Igbo Mass Readings for February 24 2030, Ụka nke Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 24 2030, Ụka nke Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤG NKE MBỤ – 43:18-19, 21-22, 24-25

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya

Isi Okwu: Ọ bụ m ga-ekpochapụ ihe niile.

Lee ihe Onyenweanyị kwuru: Chefuonụ ihe ndị ahụ gara aga. Kwụsịnụ ịtụle uche n’ihe ndị ahụ mere mgbe dị anya. Leenụ anya! Ana M eme ihe ọhụrụ. O bidolarị ebido.

Ọ bụ na ụnụ anaghị ahụ ya? Ana M egbu okporo ụzọ n’ime ọzara. Ana M etinye osimiri n’ịkpọkịrị ala. Ndị ahụ M kpụrụ maka onwe M, ka ha wee na-ekwupụta otito M, ma o nweghị mgbe ọ bụla gị bụ Jekọp kpọkuru M.

Izrel, i nyeghịkwa onwe gị nsogbu n’ihi M. Ụnụ ji njọ ụnụ enye M mmekpa ahụ. Oke mmehie ụnụ ka ụnụ ji enye M oke nsogbu. Ma ọ bụ Mụ onwe M na-ehichapụcha mmehie ụnụ n’ihi onwe M. O nweghịkwa njọ ụnụ M ga-echeta ọzọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 40:2-5,13-14. Az. 5

Azịza: Onyenweanyị, gwọọ mkpụrụobi m, n’ihi na emehiela m Gị.

1. Ngọzi dịrị onye na-elekwaba nwa ogbenye na onye ume ruru ala.

N’ụbọchị mmekpa ahụ ga-abịa, Onyenweanyị ga-agbapụta ya.

Onyenweanyị ga-elekwa ya, bịakwa chekwaba ya.

Ọ ga-agọzi ya n’elu ụwa.

Ọ gaghị enyefe ya n’aka ndị iro ya. Azịza.

2. Onyenweanyị ga-enyere ya aka n’akwa ọrịa.

Ọ ga-ewepụrụ ya ahụ mgbu niile mgbe ọ na-arịa ọrịa.

O nwere mgbe m kwuru sị: “Onyenweanyị meerenụ m ebere.

Ọ bụ ezie na emehiela m Gị, ma gwọọ m.” Azịza.

3. Ma kulite m n’ihi ezi omume m.

Mee ka m guzoro n’ihu Gị ebighị ebi.

Ngọzi dịrị Dinwenụ, Eze nke Izrel bido n’ọgwụgwụ ruo n’ọgwụgwụ. Amen, Amen. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:18-22

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi nke Abụọ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt

Isi Okwu: O nweghị mgbe bụ E na E-e. Kama Ọ bụ E mgbe niile.

N’eziokwu Chineke ka m ji ekwuwapụta na okwu ahụ m gwara ụnụ anaghị abụ E otu mgbe, bịakwa bụrụ E-e na mgbe ọzọ. Jesu Kristi ahụ, bụ Nwa Chineke, Onye mụ na Saịlas na Timoti kwusaara ụnụ abụghị E na E-e.

Kama ọ bụ E mgbe niile. Ọ bụ n’ime Kristi ka Chineke zara E na nnụ kwuru nnụ nkwa niile O kwere. Ọ bụ ya mere anyị ji esi na Ya ekwe Amen n’otito nke Chineke.

Ma chetakwanụ na ọ bụ Chineke n’Onwe Ya mere ka anyị na ụnụ niile ghọta ebe anyị kwụrụ n’ime Kristi. O teela anyị mmanụ, bịakwa kaa anyị akara Ya. O jikwara Mmụọ Nsọ nke anyị bu n’obi anyị họpụta anyị iche. Chineke kakwara anyị akara n’ihu, werekwa Mmụọ gbaa anyị ibe nke nzọpụta.

MBEKU – Eph. 1, 17-18

Aleluya, aleluya!

Ka Nna Onyenweanyị Jesu Kristi meghee anya nke obi anyị; Ka anyị wee hụ ka olile anya nọ n’oku a kpọrọ anyị si buo ibu.

Aleluya!

OZIỌMA – 2:1-12

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Isi Okwu: Nwa nke mmadụ nwere ike ịgbaghara njọ.

Mgbe ụbọchị olemole gasịrị, Jesu lọghachiri na M Kapanọm. Akụkọ wee gazuo na Ọ nọ n’ụlọ. Ọtụtụ mmadụ wee zukọọ, nke mere na ohere ọ bụla adịghị e si abanye n’ọnụ ụzọ.

Ebe Jesu na-agwa ha okwuchukwu, e nwere ndị buteere Ya onye ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. N’ihi igwe mmadụ, mmadụ anọ ahụ bụ onye ọrịa enweghị ike isi n’ọnụ ụzọ bịaruo nso n’ebe Jesu nọ.

Ha wee meghee oghere n’elu ụlọ ebe ahụ Jesu nọ; si n’oghere ahụ buda onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ n’ute ọ na-edina. Mgbe Jesu hụrụ ụdị okwukwe ha nwere, Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Nwa M a gbagharala gị njọ gị niile.”

Ma ụfọdụ ndị ode-akwụkwọ nọdụrụ ala n’ebe ahụ, na-ajụrịta onwe ha n’obi ha, sị: “Gịnị mere nwoke a ji ekwu ụdị okwu a? Ọ na ekwulu Chineke! O nwere onye pụrụ ịgbaghara njọ ma ọ bụghị sọ Chineke?”

Ngwa ngwa Jesu jiri mmụọ Ya ghọta ihe ha bu n’uche wee jụọ ha, sị: “Gịnị mere ụnụ ji buru ụdị ajọ echiche a n’obi ụnụ? Olee nke ka mfe ime: Ịsị onye akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ “A gbagharala gị njọ gị?”

Ka ọ bụ ịsị ya, “Bilie, chịrị ute gị laa?” Ma ka ụnụ wee mara na Nwa nke Mmadụ nwere ike n’ụwa ịgbaghara njọ.” O wee sị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ “Ngwa bilie! Chịrị ute gị laa!”

O wee bilie chịrị ute ya, si n’ihu ha niile pụọ. Egwu jidere mmadụ niile. Ha wee too Chineke, sị: “Anyị ahụbeghị ihe dị otu a mbụ!”

Igbo Mass Readings for February 25 2030, Mọnde Izuụka nke Asaa N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for February 24 2030, Ụka nke Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Last Update: July 3, 2023