Igbo Mass Readings for March 3 2030, Ụka nke Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for March 3 2030, Ụka nke Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:16-17, 21-22

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Hozea.

Lee ihe Onyenweanyị kwuru: Aga M eduba ya n’ime ọzara, nọrọ ebe ahụ gwa ya okwu ga-erute ya na mmụọ. Ọ ga-asa M ụdị okwu ahụ ọ na-agwa M mgbe ọ bụ nwa agbọghọ, mgbe ahụ o si n’ala Ijipt pụta.

Aga M alụ gị ka nwunye ruo mgbe ebighị ebi. Aga M alụ gị ka nwunye n’ụzọ ziri ezi na n’ikpe nkwụmọtọ, n’ịhụnanya na ebere. Aga M alụ gị ka nwunye n’usoro kwesịrị ntụkwasị obi. Mgbe ahụ, ị ga-ama Onyenweanyị.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 102:1-4, 8, 10, 12-13 Az. 8

Azịza: Onyenweanyị bụ ebere na ịhụnanya.

1. Ihe niile dị n’ime m, gọzie aha nsọ Ya.

Mkpụrụobi m, too Onyenweanyị.

E chefukwala amara niile O meere gị. Azịza.

2. Ọ bụ Ya na-agbaghara njọ gị niile.

Ọ bụkwa ya na-agwọ ọrịa gị niile.

Ọ na-agbapụta ndụ gị ka ị ghara ịla n’iyi.

O ji ịhụnanya na ebere kpube gị okpu eze. Azịza.

3. Onyenweanyị bụ onye ebere na onye amara.

Ọ naghị ewe iwe ọkụ. Obiọma Ya ebuka.

Ọ naghị emeso anyị omume dịka njọ anyị si dị.

Ọ naghị esocha ka njọ anyị si buo ibu akwụ anyị ụgwọ. Azịza.

4. Dịka ọwụwa anyanwụ si tee aka n’ọdịda ya;

otu ahụ ka o si eweti mmehie anyị aka n’ebe anyị nọ.

Dịka nna si nwee obi ebere n’ebe ụmụ ya nọ,

otu ahụ kwa ka Onyenweanyị si emere ndị na-atụrụ Ya egwu ebere. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 3:1-6

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Nke Abụọ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt

Isi Okwu: Anyị bụ ndị ụkọ nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ.

Ndị ọzọ nwere ike inye ụnụ, ma ọ bụ ịnata n’aka ụnụ akwụkwọ na-akọwa ụdị ezi mmadụ ha bụ. Ma ọ dị mkpa na anyị ga-enye ụnụ, ma ọ bụ nata ụnụ akwụkwọ na-akọwa ụdị ezi mmadụ anyị bụ?

Ụnụ onwe ụnụ bụ akwụkwọ anyị dere, kụpaba n’obi anyị; akwụkwọ nke mmadụ niile nwere ike ịhụ anya na nke mmadụ niile nwere ike ịgụ agụ. O were anya na ụnụ bụ akwụkwọ ozi nke, Kristi jiri aka Ya dee, zipụ site n’aka anyị.

E jighị uri dee ya, kama e jiri Mmụọ nke Chineke dị ndụ dee ya. E deghị ya n’elu mbadamba nkume, kama e dere ya n’eze-obi nke anụ ahụ mmadụ. Anyị na-ekwu nke a n’ihi na anyị sitere n’aka Kristi nwee ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ.

Anyị echeghị n’ime onwe anyị na anyị nwere ike ịsị na nke a bụ ọrụ anyị rụrụ n’ike aka anyị. Kama ihe ọbụla anyị nwere si n’ebe Chineke nọ bịa. Ọ bụ Chineke mere ka anyị bụrụ ndị na-ekesa ihe omimi nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ.

Ọ bụghị ọgbụgba ndụ e dere n’akwụkwọ, kama ọ bụ nke e dere na Mmụọ Nsọ. N’ihi na ihe e dere na mkpụrụ akwụkwọ na-ebute ọnwụ; ma nke e dere na Mmụọ Nsọ na-enye ndụ.

MBEKU – Jọn. 10:27

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị kwuru sị: “Atụrụ M na-anụ olu M. Ama M ha. Ha na-esokwa M.

Aleluya!

OZIỌMA – 2:18-22

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Isi Okwu: Ha na di lụrụ nwanyị ọhụrụ nọ.

Ndị na-eso ụzọ Jọn, onye ome mmirichukwu na ndị Farisii na-ebu ọnụ ugboro ugboro. Ndị mmadụ bịara jụọ Jesu sị: “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jọn, onye ome mmirichukwu, na ndị na-eso ụzọ ndị Farisii ji ebu ọnụ, ma Ụmụazụ Gị anaghị ebu ọnụ”?

Jesu wee jụọ ha sị: “Kedụ ka ndị bịara oriri agbamakwụkwọ ga-esi ebu ọnụ mgbe ha na di lụrụ nwanyị ọhụrụ nọ n’oriri, ha agaghị ebu ọnụ. Ma oge ga-abịa mgbe a ga-anapụ ha di lụrụ nwanyị ọhụrụ.

Oge ahụ ka ha ga-amalite ibu ọnụ. “A naghị ewere akwa dị oke ọhụrụ dụkwasị n’elu uwe ochie dọkara adọka. E mee otu a, akwa ọhụrụ ahụ na-adọkapụ ihe na nke ochie, nke na ndọka jọkariri njọ na-apụta; Otu aka ahụ, a naghị eji akpụkpọ ochie agbanye mmanya ọkụ ọhụrụ.

E mee otu a mmanya ọkụ ahụ agbawaa akpụkpọ ahụ, mmanya na akpụkpọ alaa n’iyii. A na-agbanye mmanya ọkụ ọhụrụ n’ime akpụkpọ ọhụrụ.”

Igbo Mass Readings for May 4 2030, Mọnde Izuụka nke Asatọ N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for March 3 2030, Ụka nke Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Last Update: July 3, 2023