Igbo Mass Readings for February 28 2038, Ụka nke Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 28 2038, Ụka nke Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ..

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 49:14-15

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya

Isi Okwu: Enweghị m ike ichefu gị.

Zayọn kwuru sị: “Onyenweanyị ajụla m. Onyenwe m echefuola m.” Nne, o nwere ike ichefu nwa ya na-añụ ara?

O nwere ike ịghara ilekwa nwa o siri n’afọ ya mụpụta? A sịgodụ na nne nwere ike ichefu nwa, enweghị M ike ichefu gị.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 61:2-3, 6-9 Az. 9

Azịza: Sọ na Chineke ka mkpụrụobi m na-ezuru ike.

1. Sọ na Chineke ka mkpụrụ obi m na-ezuru ike.

Nzọpụta m si n’aka Ya abịa.

Sọ Ya bụ nkume m, nzọpụta m, na ụlọ okwute m.

O nweghị ihe ọ bụla ga-elupụ m obi. Azịza.

2. Mkpụrụobi m zuru ike sọsọ na Chineke.

N’ihi na nchekwube m si n’aka Ya abịa.

Sọ Ya bụ nkume m, nzọpụta m, na ụlọ okwute m.

O nweghị ihe ọ bụla ga-elupụ m obi. Azịza.

3. Nchedo m na ebube m dị n’aka Chineke.

Ọ bụ okwute na-enye m ike.

Na Chineke ka m na-agbaga ọsọ ndụ.

Ndị nke m! Tụkwasanụ Ya obi mgbe niile.

Wepụtachaanụ ihe niile nọ ụnụ n’obi n’ihu Ya. Azịza

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:1-5

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt

Isi Okwu: Echiche nzuzu mmadụ bu n’obi ka Onyenweanyị ga-agba n’anwụ.

Ndị mmadụ kwesịrị ịhụ anyị dịka ụmụ odibo Kristi, na dịka ndị e kenyere ọrụ ilekọta ezi na ụlọ n’ihe omimi nke Chineke. Ihe mbụ a chọrọ n’aka odibo na-elekọta ezi na ụlọ bụ ka nna ya ukwu hụ ya dịka onye kwesịrị ntụkwasị obi.

O nweghị ihe m ji ya kpọrọ ma ọ bụrụ na ụnụ, ma ọ bụ ụlọ ikpe ọ bụla mmadụ guzobere, achọpụta na m kwesịrị ekwesị ma ọ bụ na m ekwesịghị ekwesị. Agaghị m ekpe onwe m ikpe ọ bụla ma ọlị.

Ọ bụ ezie na akọ na uche m anaghị ata m ụta ọ bụla ma ọlị, ma nke ahụ egosịghị na aka m dị ọcha. Onye nwe ikpe m ikpe bụ sọ Onyenweanyị. Onye ebikwala ikpe mgbe oge ahụ na-erubeghị.

Hapụnụ nke ahụ ka ọ dịwa mgbe Onyenweanyị ga-abịa. Ọ bụ Ya ga-agba ihe niile e zoro n’ọchịchịrị n’anwụ. Ọ ga-ekpughe izu nzuzo niile dị n’obi mmadụ. Mgbe ahụ ka onye ọ bụla ga-anata otito kwesịịrị ya n’aka Chineke.

MEKU – Jọn 6: 63.68

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị, okwu Gị bụ mmụọ na ndụ. Ọ bụ Gị ji okwu ndụ ebighị ebi.

Aleluya!

OZIỌMA – 6:24-34

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: E chegbula onwe gị maka echi.

Jesu gwara Ụmụazụ Ya, sị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ odibo nna ukwu abụọ n’otu mgbe. N’ihi na ọ ga-akpọ otu asị, hụ nke ọzọ n’anya. Ma ọ bụ, na ọ ga-asọpụrụ otu, lelia nke ọzọ.

Ya mere ụnụ enweghị ike ịbụ odibo Chineke na odibo akụ na ụba. “N’ihi nke a ka M ji asị: ụnụ echegbula onwe ụnụ banyere ndụ ụnụ na ihe ụnụ ga-eri. Ụnụ echegbula onwe ụnụ banyere ahụ ụnụ na uwe ụnụ ga-eyi n’ahụ.

Ọ bụ na ọ bụghị ndụ kariri ihe oriri? Ka ọ bụ na ọ bụghị ahụ kariri uwe e yi n’ahụ? Leenụ ụmụ nnụnụ na-efe n’elu. Ha anaghị akọ ugbo; ha anaghị ewe ihe ubi; nke ha na-ekpokọ ihe n’ọba.

Ma Nna ụnụ bi n’igwe na-azụ ha. Ọ pụtara na ụnụ adaghị oke ọnụ ahịa karịa ụmụ nnụnụ? Onye n’ime ụnụ pụrụ ịtụkwasị ihe n’ogologo ndụ ya site n’ichegbu onwe ya? “Gịnị mere ụnụ ji echegbu onwe ụnụ banyere uwe ụnụ ga-eyi n’ahụ?

Leenụ okooko osisi dị n’ọhịa. Ha adịghị arụ ọrụ; nke ha na-ekwe akwa. Ma asị M ụnụ: Ọ bụrụgodụ mgbe Solomọn yinyechara ihe niile o jiri bụrụ eze, a chọghị ya mma a chọrọ otu n’ime ụmụ okooko osisi ndị a. “Ụnụ bụ ndị obere okwukwe, ọ bụrụ na Chineke si otu a chọọ ahịhịa dị n’ọhịa mma; ahịhịa nke na-eto taa, echi a tụnye ya n’ite ọkụ; ọ bụ na Ọ gaghị elekwa ụnụ anya karịa ka O si elekwa ahịhịa ndị a?

Ya mere, ụnụ echegbula onwe ụnụ, na-ajụ sị: ‘Gịnị ka anyị ga-eri? Gịnị ka anyị ga-añụ? Gịnị ka anyị ga-eyi? Ọ bụ ndị ọgọmmụọ na-atụkwasa obi n’ihe niile ndị a.

Nna ụnụ nke igwe maara na ihe ndị a dị ụnụ mkpa. Ma burugodụnụ ụzọ chọọ alaeze nke Nna na ezi omume Ya. A ga-atụkwasịkwara ụnụ ihe ndị ọzọ niile. Ya mere, ụnụ echegbula onwe ụnụ maka echi. Echi ga-echere onwe ya. Nsogbu nke ụbọchị taa zuuru ụbọchị taa.”

Igbo Mass Readings for May 27 2024, Mọnde Izuụka nke Asatọ N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for February 28 2038, Ụka nke Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Last Update: July 3, 2023