Igbo Mass Readings for April 23 2023, Ụka Nke Atọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 23 2023, Ụka Nke Atọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:14, 22-28

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi

Isi Okwu: Ọnwụ enweghị ike imeri ya.

Ma Pita guzoro, ya na ndị ozi iri na otu ahụ, wee welie olu ya gwa ọgbakọ ahụ okwu sị: “Ndị Juu ibe m, na ụnụ niile bụ ndị bi na Jerusalem! Geekwanụ ntị n’okwu m chọrọ ikwu! “Ndị Izrel ibe M! Geenụ m ntị!

Jesu Onye Nazaret, bụ Nwoke nke Chineke gosiri ụnụ, site n’ọrụ ịtụnanya, na ọrụ ebube, na ihe ịrịba-ama, nke Chineke mere n’etiti ụnụ site n’aka Ya dịka ụnụ ji anya ụnụ hụ.

Jesu a, Onye a raara nye dịka Chineke siri n’uche nsọ Ya zupụta, na dịka Chineke siri n’amamihe Ya buru ụzọ mazuo, ka ụnụ kpọgidere n’obe, gbukwaa site n’aka ndị na-amaghị iwu anyị.

Ma Chineke mere ka O si n’ọnwụ bilie, mgbe Ọ tọpụsịrị ya ihe mgbu nke ọnwụ, n’ihi na ọnwụ enweghị ike imeri Ya. N’ihi na Devid na-ekwu maka Ya, sị:

Ahụrụ M Onyenweanyị ka Ọ nọ n’ihu M mgbe niile. N’ihi na Ọ nọ n’aka nri M, a gaghị ewezuga M n’ọnọdụ M. N’ihi nke a, mkpụrụ obi M ñụrịrị ọñụ. Ire M kọwara akụkọ banyere ọñụ M.

Ọzọ kwa, anụ ahụ M ga-ebikwa n’olile anya. N’ihi na Ị gaghị ahapụ mkpụrụ obi M n’ime ala mmụọ. Ị gaghị ekwe Onye Nsọ Gị ka Ọ hụ ire ure. I meela ka M mata ụzọ na-eduba na ndụ. Ị ga-emekwa ka M jupụta n’ọñụ site na nnọnye nke Gị.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 15:1-2. 5.7-11. Az. 11

Azịza: Onyenweanyị, gosi anyị okporo ụzọ nke ndụ.

Ma ọ bụ Aleluya

1. Chineke m, chekwaba m, agbatarala m Gị ọsọ ndụ.

Asị m Onyenweanyị: “Ị bụ Chineke m,”

biko Onyenwe m Ị bụ oke m ketara na iko m.

Gị onwe Gị bụ ụgwọ m ritere. Azịza.

2. Aga m eto Onyenweanyị, onye na-enye m ndụmọdụ.

Onye na-eduzi obi m, ya bụrụgodu n’ime abalị.

Onyenweanyị guzo n’ihu m mgbe niile.

Ebe Ọ nọ m n’aka nri, ụkwụ siri m ike n’ala. Azịza.

3. N’ihi ya, obi na-atọ m ụtọ.

Mmụọ m na-añụrị ọnụ.

Ahụ m n’onwe ya nwere ume iru ala.

N’ihi na Ị gaghị ahapụ mkpụrụ obi m n’ala mmụọ;

nke Ị na- ekwe ka onye Ị hụrụ n’anya ree ure. Azịza.

4. Ị ga-egosi m okporo ụzọ nke ndụ na añụrị zuru ezu n’ihu Gị;

tinyekwuoro añụrị ebighị ebi n’ihu Gị. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:17-21

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pita dị asọ dere

Isi Okwu: Ejiri ọbara Nwatụrụ na-ebughị ọrụ, nke bụ Kristi, gbapụta ụnụ.

Ọ bụrụkwa na ụnụ na-akpọku Chineke dịka Nna, na-asọpụkwaranụ Ya oge niile ụnụ bi ka ọbịa n’elu ụwa, n’ihi na Ọ bụ onye na-ekpe mmadụ ikpe dịka ọrụ onye ọ bụla si dị, n’eleghị anya n’ihu.

Ụnụ matara ihe e jiri gbapụta ụnụ na ndụ ọjọọ, nke ụnụ si n’aka nna nna ụnụ ha nata. Ụnụ matakwara ihe e jiri gbapụta ụnụ abụghị ihe pụrụ imebi emebi, dịka ọlaọcha, ma ọ bụ ọlaedo.

Kama, ihe e ji gbapụta ụnụ bụ ọbara dị oke ọnụ nke Kristi, onye dị ka Nwatụrụ na-enweghị ọrụ ma ọ bụ ntụpọ. Kristi bụkwa onye ahụ Chineke họpụtara tupu e kee ụwa.

E kpughekwara Ya n’ihi ụnụ mgbe oge ruru. Ụnụ sitere n’aka Ya kwere na Chineke, bụ Onye mere ka O si n’ọnwụ bilie, na Onye nyere Ya ebube. N’ihi nke a, okwukwe na olile anya ụnụ dị n’ebe Chineke nọ.

MBEKU – Luk. 24:32

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị Jesu, kọwaara anyị Akwụkwọ Nsọ. Mee ka obi anyị jupụta n’ọñụ mgbe Ị na-agwa anyị okwu.

Aleluya!

OZIỌMA – 24:13-35

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Isi Okwu: Ha matara Onyenweanyị n’ịnyawa achịcha.

N’ụbọchị ahụ, mmadụ abụọ n’ime ndị ozi Jesu na-aga obodo nta a na-akpọ Emaus nke rukwara kilomita iri na abụọ site na Jerusalem. Ihe ha na-akọrịta n’etiti onwe ha, ka ha na-aga n’ụzọ bụ ihe niile e emere Jesu.

Mgbe ha na-akparịta ụka, na-ajụrịta onwe ha ajụjụ, Jesu n’onwe Ya bịara ha nso, soro ha na-aga n’ụzọ Emaus ahụ. Ma e kpuchiri anya ha ka ha ghara ịmata na ọ bụ Jesu.

Jesu wee sị ha: “Gịnị ka ụnụ na-akpa ka ụnụ na-aga ije”? Ha wee guzo na mgbarụ ihu. Otu onye n’ime ha, aha ya bụ Kliopas, wee jụọ Ya, sị: “Ọ bụ naanị gị bụ ọbịa nọ na Jerusalem na-amaghị ihe merenụ kemgbe abalị olemole gara aga?”

Jesu wee jụọ ha, sị: “Gịnị mere”? Ha wee sị Ya, “Ihe ndị Juu mere Jesu Onye Nazaret, Nwoke bụ onye amụma, bụrụkwa Onye dị ike n’okwu na n’ọrụ ebube n’ihu Chineke na n’anya ọha ndị Juu niile.

Ma ndị isi nchụaja anyị na ndị isi nke ndị Juu raara Ya nye, ka a maa Ya ikpe ọnwụ, kpọgide Ya n’obe. Ma anyị nwere olile anya mgbe anyị hụrụ Ya, na ọ bụ Ya ka Chineke zitere ịgbapụta ụmụ Izrel.

Taa bụ ụbọchị nke atọ kemgbe ihe ndị a mere. Ma nke ka nke, ụfọdụ ụmụ nwanyị n’ime ndị otu anyị mere ka obi fepụ anyị. Ha mara ụzọ, gaa n’ili ebe e liri Ya. Ha ahụghị ozu Ya n’ime ili.

Ha wee laghachi, na-akọ na ha hụrụ ndị mmụọ ozi n’ọhụ, ndị gwara ha na Jesu dị ndụ. Ụfọdụ mmadụ n’ime ndị otu anyị ejeela n’ili ahụ, were anya ha hụ na ihe niile dị otu ụmụ nwanyị ndị a si kọọrọ anyị.

Ma ha ahụghị Jesu n’onwe Ya”. Jesu wee sị ha: “Ụnụ ndị na-enweghị ọgụgụ-isi! Ụnụ ndị ọ na e siri ike n’obi ikwenye ihe niile ndị amụma kwuru! Ụnụ chezọrọ na ọ dị mkpa ka Kristi ahụ hụ ahụhụ ndị a, wee banyezie n’ọchịchị nke ebube Ya”?

Jesu wee bido, kọwara ha ihe niile e dere n’Akwụkwọ Nsọ banyere Ya onwe Ya, site n’Akwụkwọ Mosis wee ruo na nke ndị amụma niile. Ha na Jesu wee bịaruo nso n’obodo nta ahụ nke mmadụ abụọ ahụ gaje.

Jesu wee mee ka Ọ na-agafe obodo nta ahụ. Ha wee rugide Ya, sị: “Nọnyere anyị, n’ihi na chi ebidola iji, ụbọchị agamikwaala ugbu a”. Jesu were kwenye, banye n’ụlọ, Ị nọnyere ha.

N’oge ha nọdụrụ ala iri nri anyasị, Jesu weere achịcha, gozie ya, nyawaa ya, wee nye ha. Chineke wee meghee anya ha. Ha wee mata Jesu. Ma Ọ pụrụ n’anya ha n’otu oge ahụ.

Ha wee sịrịta onwe ha, “Ị hụkwara ka okwu Ya si kpoo anyị ọkụ n’obi, mgbe Ọ na-agwa anyị okwu n’ụzọ, mgbe Ọ na-ekpughere anyị ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ”?

Mmadụ abụọ ahụ wee bilie n’otu oge ahụ, laghachi na Jerusalem. Ha wee hụ ndị ozi iri na otu ahụ, na ndị ha na ha nọ, ka ha zukọrọ n’otu ebe. Ha nọkwa, na-akọ akụkọ nke ha, sị: “N’ezi okwu Onyenweanyị esila n’ọnwụ bilie!

O mekwaala ka Saịmọn hụ Ya anya”! Ha mmadụ abụọ wee kọọrọ ndị ọzọ ihe mere n’ụzọ, na otu ha si mata Jesu site n’ịnyawa ogbe achịcha ahụ.

Igbo Mass Readings for April 24 2023, Mọnde Izuụka nke Atọ n’oge Iista

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for April 23 2023, Ụka Nke Atọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Mbụ.

Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2024 (Kindle eBook & Paperback)

X
Scroll to Top
error: Alert: Content is protected !!

Receive Daily Mass Readings and Reflections via Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.