.

Eji m anya na-achọ Gị. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:13-16

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pita dị asọ dere

Isi Okwu: Ngọzi dịrị ụnụ ma ọ bụrụ na a na-ata ụnụ ụta n’ihi Kristi.

Kama ñụrịanụ ọñụ na ụnụ so keta oke n’ahụhụ Kristi, ka ụnụ wee jupụta n’ọñụ mgbe a ga-ekpughe ebube Kristi. Ngọzi dịrị ụnụ, ma ọ bụrụ na a na-ata ụnụ ụta n’ihi Kristi.

N’ihi na nke a na-egosi na Mmụọ nke ebube ahụ, bụ Mmụọ nke Chineke, na-anọgide n’ime ụnụ. Ụnụ ekwela ka a taa onye ọ bụla n’ime ụnụ ahụhụ dịka ogbu mmadụ, ma ọ bụ onye ohi, ma ọ bụ onye omenjọ, ma ọ bụ dịka onye na-etinye aka n’ihe na-agbasaghị ya.

Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime ụnụ na-ahụ ahụhụ n’ihi na ọ bụ onye otu Kristi, ka ihere ghara ime ya. Kama ya nye Chineke otito na a kpọrọ ya onye otu Kristi.

MBEKU – Jọn 14:18

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị kwuru sị: Agaghị M ahapụ ụnụ n’ọnọdụ enwe nne enwe nna. Aga M alọghachikwute ụnụ. Mgbe ahụ, obi ụnụ ga-añụrị ọñụ.

Aleluya!

OZIỌMA – 17:1-11

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Isi Okwu: Nna nye nwa Gị otito.

Mgbe Jesu kwusịrị ihe ndị a, O leriri anya n’eluigwe, sị: “Nna, oge eruola. Nye Nwa Gị otito, ka Nwa Gị wee nye Gị otito. N’ihi na I nyere ya ike n’ebe mmadụ niile nọ, ka O wee nye ndị niile I tinyere Ya n’aka ndụ ebighị ebi.

Nna! nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ: Ka ha wee mara Gị, Onye naanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye ahụ I zitere, bụ Jesu Kristi. Enyere M Gị otito n’elu ụwa.

Arụzuola m ọrụ ahụ I nyere M ka M rụọ. Ma ugbu a, Nna, nye M otito n’ihu Gị! Nye M ụdị otito ahụ M nwere n’ebe Ị nọ tupu e kee ụwa. “Emeela M ka mmadụ ndị I siri n’ụwa kpọnye M mara onye Ị bụ.

Ha bụ ndị nke Gị, I wee were ha nye M. Ha debere okwu Gị. Ugbu a, ha amarala na ihe niile I nyere M si n’aka Gị bịa. Eziela M ha ozi niile I ziri M zie ha.

Ha onwe ha wee nara ozi ahụ, marakwa n’eziokwu na esi M n’ebe Ị nọ bịa, kwerekwa na Gị zitere M. “Ana M ekpere ha ekpere. Ọ bụghị ụwa ka M na-ekpere ekpere.

Kama ana M ekpe ekpere maka ndị a I nyere M, n’ihi na ha bụ ndị nke Gị. Ihe niile M nwe bụ nke Gị; ihe niile I nwe bụkwa nke M. A na-enyekwa M otito site na ha.

Ugbu a ana M alaghachikwute Gị. Anọghịkwa M n’ụwa ọzọ. Ma ha onwe ha ka nọ n’ụwa. Nna dị nsọ! Debe ha nke ọma site n’ike nke aha Gị, bụ ndị ahụ nke I nyere M; ka ha wee bụrụ otu dịka Anyị onwe Anyị si bụrụ otu.

Igbo Mass Readings for May 22 2023, Mọnde Izuụka nke asaa n’oge Iista

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for May 21 2023, Ụka Nke Asaa N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Mbụ.