Igbo Mass Readings for January 26 2025, Ụka nke Atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 26 2025, Ụka nke Atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8: 2-6, 8-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Nehemaya
Isi Okwu: Ezra siri n’Akwụkwọ Iwu Chineke gụpụtara ha ihe. Ndị mmadụ ghọtara ihe a gụrụ.
Ezra, onye ụkọchukwu, butere Akwụkwọ Iwu n’ọgbakọ ndị mmadụ; ndị nọ n’ọgbakọ ahụ bụ ndị nwoke, ndị nwanyị na ụmụ ntakịrị ndị toruru ogo ịghọta ihe.
O guzoro na mbara chere ihu n’ọnụ ụzọ a na-akpọ ọnụ ụzọ mmiri, n’ihu ndị nwoke, ndị nwanyị na ụmụ ntakịrị ndị toruru ogo ịghọta ihe, wee gụpụtara ha akwụkwọ a, bido n’isi ụtụtụ ruo n’ehihie.
Mmadụ nịile gere ntị nke ọma ịnụ ihe si n’Akwụkwọ Nke Iwu ahụ. Ezra onye Ode-akwụkwọ guzoro n’elu mkpumkpu eji osisi were rụọ maka ihe a. Ebe ọ bụ na o guzoro n’ebe dị elu, mmadụ niile hụrụ ya nke ọma.
O wee meghee Akwụkwọ Iwu; mgbe o meghere ya, mmadụ niile kulitere ọtọ. Ezra abịa too Chineke. Chukwu ebuka! Mmadụ niile chilie aka ha elu zaa. “Amen, Amen.” Ha wee hulata isi, kpudo ihu n’ala, bịakwa tụọ onwe ha n’ala n’ihu Chineke.
Ezra ebido gụpụtara ha Iwu nke Chineke, na-akọwara ha ihe ọ pụtara, nke mere na ndị mmadụ ghọtachara ihe a gụpụtara. Oge ahụ, onye eze bụ Nehemaya, na Ezra onye ụkọchukwu na ode akwụkwọ, na ndị si n’agbụrụ Livaị, ndị na-akuziri ndị mmadụ ihe, gwa ọgbakọ igwe mmadụ ahụ sị: “Taa bụ ụbọchị dị asọ n’ebe Dinwenụ Chineke ụnụ nọ.
Ụnụ erule uru, ụnụ ebela akwa.” N’ihi na anya mmiri juputara mmadụ niile anya mgbe ha gechara ntị n’Iwu nke Chineke. O wee gwakwa ha sị: “Laanụ, rienụ nri mara abụba, ñụọnụ mmanya dị ụtọ mana nyetụkwanụ onye nke na-enweghị ihe ọ na-eri.
N’ihi na taa dị asọ n’ebe Dinwenụ anyị nọ. Ụnụ ewela iwe, n’ihi na ịñụrị ọñụ na Dinwenụ bụ mgbasi ike nke ụnụ.”
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 18:8-10.15 Az. 3 Jọn 6:63
Azịza: Onyenweanyị, okwu Gị bụ mmụọ, ha bụkwa ndụ.
1. Iwu nke Onyenweanyị zuru oke,
ha na-akpalite obi elu.
Ọchịchị nke Onyenweanyị kwesịrị ntụkwasị obi,
ha na-enye ndị umeala amamihe. Azịza
2. Iwu nke Onyenweanyị ziri ezi,
ha na-enye obi añụrị.
Iwu nke Onyenweanyị doro anya,
ha na-enye anyị ihe. Azịza
3. Ịtụ egwu nke Onyenweanyị dị asọ.
Ọ na-akwụdosi ike ruo mgbe ebighị ebi.
Iwu nke Onyenweanyị bụ eziokwu,
ha niile ziri ezi. Azịza
4. Onyenweanyị, ka okwu ọnụ m,
na echiche obi m,
nwetara m amara n’ihu Gị.
Gị bụ onye ogbugbo m, na nkume m. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 12:12-30
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt.
Isi Okwu. Ụnụ niile jikọrọ ọnụ bụrụ ahụ Kristi; ma onye ọ bụla n’ime ụnụ bụ akụkụ ahụ Ya.
N’ihi na dịka ahụ mmadụ si bụrụ otu ahụ, nke nwere ọtụtụ akụkụ ahụ dị iche iche, otu a ka ọ dịkwa na Kristi. Ma ọbụ ezie na akụkụ ahụ dị ọtụtụ, ma ha niile jikọrọ ọnụ bụrụ otu ahụ.
N’ihi na e meela anyị niile mmirichukwu n’ime otu Mmụọ Nsọ ahụ, wee mee ka anyị banye n’otu ahụ Kristi ahụ, ma anyị bụ ndị Juu ma ọ bụ ndị Grik; ma anyị bụ ndị ohu, ma ọ bụ ndị nweere onwe ha.
E mekwaala ka anyị niile ñụọ ọbara Ya n’ime njikọ nke otu Mmụọ Nsọ ahụ. Otu ọ dị, ọ bụghị naanị otu akụkụ ahụ ka mmadụ nwere. Kama akụkụ ahụ mmadụ dị ọtụtụ.
(Ma ọ bụrụ na ụkwụ ga-asị, “N’ihi na abụghị m aka, esoghịkwa m bụrụ ahụ,” nke a ọ ga-eme ka ọ ghara ịbụ akụkụ ahụ mmadụ? Ọ bụrụkwa na ntị ga-asị, “N’ihi na abụghị m anya, esoghịkwa m bụrụ ahụ,” nke a ọ ga-eme ka ọ ghara ịbụ akụkụ ahụ mmadụ?
Ọ bụrụ na ahụ niile bụ sọ otu ogbe anya, gịnị ka a ga-eji añụ ihe ọñụñụ? Ọ bụrụkwa n’ahụ niile bụ sọ otu ogbe ntị, kedụ ka a ga-esi anụ ihe ọ bụla?
Ma otu ihe si dị, Chineke maara ihe kpatara O jiri debe akụkụ ahụ dị iche iche n’ime otu ahụ mmadụ. Ma a si na akụkụ ahụ mmadụ niile bụ sọ otu ihe na ibe ya ahụ, kedụ ka a ga-esi akpọ ya ahụ mmadụ?
Ma otu ọ dị, ọ bụ ezie na akụkụ ahụ mmadụ dị ọtụtụ, ma ha niile jikọrọ ọnụ bụrụ otu ahụ. Ya mere, anya apụghị ịsị aka: “Ị dịghị m mkpa!” Ọzọ kwa, isi apụghị ịsị ụkwụ, “Ụnụ adịghị m mkpa!” Kama, ọ bụna akụkụ ahụ ndị a na-eche na ha esighị ike ọ bụla, bụ ndị dị mkpa karisia.
Akụkụ ahụ ndị anyị na-eche na ha ekwesịghị nsọpụrụ ka ibe ha, ka anyị na-asọpụrụ karịa. Akụkụ ahụ ndị na-adịghị mma n’anya igosi n’ihu ọha ka anyị na-kpachapụrụ anya karisia.
Anyị na-akpachapụrụ ha anya, otu akụkụ ahụ anyị ndị mara mma igosi n’ihu ọha, na-adịghị achọ. Ma Chineke jiri aka Ya gwakọta akụkụ ahụ niile n’otu n’ụzọ gbara mmadụ gharịị.
O weere akụkụ ahụ ndị mmadụ na-eleda anya, debe ha n’ọnọdụ mmadụ ga-asọpụrụ ha. O mere nke a ka nkewa ghara ịdị n’ahụ. Kama ka akụkụ ahụ niile n’otu dịrịta ibe ha mkpa.
Ka ọ ga-abụ, mgbe otu akụkụ ahụ nọ n’ihe ụfụ, akụkụ ahụ ndị ọzọ esoro ya hụkọọ ahụhụ n’otu. Ka ọ ga-abụkwa, mgbe a na-enye otu akụkụ ahụ otito, akụkụ ahụ ndị ọzọ esoro ya ñụrịkọọ ọñụ).
Ma otu ọ dị, ụnụ onwe ụnụ bụ ahụ nke Kristi, bụrụkwa n’otu n’otu akụkụ ahụ Ya. (Ma Chineke ahọpụtala n’ime Nzukọ Ya, ndị ọrụ dị iche iche; nke mbụ, ndị Ụmụazụ; nke abụọ, ndị amụma, nke atọ ndị nkuzi.
Ndị ọzọ so ha bụ ndị na-arụ ọrụ ebube, na ndị e nyere onyinye amara dị iche iche ịgwọ ndị ọrịa; na ndị nwere mmụọ inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ dị iche iche, na ndị nwere mmụọ ọchịchị, na ndị nwere ike ịsụ asụsụ dị iche iche.
Ha niile abụghị ndị Ụmụazụ. Ha niile abụghị ndị amụma. Ha niile abụghịkwa ndị nkuzi. Ha niile abụghị ndị na-arụ ọrụ ebube. Ha niile enweghị onyinye amara ịgwọ ndị ọrịa. Ha niile ejighị asụsụ dị iche iche na-ekwu okwu. Ha niile enweghịkwa ike ịkọwa asụsụ).
MBEKU – Luk. 4:18
Aleluya, Aleluya!
Onyenweanyị, ziga m ka m bugara ụmụ ogbenye Oziọma; ka m zie ndị e ji na mkpọrọ ozi na ha enwerela onwe ha.
Aleluya!
OZIỌMA – 1:1-4, 4:14-21
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Isi Okwu: Taa ka a na-emeju okwu ndị a.
Ezigbo Tiofilọs, ị ma nke ọma na ọtụtụ mmadụ akpọla ya ọrụ ide n’akwụkwọ, akụkọ maka ihe niile Chineke mezurula n’etiti anyị. Ha dere akụkọ ha, dịka ndị sitere na mmalite ji anya ha hụ ihe merenụ, na dịka ndị e kenyere ọrụ ichekwaba na izisa ozi nke okwu Chineke, nke e nyere anyị n’aka idebe.
Tiofilọs dị oke ebube, nke a mere m ji chee na ọ dị mma, ebe m sitere na mbido mụtasịa ihe niile gbasara akụkọ ọma nke a, ka m deere gị n’usoro otu ihe niile si mee.
Ihe m ji deree gị ya n’akwụkwọ bụ ka i wee mụtasịa ezi okwu niile banyere Ozi nke a, e ji okwu ọnụ zie gị na mbụ. Jesu lọghachiri na Galili n’ike nke Mmụọ Nsọ.
Akụkọ banyere Ya wee gbasaa n’ala niile gbara ebe ahụ gburugburu. Ọ kụzikwara ihe n’ọtụtụ ụlọ nzukọ ndị Juu; mmadụ niile wee na-enye Ya otito. Jesu wee bịaruo na Nazaret, ebe a nọrọ zụpụta Ya.
O wee banye n’ụlọ nzukọ ha, n’ụbọchị izuike, dịka O si eme n’ebe ọzọ. O wee bilie ka Ọ gụọ ihe mmụta n’Akwụkwọ Nsọ. Ha nyere Ya obodobo Akwụkwọ onye amụma Aịzaya n’aka. O wee saghee obodobo akwụkwọ ahụ, chọta ebe e dere sị:
“Mmụọ nke Onyenweanyị adakwasala m; n’ihi na o teela m mmanụ izi ndị ogbenye Oziọma; O zipụtakwara m ikwusara ndị a dọtara n’agha ụzọ ha ga-esi nwere onwe ha; Na ịgwa ndị isi ụzọ ha ga-esi hụ ụzọ; Na izila ndị niile a na-emegbu emegbu ka ha nwere onwe ha.
Na ikwusa na afọ ezuola mgbe Onyenweanyị na-anara mmadụ nke ọma.” O wee kpuchie akwụkwọ ahụ, nyeghachi ya onye na-eje ozi, nọdụ ala. Mmadụ niile nọ n’ụlọ nzukọ ahụ wee wụkwasị Ya anya n’ihu. O wee malite ịgwa ha okwu, sị: “Taa, ka e mezuru na ntị ụnụ ihe e dere n’akụkụ ebe a M gụrụ n’Akwụkwọ Nsọ.”
Igbo Mass Readings for January 27 2025, Mọnde Izuụka nke Atọ N’Oge Nkịtị