Igbo Mass Readings for January 25 2026, Ụka nke Atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 25 2026, Ụka nke Atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:23-9:3

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya

Isi Okwu: Na Galili nke ndị mba ọzọ, ndị mmadụ ahụla ihe.

Na mgbe ahụ, O mere ka e lelia ala Zebulọn na ala Neftali. Ma na ngwụcha oge, ụzọ oke osimiri ahụ ga-eturu ugo; ala ahụ nọ n’ofe Jọdan nke bụ ọnụmara nke ndị mba ọzọ ga-eturu ugo.

Ndị na-awagharị n’ọchịchịrị ahụla nnukwu ihe; ihe achakwasala ndị bi n’ala onyinyo ọnwụ. I meela ka obi ha jupụta n’ọñụ. Ha na-añụrị nnukwu ọñụ dịka a na-ewe ihe ubi.

Obi na-atọ ha ụtọ dịka a na-eke ihe a lụtara n’agha. Maka na dịka n’ụbọchị Midia, Ị kụpịala ibu ha bu n’ubu nke na-anyịda ha ala. Ị gbajiela osisi nọ ha n’ubu na mkpara igwe nke onye ji aka ike na-amanye ha amanye.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 26:1-4.13-14 Az. 1

Azịza: Onyenweanyị bụ ihe m na nzọpụta m.

1. Onyenweanyị bụ ihe m na nzọpụta m.

Onye ka m ga-atụrụ egwu?

Onyenweanyị bụ ebe m na-agbaga ọsọ ndụ.

Ọ bụ onye ka m ga-asọ anya? Azịza.

2. Sọ otu ihe ka m na-arịọ n’aka Onyenweanyị.

Lee sọ ihe m na-achọ;

ka m biri n’ụlọ Onyenweanyị n’ụbọchị ndụ m niile.

Ka m na-ahụ ịdị ụtọ nke Onyenweanyị,

bịakwa na-atụgharị uche n’Ụlọ Nsọ Ya. Azịza.

3. Ekwere m na aga m ahụ obi ọma nke Onyenweanyị n’ala ndị dị ndụ.

Were obisike chere Onyenweanyị.

Ee, chere Onyenweanyị. Obi sie Gị ike. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:10-13.17

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt

Isi Okwu: Kpezienụ esemokwu dị n’agbata ụnụ.

Ụmụnna m! Eji m aha Onyenweanyị Jesu Kristi na-arịọ ụnụ ka olu ụnụ bụrụ otu; ka ụnụ na-ekwekọrịta ihe ibe ụnụ na-ekwu; ka nkewa gharakwa ịdị n’etiti ụnụ.

Kama dịrịnụ n’otu. Jikọọnụ onwe ụnụ n’otu n’echiche na n’ihe ụnụ na-ezube ime. Ụmụnna m, n’ihi na ụfọdụ mmadụ ndị si na ezi na ụlọ Kloi akọọrọla m, na esemokwu dị n’etiti ụnụ.

Ihe m na-ekwu bụ nke a: na olu ụnụ niile n’otu na-ada iche iche: Otu onye na-asị: “Abụ m onye nke Pọl”; onye ọzọ sị: “Abụ m onye nke Apọlọs”; onye ọzọ asị: “Abụ m onye nke Pita”; Onye ọzọ asịkwa: “Abụ m onye nke Kristi.” E kere Kristi eke? A kpọgidere Pọl n’obe n’ihi ụnụ?

Ma ọ bụ, e mere ụnụ mmirichukwu n’aha Pọl? Kristi eziteghị m ime ndị mmadụ mmirichukwu. Kama O zitere m izisa Oziọma. Ọ bụghị izisa ya n’amamihe nke ụwa, nke ọka-okwu na nke ịsụ asụsụ dara ụda ka a ghara ime ka ọnwụ Kristi nwụrụ n’elu obe bụrụ ihe efu.

MBEKU – Matiu 4:23

Aleluya, aleluya!

Jesu kwupụtara Oziọma nke alaeze, bịakwa gwọọ ndị na-arịa ọrịa.

Aleluya!

OZIỌMA – 4:12-23

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Ọ gara biri na Kapanọm, wee si otu a mezuo amụma Aịzaya buru.

Oge Jesu hụrụ na e jidela Jọn onye na-eme mminichukwu tụnye ya n’ụlọ mkpọrọ, O wezugara onwe Ya jee Galili. Ọ hapụrụ Nazaret, jee biri na Kapanọm nke dị n’ụsọ osimiri, n’oke ala Zebulọn na nke Neftali.

O mere nke a ka okwu nke Aịzaya onye amụma kwuru wee mezuo, sị: “Ala Zebulọn na ala Neftali, nke dị n’ụsọ osimiri, n’ofe ọzọ nke Jọdan. Galili nke ndị mba ọzọ!

Ndị bi n’ọchịchịrị ahụla oke ihe. Ihe achakwasịla ndị bi n’ala nke onyinyo ọnwụ.” Site n’oge ahụ, Jesu malitere ikwusa okwu sị: “Chegharịanụ, n’ihi na alaeze eluigwe adịla nso.”

Ma mgbe Jesu na-aga n’akụkụ osimiri Galili, Ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saịmọn onye a na-akpọ Pita, na Andrụ nwanne ya, ka ha na-awụnye ụgbụ ha na mmiri, n’ihi na ha bụ ndị ọkụ azụ.

Jesu wee sị ha: “Bịanụ so M n’azụ! Aga m eme ụnụ ndị ọkụ na-akụta mmadụ dịka e si akụta azụ.” Ngwa ngwa, ha wee hapụ ụgbụ ha na nna ha wee sobe Ya.

Mgbe Jesu si ebe ahụ na-agaje, Ọ hụrụ ụmụnne abụọ ọzọ, bụ Jemis na Jọn, ụmụ Zebedi, ka ha na nna ha nọ n’ụgbọ, na-emezi ụgbụ ha. Jesu wee kpọọ ha.

Ngwa ngwa, ha wee hapụ ụgbọ ha na nna ha wee sobe Ya. Jesu wee na-ejegharị n’obodo niile nke Galili na-akuzi ihe n’ụlọ nzukọ ha, na-ekwusakwa Oziọma nke alaeze Chineke. Ọ gwọkwara ndị mmadụ ọrịa dị iche iche na nrịa nrịa dị iche iche nke na-arịa ha.

Igbo Mass Readings for January 26 2026, Mọnde Izuụka nke Atọ N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for January 25 2026, Ụka nke Atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Last Update: July 3, 2023