Connect with us

Igbo Mass Readings

Igbo Mass Readings for June 1 2025, Ụka Nke Asaa N’oge Iista

Published

on

Igbo Mass Readings for June 1 2025, Ụka Nke Asaa N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Atọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 1 2025, Ụka Nke Asaa N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Atọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:55-60

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi

Isi Okwu: A na m ahụ Nwa nke Mmadụ ka O guzo n’aka nri nke Chineke.

Ma ebe Stiven jupụtara n’ike Mmụọ Nsọ, o wee legide anya n’eluigwe, hụ ebube Chineke, hụkwa Jesu ka O guzoro n’aka nri nke ike Chineke. O wee sị ha: “Lee! Ana m ahụ eluigwe ka e meghere ya, na-ahụkwa Nwa nke Mmadụ ka O guzo n’aka nri nke ike Chineke!”

Advertisement

Ma ha weere oke olu tie mkpu, kwuchie aka na ntị, were ọsọ nukwasi ya. Ndị akaebe ụgha, ndị gburu Stiven, wee wụsa uwe ha n’ụkwụ otu nwokorobịa a na-akpọ Sọl ka o legide ha anya.

Ha nọ na-atụ Stiven nkume ka ọ na-akpọku Onyenweanyị, sị: “Onyenweanyị Jesu nara mmụọ m nke ọma!” O wee gbuo ikpere n’ala, werekwa oke olu tie mkpu, sị: “Onyenweanyị! A tụkwasịla mmehie nke a n’isi ha! Mgbe o kwusịrị nke a, o wee daa n’ụra ọnwụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 96:1-2, 6-7, 9 Az. 1.9

Azịza: Onyenweanyị bụ eze kacha eze n’ụwa niile.

Ma ọ bụ Aleluya

Advertisement

1. Onyenweanyị bụ eze. Ka ụwa ñụrịa ọñụ.

Ka ndị niile bi obodo niile osimiri gbara gburugburu ñụrịakwa ọñụ.

Ikpe ziri ezi na ezi omume bụ ntọala nke oche eze Ya. Azịza.

2. Mbara igwe na-ekwupụta ikpe nkwụmọtọ Ya.

Advertisement

Mmadụ niile na-ahụ ebube Ya.

Ụnụ ndị mmụọ sekpuerenụ ya. Azịza.

3. Onyenweanyị! Ị bụ onye kacha elu n’elu ụwa niile.

Ọ bụkwa gị kachasị chi niile ndị ọzọ elu. Azịza.

Advertisement

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 22:12-14, 16-17, 20

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mkpughe

Isi Okwu: Bịa, Onyenweanyị Jesu!

Mụ onwe m bụ Jọn nụrụ olu n’agwa m okwu sị: “Lee, ana M a bịa ọsọsọ. Ụgwọ ọrụ M dịkwa n’aka M. Aga M eji ya a bịa, ịkwụghachi onye ọ bụla dịka ọrụ ya si dị.

Mụ onwe M bụ Alfa na Omega, onye mbụ na onye ikpeazụ, Mmalite na Ọgwụgwụ”. Ngọzị na-adịrị ndị na-asachapụ uwe mwụda ha nke ọma. N’ihi na Chineke ga-enye ha ike iri mkpụrụ sitere n’osisi nke ndụ ahụ.

Advertisement

Ọ ga-enyekwa ha ike ịbanye n’ime obodo ahụ site n’ọnụ ụzọ ama ya niile. “Mụ onwe M, bụ Jesu ziteere gị mmụọ ozi M, ka o kpugheere gị ihe ndị a niile, nke ị ga-ezi Nzukọ niile.

Mụ onwe M bụ Mgbọrọgwụ Devid, bụrụkwa Nwa si n’agbụrụ Devid pụta. Mụ onwe M bụkwa Kpakpando Ụtụtụ ahụ nke na-enwu oke ọnwụnwụ.” Mmụọ Nsọ na Nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ, na-ekwu, sị: “Bịa” Onye ọ bụla nụrụ oku a, ya kwukwaa sị: “Bịa” Onye ọ bụla akpịrị na-akpọ nkụ, ya bịa! Onye ọ bụla ọ na-agụ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ ñụọ n’akwụghị ụgwọ ọ bụla! Onye Ahụ nke na-agba ama banyere ihe ndị a niile na-ekwu, sị: “E, a na M abịa ọsọsọ!” Amen! Bịa, Onyenweanyị Jesu!

MBEKU – Jọn 14:18

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị kwuru sị: Agaghị M ahapụ ụnụ dịka nwa enwe nne na nna. Aga M alọghachikwute ụnụ. Mgbe ahụ, obi ụnụ ga-añụrị ọñụ.

Advertisement

Aleluya!

OZIỌMA – 17:20-26

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Isi Okwu: Ka ha bụrụ otu dịka anyị onwe anyị.

Jesu leliri anya n’eluigwe wee sị: “Ọ bụghị naanị ha ka M na-ekpere ekpere. Kama, ana M ekpekwa ekpere maka ndị sitere n’okwu ha wee kwere na M. Ana M ekpekwa ekpere ka ha niile wee bụrụ otu.

Advertisement

Nna! mee ka ha dịrị n’ime Anyị, dịka Gị onwe Gị si dị n’ime M, Mụ onwe M adịkwa n’ime Gị. Mee ka ha bụrụ otu, ka ụwa niile wee kwere na Ọ bụ Gị zitere M.

Otito nke I nyere M ka M nyere ha, ka ha wee bụrụ otu dịka Anyị onwe Anyị si bụrụ otu: Mụ onwe M n’ime ha, Gị kwa n’ime M, ka ha wee bụrụ otu n’ụzọ zuru oke, ka ụwa wee kwerekwa na Gị zitere M; na Gị hụkwara ha n’anya dịka I si hụ M n’anya.

“Nna! Achọrọ M ka ndị niile I nyere M soro M nọrọ n’ebe M nọ, ka ha wee hụ otito nke I nyere M, n’ihi na Ị hụrụ M n’anya tupu a tọọ ntọala ụwa. Nna, onye ezi omume!

Ụwa amaghị Gị, ma ama M Gị; ndị a makwa na Gị zitere M. Emere M ka ha mara Gị. Aga M emekwa ka ha mata Gị karịa, ka ịhụnanya nke I nwere n’ebe M nọ wee dị n’ime ha, Mụ onwe M kwa n’ime ha.”

Advertisement

Igbo Mass Readings for June 2 2025, Mọnde Izuụka nke asaa n’oge Iista

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for June 1 2025, Ụka Nke Asaa N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Atọ.

Catholic Lector is the founder of Catholiclectionary.com. I am a Theologian, a commissioned Lector, and Liturgy Minister. I lead the team that operates Catholiclectionary.com which is a Catholic Church-related website that provides you, on daily basis, with the following: (a) Catholic Daily Mass Readings (b) Reflections on the Daily Mass Readings (c) Daily Prayers (d) Catholic Hymns, and (e) Saints of the Day. I and my team work for the collective growth in spiritual lives of all the faithful.

Advertisement

Get Daily Mass Readings through Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.