Igbo Mass Readings for February 21 2038, Ụka nke Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 21 2038, Ụka nke Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 19:1-2,17-18

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Levitikọs

Isi Okwu: Hụ mmadụ ibe gị n’anya, ka i si hụ onwe gị n’anya.

Onyenweanyị gwara Mosis: “Gwa ọha obodo ụmụ Izrel okwu M sị ha: Dịnụ asọ, n’ihi na Mụ onwe M, bụ Chineke ụnụ dị asọ. “Onye ejila obi akpọ nwanne ya asị.

Asibedi na ị baara mmadụ ibe gị mba e kwela ka i mee njọ n’ihi ya. A bọla ọbọ. E burula onye obodo gị iro n’obi. Ị ga-ahụ mmadụ ibe gị n’anya otu i siri hụ onwe gị n’anya. Abụ M Dinwenụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 102:1-4.8, 10,12-13. Az. 8.

Azịza: Osebụrụwa dị ebere dị ịhụnanya.

1. Ihe niile dị n’ime m, gọzie aha nsọ Ya.

Mkpụrụobi m, too Onyenweanyị.

E chefukwala amara niile O meere gị. Azịza.

2. Ọ bụ ya na-agbaghara njọ gị niile.

Ọ bụkwa Ya na-agwọ ọrịa gị niile.

Ọ na-agbapụta ndụ gị ka ị ghara ịla n’iyi.

O ji ịhụnanya na ebere kpube gị okpu eze. Azịza.

3. Onyenweanyị bụ onye ebere na onye amara.

Ọ naghị ewe iwe ọkụ. Obi ọma Ya ebuka!

Ọ naghị emeso anyị omume dịka njọ anyị si dị.

Ọ naghị esocha ka njọ anyị si buo ibu akwụ anyị ụgwọ. Azịza.

4. Dịka ọwụwa anyanwụ si tee aka n’ọdịda ya;

otu ahụ ka O si eweti mmehie anyị aka n’ebe anyị nọ.

Dịka nna si nwee obi ebere n’ebe ụmụ ya nọ,

otu ahụ ka Onyenweanyị si emere ndị na-atụrụ Ya egwu ebere. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 3:16-23

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara Ndị Kọrịnt

Isi Okwu: Ihe niile na-agbara ụnụ odibo. Ma ụnụ bụ nke Kristi. Kristi bụkwa nke Chineke.

Ọ bụ na ụnụ amaghị na ụnụ bụ ụlọ nsọ Chineke, na Mmụọ nke Chineke bikwa n’ime ụnụ? Ọ bụrụ na onye ọ bụla emebie ụlọ nsọ Chineke, Chineke ga-emebi onye ahụ.

N’ihi na ụlọ nsọ Chineke dị nsọ. Ụnụ onwe ụnụ bụkwa ụlọ nsọ ahụ. Ka onye ọ bụla n’ime ụnụ gharakwa ịrafu onwe ya! Ọ bụrụ na e nwee onye ọ bụla n’etiti ụnụ na-eche na obi ya, na ya jupụtara n’amamihe nke ụwa, ọ kaara ya mma ịghọ onye nzuzu.

Ọ bụ n’ụzọ dị otu a ka ọ ga-esi bụrụ ezigbo onye nwere uche, n’ihi na amamihe nke ụwa a bụ amaghị ihe n’anya Chineke. E deela ya n’Akwụkwọ Nsọ, sị: “Chineke na-enwude ndị oke amamihe n’aghụghọ ha.”

E dekwara ya n’ebe ọzọ n’Akwukwọ Nsọ, sị: “Onyenweanyị maara na ihe ndị oke amamihe na-atụle n’obi ha bụ ihe efu.” Onye ejikwala mmadụ nkịtị anya isi.

Ọ pụtara na ihe niile bụ nke ụnụ: Ma ọ bụ Pọl, ma ọ bụ Apọlọs ma ọ bụ Pita; ma ọ bụ ụwa, ma ọ bụ ndụ, ma ọ bụ ọnwụ, ma ọ bụ ihe dị ugbu a, ma ọ bụ nke ga-adị n’ọdịnihu. Ihe niile bụ nke ụnụ. Ma ụnụ onwe ụnụ bụ nke Kristi; Kristi bụkwa nke Chineke.

MBEKU – Jọn 15:15

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị kwuru sị: “Ana M akpọ ụnụ ndị enyi M n’ihi na emeela M ka ụnụ mata ihe niile Nna gwara M.

Aleluya!

OZIỌMA – 5:38-48

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Hụnụ ndị iro ụnụ n’anya.

Jesu gwara ndị Ụmụazụ Ya, sị: “Ụnụ anụla iwu e nyere sị: ‘Ọ bụrụ na mmadụ aghụpụ anya gị’, ghụpụkwara anya nke ya. Kụpụkwa eze onye kụpụrụ eze gị.

Ma ana M agwa ụnụ: E jikwala ihe ọjọọ akwụghachi ụgwọ ihe ọjọọ. Ọ bụrụ na mmadụ amaa gị ụra na ntị aka nri, tụgharịara ya ntị nke ọzọ. Ọ bụrụ na mmadụ agbaa gị akwụkwọ, kpụrụ gị jee ụlọ ikpe, ka ọ nara gị uwe i yi n’ime, chinyekwuo ya oke uwe gị.

Ọ bụrụ na mmadụ akpụrụ gị gaa otu pụkụ nzọ-ụkwụ, soro ya gakwuo pụkụ nzọ-ụkwụ abụọ. Ọ bụrụ na mmadụ arịọ gị ihe, nye ya. A gbaketakwala onye na-achọ ibiri gị ego azụ.

“Ụnụ anụla iwu ahụ e nyere sị: “Hụ onye agbataobi gị n’anya ma kpọ onye iro gị asị. Mana iwu M na-enye ụnụ bụ: ‘Hụnụ ndị iro ụnụ n’anya; na-ekperenụ ndị na-emegbu ụnụ ekpere.

Nke a ga-egosi na ụnụ bụ ụmụ nke Nna ụnụ bi n’eluigwe, Onye na-eme ka anyanwụ na-awara ndị ajọ mmadụ ma ndị ezi mmadụ; na-emekwa ka mmiri na-ezoro mmadụ niile, ma ndị na-eme mma ma ndị na-eme njọ.

Ọ bụrụ na ụnụ na-ahụ naanị ndị enyi ụnụ n’anya, kedụ ebe ụnụ ga-agbado aka ana Chineke ụgwọ pụrụ iche? Ọ bụrụgodụ ndị ọna-ụtụ, ọ bụ na ha anaghị ahụ ndị enyi ha n’anya?

Ọ bụrụ na ndị ụnụ na-ekwunyere okwu bụ naanị ụmụnne ụnụ, olee ihe pụrụ iche ụnụ mere? Ọ bụrụgodụ ndị ọgọmmụọ, ọ bụ ha anaghị eme otu ahụ? Isi ya bụ na ọ dị mkpa na ụnụ ga-ezu oke otu Nna ụnụ bi n’igwe si zuo oke.”

Igbo Mass Readings for February 22 20238, Emume Oche Pita dị Asọ

Igbo Mass Readings for February 21 2038, Ụka nke Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Last Update: July 3, 2023