Igbo Mass Readings for December 14 2025, Ụka nke Atọ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Mbụ
Nke a bụ Igbo Mass Readings for December 14 2025, Ụka nke Atọ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Mbụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 35:1-6, 10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya
Isi okwu: Chineke n’onwe Ya na-abịa ịzọpụta ụnụ
Ka ọzara na ala kpọrọ nkụ ñụrịa. Ka ịchakịrị ala ñụrịa mepụtakwa okooko. Eee! Ya mepụta okooko osisi mara mma. Ya ñụrịa ọñụ, kweekwa ukwe añụrị.
A ga-etuwe ya ugo e tuwere Lebanọn; bịakwa doo ya ebube e doro Kamel na Sharọn. Ha ga-ahụ otito nke Onyenweanyị, na ebube nke Chineke anyị.
Mee ka aka niile na-esighị ike, gbasie ike; ka ụkwụ niile na-ama jijiji n’ala guzosie ike. Ma gwanụ ndị obi ha na-ada mba sị: “Nwenụ obisike, egwu atụla ụnụ.”
Leenụ anya, Chineke ụnụ na-abịa. Ịbọ ọbọ na ịkwụghachi ụgwọ nke Chineke na-abịa. Ọ na-abịa ịzọpụta ụnụ. Mgbe ahụ ka a ga-eme ka ndị isi hụwa ụzọ; ka ndị ntị chiri nụwa ihe; ka ndị ngwọrọ wụlite elu dị ka ele; ka ire dara ogbi kwewe ukwe añụrị, n’ihi na ndị Onyenweanyị gbatara agbata ga-alọghachi.
Ha ga-etiri mkpu ọñụ bata na Zayọn; añụrị ebighị ebi anọrọchaa ha n’ihu. Añụrị na obi ọma ga na-eso ha. Ọnụma na ịkwa akwa ga-akwụsị.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 145:6-10 Aịz. 35:4
Azịza: Onyenweanyị, bịa zọpụta anyị (Ma ọ bụ Aleluya)
1. Ọ bu ya na-edowe nkwa O kwere ruo mgbe ebighị ebi.
Ọ na-enye ndị a na-emegbu emegbu ihe ruuru ha.
Ọ bụ Ya na-enye ndị agụụ na-agụ nri.
Ọ bụkwa Onyenweanyị na-eme ka ndị e ji eji nwere onwe ha. Azịza.
2. Onyenweanyị na-eme ka onye isi hụwa ụzọ.
Ọ na-ekulite ndị dara n’ala elu.
Ọ bụ Onyenweanyị na-echekwawa onye ọbịa.
Ọ bụkwa Ya na-egbo mkpa nwanyị isimkpe na nwamgbei. Azịza.
3. Onyenweanyị na-ahụ ndị eziomume n’anya;
bịakwa na-emebisi ụzọ ndị ajọ mmadụ.
Onyenweanyị ga-achịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Chineke nke Zayọn ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Azịza
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:7-10.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi nke Jemis dị asọ dere
Isi Okwu: “Obi adala ụnụ mba n’ihi na Onyenweanyị na-abịa ọsọọsọ”
Ụmụnna m, nweenụ ogologo ntachi obi ruo mgbe Onyenweanyị ga-abịa. Leenụ otu onye ọrụ ubi si ewere ndidi eche ubi ya nche ka ọ mịpụta ezi mkpụrụ dị oke ọnụ ahịa.
Ọ na-ewere ogologo ntachi obi, na-eche ubi ya, ruo mgbe ọ ga-enweta mmiri ozizo nke mbụ na nke ikpeazụ. Nwekwaanụ ogologo ntachi obi, ụnụ onwe ụnụ; Meenụ ka obi ụnụ guzosie ike, n’ihi na ọbịbịa nke Onyenweanyị dị nso.
Ụmụnna m, ụnụ atamula ntamu megide ibe ụnụ, ka Chineke ghara ikpe ụnụ ikpe. Lee, onye ọka-ikpe anyị, bụ Chineke guzo n’ọnụ ụzọ! Ụmụnna m, chetanụ ndị amụma ochie, ndị buru amụma n’aha Onyenweanyị.
Werenụ ha mere ihe ilere anya maka inwe ndidi na ogologo ntachi obi n’oge nhụju anya.
MBEKU – Luk 4:18
Aleluya, aleluya!
E nyela m mmụọ nke Onyenweanyị. Ozitela m ka m bugara ụmụ ogbenye Oziọma.
Aleluya!
OZIỌMA – 11:2-11
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Isi Okwu: Ị bụ Onye ahụ na-abịanụ, ka ọ bụ anyị tụwa anya onye ọzọ?
Mgbe Jọn nọ n’ụlọ mkpọrọ nụ maka ọrụ ebube niile Kristi na-arọ, o zigaara Ya ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya. Ọ gwara ha ka ha jụọ Jesu, sị: “Ọ bụ Gị bụ onye ahụ na-abịanụ, ka anyị ga-ele anya onye ọzọ”?
Jesu wee zaa ha, sị: “Jeenụ kọọrọ Jọn ihe ụnụ nụrụ na ihe ụnụ hụrụ: Ndị kpuru isi na-ahụzi ụzọ; ndị ngwọrọ na-agazi ije; e meela ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie; e ziela ụmụ ogbenye oziọma.
Ngọzi dịrị onye ọ bụla na-atụfughị okwukwe na M.” Ma mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn na-alaghachi, Jesu malitere ịgwa igwe mmadụ ahụ okwu banyere Jọn.
Ọ sị: “Mgbe ụnụ jekwuuru Jọn n’ọzara Judia, gịnị ka ụnụ jere ka ụnụ hụ? Ọ bụ ahịhịa ikuku na-ebugharị? Ọ bụzi gịnị ka ụnụ jere ka ụnụ hụ? Ọ bụ nwoke yi uwe ụlarị?
Ndị na-eyi uwe ụlarị na-ebi n’obi ndị eze! Gịnị kwa ka ụnụ pụrụ ka ụnụ hụ? Ọ bụ onye amụma? E, asị M ụnụ, ọ bụ onye kariri onye amụma. N’ihi na Jọn bụ onye ahụ e dere ihe banyere ya n’Akwụkwọ Nsọ sị: “Lee ana M ezipụ onye ozi M ka o buru Gị ụzọ gaa, Onye ga-edoziri Gị ụzọ tupu Gị abịa.
N’ịgwa ụnụ eziokwu, a bịa na ndị niile nwanyị mụrụ, ọ dịghị onye ọ bụla kariri Jọn onye ome mmirichukwu. Ma onye dịkarịsịrị nta n’alaeze eluigwe kariri Jọn.
Igbo Mass readings for December 15 2025,
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.