Igbo Mass Readings for April 14 2024, Ụka Nke Atọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Abụọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 14 2024, Ụka Nke Atọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Abụọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:13-15, 17-19
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi
Isi Okwu: Ụnụ gburu eze ndụ. Ma Chineke ebilitela Ya n’ọnwụ.
Pita gwara ndị mmadụ okwu sị: Chineke nke Ebreham, na nke Aịzik, na nke Jekọp, Chineke nke nna nna anyị ha, enyela Onye na-ejere Ya ozi bụ Jesu otito na ebube nke kachasị elu.
Ụnụ onwe ụnụ raara Ya nye n’aka ndị isi, gọnarịkwa Ya n’ihu Paịlet, ọ bụna mgbe Paịlet kpesịrị Ya ikpe, chọọ ịhapụ Ya. Ọ bụ Onye Nsọ nke Chineke, na Onye ezi omume ahụ; ma ụnụ gọnarịrị Ya.
Kama ụnụ rịọrọ ka Paịlet were amara hapụrụ ụnụ otu nwoke bụ ogbu mmadụ. N’ime nke a, ụnụ wee gbuo Onye ahụ na-eduba mmadụ na ndụ. Ma Chineke mere ka O si n’ọnwụ bilie.
Anyị onwe anyị bụkwa ndị akaebe nke mbilite Ya. Ma ugbu a, ụmụnna m, amatala m na ihe ụnụ na ndị isi ụnụ mere Jesu, ụnụ mere Ya na-amaghị ama.
N’ihi na Chineke mere ka ihe niile O buru ụzọ kwusaa site n’ọnụ ndị amụma Ya niile, mezuo n’ụzọ dị otu a; nke bụ na Kristi Ya ga-ahụ ahụhụ. Ya mere, chegharịanụ ugbu a, lọghachikwutenụ Chineke, ka O wee hichapụ mmehie ụnụ niile.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 4:2, 4, 7, 9. Az. 7
Azịza: Onyenweanyị, mee ka ihe Gị chakwasị anyị.
Ma ọ bụ Aleluya
1. Chineke Onye ezi omume,
mgbe m kpọrọ Gị oku, biko za m.
Ọ bụ Gị na-azọpụta m na mkpa.
Meerenụ m ebere, nụrụ olu m. Azịza
2. Mata na Onyenweanyị na-arụrụ onye kwere na Ya ọrụ ebube.
Onyenweanyị na-anụ olu m mgbe ọ bụla m kpọkuru Ya. Azịza.
3. Biko Onyenweanyị, mee ka ìhe si n’ihu Gị chakwasa anyị.
Ọ bụ Gị na-etinye añụrị n’obi m. Azịza.
4. Aga m edina ala n’udo,
bịakwa rahụ ụra n’otu ntabi anya.
Onyenwe m, ọ bụ Gị na-eme ka ume ruo m ala. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2:1-5
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Jọn dị asọ dere
Isi Okwu: Ọ bụ aja ahụ na-ebupụ njọ anyị. Ọ bụghị sọ njọ anyị, ma njọ ụwa niile.
Ụmụ m! Ana m edere ụnụ ihe ndị a n’akwụkwọ ka ụnụ wee ghara imehie. Ma ọ bụrụkwa na onye ọ bụla emehie, anyị nwere otu Onye na-ekwu ọnụ anyị n’ebe Nna anyị nọ; Ya bụ Jesu Kristi, Onye ezi omume.
Ya onwe Ya bụkwa ihe e ji chụ aja nke medara Chineke obi maka mmehie anyị niile. Ọ bụghị naanị na Jesu bụ ihe medara Ya obi maka mmehie nke anyị, kama Ọ bụkwa ihe medara Ya obi maka mmehie mmadụ niile.
Ihe ga-eme ka o wee anya na anyị maara Onye Chineke bụ, bụ na anyị na-edebe iwu Ya niile. Onye ọ bụla na-asị, “Ama m Chineke nke ọma,” ma ọ dịghị edebe ihe niile O nyere n’iwu, Onye ahụ bụ onye ụgha, ezi okwu adịghịkwa n’ime ya.
Ma onye ọ bụla na-edebe okwu Ya bụ onye e mere ka ịhụnanya Chineke zuo oke n’ime ya n’ezie. Site na nke a ka mmadụ ga-eji mata na anyị na-adị ndụ n’ime Chineke.
MBEKU – Luk. 24:32
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị Jesu, kọwaara anyị okwu Gị. Mee ka obi anyị na-ekpo ọkụ nke ịhụnanya n’okwu Gị.
Aleluya!
OZIỌMA – 24:35-48
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Isi Okwu: Ụnụ ahụla ka e siri dee ya na Kristi ga-ahụ ahụhụ, bịakwa bilite n’ọnwụ n’ụbọchị nke atọ.
Ha mmadụ abụọ wee kọọrọ ndị ọzọ ihe mere n’ụzọ, na otu ha si mata Jesu site n’ịnyawa achịcha ahụ. Ma mgbe mmadụ abụọ ahụ na-akọ ihe ndị a, Jesu wee guzo n’etiti ha, sị ha: “Udo dịrị ụnụ”!
Ụmụazụ iri na otu ahụ na ndị ha na ha nọ, wee kụja, tụọ egwu, chee na ha hụrụ mmụọ. Ma Jesu sịrị ha: “Gịnị mere ụjọ ji na-atụ ụnụ? Gịnị mere ụnụ ji na-enwe obi abụọ?
Leenụ aka M na ụkwụ M, wee mara na ọ bụ Mụ onwe M. Metụnụ M aka n’ahụ, wee mara na ọ bụ M. N’ihi na mmụọ, enweghị anụ ahụ na ọkpụkpụ, otu ụnụ hụrụ na Mụ onwe M nwere”.
Mgbe Jesu kwusiri okwu ndị a, O gosiri ha aka Ya na ụkwụ Ya. Obi ha wee jupụta n’ọñụ. Ihe a wee jukwa ha anya. Ma o siiri Ụmụazụ ya ike inwe mkpebi na ọ bụ ya n’ezie.
Ma Jesu jụrụ ha sị: “Ụnụ nwere ihe oriri ọ bụla n’ebe a”? Ha nyetụrụ Jesu azụ a mịkpọrọ amịkpọ. Jesu wee nara ha azụ ahụ rie ya n’ihu ha niile. Jesu wee sị ha: “A gwara M ụnụ ihe ndị a mgbe Mụ na ụnụ nọ, na ihe niile e dere n’Akwụkwọ Iwu Mosis, na n’Akwụkwọ ndị amụma, na n’Abụ Ọma banyere M, ga emezucha.”
Mgbe ahụ ka O meghere uche ha, ka ha ghọta ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ. O wee sị ha: “Otu a ka edere ya n’Akwụkwọ Nsọ na Kristi ahụ ga-ahụ ahụhụ sikwa n’ọnwụ bilie n’ụbọchị nke atọ; na malite na Jerusalem, a ga-ekwusakwara mba niile nchegharị na mgbaghara mmehie, n’aha Ya”. Ụnụ onwe ụnụ bụ ndị akaebe ihe ndị a.
Igbo Mass Readings for April 15 2024, Mọnde Izuụka nke Atọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi
Igbo Mass Readings for April 14 2024, Ụka Nke Atọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Abụọ.