Igbo Mass Readings for May 4 2025, Ụka Nke Atọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Atọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 4 2025, Ụka Nke Atọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Atọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:27-32, 40-41
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi
Isi Okwu: Anyị bụkwa ndị akaebe, anyị na Mmụọ Nsọ.
Ha wee kpọta ndị ozi ahụ, guzo ha n’etiti ọgbọikpe nke bụ e kwuchaa ọ gwụ n’ikpe omenala ndị Juu. Onye isi nchụaja wee jụọ ha, sị: “Ọ bụkwa anyị nyesiri ụnụ iwu ike ka ụnụ ghara ikuziri ndị mmadụ ihe n’aha nke a?
Ma lee, ụnụ agbasala ozizi ụnụ n’obodo Jerusalem niile! Ụnụ n’egosi ọha na anyị gburu Nwoke a, na-ezubekwa iweta ọbara Ya n’isi anyị”. Ma Pita na ndị ozi ndị ọzọ zaghachiri, sị: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi karịa mmadụ.
Chineke nke nna nna anyị ha mere ka Jesu si n’ọnwụ bilie, bụ Onye ụnụ gburu site n’ịkwụba Ya n’elu osisi. Chineke weere aka nri nke ike a bulie Ya elu, ịbụ onye ndu na onye nzọpụta, ka O wee nye ndị Izrel niile ohere iji chegharịa; ka Chineke wee gbaghara ha mmehie ha niile.
Anyị onwe anyị bụkwa ndị akaebe nke ihe ndị a niile, anyị na Mmụọ Nsọ, Onye Chineke nyerela ndị niile na-erubere Ya isi”. Ha wee kpọbata ndị ozi ahụ n’ụlọ, pịa ha ụtalị, nyesie ha iwu ike ka ha ghara ịgwa ndị mmadụ okwuchukwu ọzọ n’aha Jesu, wee hapụ ha, ka ha laa.
Ndị ozi ahụ wee si n’ụlọ ikpe ahụ laa, na-añụrị na Chineke gụnyere ha na ndị kwesịrị ịnara mkparị n’ihi aha Jesu.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 29:2, 4-6, 11-13. Az. 2
Azịza: Onyenweanyị, aga m eto Gị, n’ihi na Ị zọpụtala m.
Ma ọ bụ Aleluya
1. Onyenweanyị, aga m eto Gị,
n’ihi na Ị zọpụtala m nke ọma.
I kweghị ka ndị iro chịgbuo m n’ọchị.
Onyenweanyị, I sila n’aka mmụọ gụpụta m;
bịakwa chekwaba m ka m ghara ịdaba n’ili. Azịza.
2. Ụnụ bụ ndị kwere na Chineke, toonụ Onyenweanyị.
Nyenụ aha nsọ Ya ekele.
N’ihi na iwe Ya na-abụ sọ nwa ntakịrị oge.
Ma obi ọma Ya na-eru ndụdụgandụ.
Ịkwa akwa na-abata n’abalị. Ma ọñụ na-abịa na chi ọbụbọ. Azịza.
3. Onyenweanyị, nụrụ olu m, meere m ebere.
Onyenwe m, bụrụ enyemaka m.
Ị gbanwoola ịgba mkpe m ka ọ ghọọ ịgba egwu.
Onyenwe m, Chineke m, aga m ekelegide Gị ruo mgbe ebighị ebi. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:11-14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mkpughe
Isi Okwu: Nwatụrụ ahụ e gburu, kwesịrị ịnata ike na akụ niile.
N ‘ime ọhụ m, mụnwa bụ Jọn, nụrụ olu nke ọtụtụ ndị Mmụọ ozi ruru nnụ kwuru nnụ, na nde kwuru nde, ndị mmadụ na-apụghị ịgụta ọnụ. Ha niile gbara ọche-eze ahụ, na ihe anọ ahụ dị ndụ na ndị okenye ahụ gburugburu. Ha ji olu ike, na-abụ abụ na-asị:
“Nwatụrụ ahụ nke e gburu egbu
Kwesịrị ịnata ike niile,
Na akụ niile, na amamihe niile,
Na ume niile, na nsọpụrụ niile,
Na otito niile, na ngọzi niile!
Mgbe ahụ anụrụ m ka ihe niile e kere eke, nke dị n’eluigwe, na nke dị n’elu ụwa, nke dị na mmiri na nke dị n’okpuru ụwa, na nke dị na mbara igwe niile, ka ha na-abụ abụ, na-asị:
“Onye ahụ Nke na-anọkwasị n’oche eze ahụ,
Na Nwatụrụ ahụ,
Ka ngọzi niile, na nsọpụrụ niile,
Na otito niile, na ike niile dịrị,
Ruo mgbe niile ebighị ebi!”
Ihe anọ ahụ dị ndụ wee zaa, sị: “Amen!”
Ndị okenye ahụ wee daa n’ala, kpọọrọ Chineke isi ala.
MBEKU
Aleluya, aleluya!
Onye ọ bụla hụrụ M n’anya ga-ekwegidesi aka ike n’Okwu M. Nna M ga-ahụkwa ya n’anya. Anyị ga-abịakwute ya.
Aleluya!
OZIỌMA – 21:1-19 ma ọ bụ 21:1:14
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Isi Okwu: Jesu wee bịa, were achịcha ahụ nye ha nyekwa ha azụ.
Jesu gosiri ndị Ụmụazụ Ya onwe Ya ọzọ n’oke Osimiri Tiberịa. Otu a ka o si mee: Saịmọn Pita, na Tọmọs, onye a na-akpọ Ejima, na Nataniel onye Kena nke Galili, na ụmụ Zebedi, na mmadụ abụọ ọzọ n’ime ndị Ụmụazụ Ya nọkọrọ n’otu ebe.
Saịmọn Pita wee sị ha: “Ka m jee igbu azụ”. Ha wee sị ya: “Anyị ga-eso gị jee”. Ha niile wee pụọ, banye n’ụgbọmmiri. Ma ọ dịghị azụ ọ bụla ha gbutere n’abalị ahụ niile. Ma mgbe chi na-abọ, Jesu wee guzo n’akụkụ mmiri.
Ma ndị Ụmụazụ Ya amataghị na ọ bụ Jesu. Jesu wee jụọ ha, sị: “Ụmụokorobịa M, ụnụ gbutere ihe ọ bụla?” Ha wee zaa, sị: “Ee, e.” Jesu wee sị ha: “Wụnyenụ ụgbụ ụnụ n’akụkụ aka nri nke ụgbọ.
Ụnụ ga-egbutekwa azụ”. Ha wee wụnye ụgbụ ha. Ma ha enweghị ike ịdọpụta ya n’ihi na ọtụtụ azụ dị n’ime ya. Ya mere, Nwaazụ Jesu ahụ, onye Jesu hụrụ n’anya, wee sị Pita: “Ọ bụ Onyenweanyị”!
Mgbe Saịmọn Pita nụrụ na ọ bụ Onyenweanyị, o yinyere uwe ya, n’ihi na ọ gba ọtọ, wụba n’ime osimiri. Ma Ụmụazụ Jesu ndị ọzọ banyere n’ụgbọ na-adọkpụ ụgbụ ha nke azụ juru.
Ma ebe ha nọ adịghị anya n’elu ala. Ọ dị ihe dị ka narị nzọ ụkwụ na ise. Mgbe ha pụtara n’elu ala, ha hụrụ ọkụ a kwanyere, nke a hụkwasịrị azụ n’elu ya. Ogbe achịcha dịkwa n’ebe ahụ.
Jesu wee sị ha: “Wetanụ ụfọdụ n’ime azụ ụnụ gbutere ugbu a. Saịmọn Pita wee banye n’ụgbọ dọpụta ụgbụ n’ala. Ha dị narị azụ abụọ na iri ise na atọ n’ime ụgbọ ahụ.
Ọ bụ ezie na azụ dị ọtụtụ, ma ụgbụ ha adọkaghị. Jesu wee sị ha: “Bịanụ rie nri ụtụtụ.” Ma ọ dịghị Onye ọ bụla n’ime ndị Ụmụazụ Ya ụjọ kwere jụọ Ya: “Onye ka ị bụ”?
N’ihi na ha matara na Ọ bụ Onyenweanyị. Jesu wee bịa, were achịcha ahụ nye ha. Otu ahụ kwa ka O si nyekwa ha azụ ahụ. Nke a mere ya ugboro atọ Jesu gosiri Ụmụazụ Ya onwe Ya, kemgbe e mere ka O si n’ọnwụ bilie.
Igbo Mass Readings for May 5 2025, Mọnde Izuụka nke Atọ n’oge Iista
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.