Connect with us

Igbo Mass Readings

Igbo Mass Readings For March 3 2024, Ụka Nke Atọ N’oge Lenti

Published

on

Igbo Mass Readings for March 3 2024, Ụka nke Atọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Abụọ

Nke a bụ Igbo Mass Readings for March 3 2024, Ụka nke Atọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 20:1-17

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ọpụpụ

Isi Okwu: E sitere n’aka Mosis nye iwu.

Ọ bụ Chineke tiri iwu niile ndị a: “Abụ M Dinwenụ Chineke gị onye kpọpụtara gị n’ala Ijipt, n’ala ahụ e jiri gị mere ohu. E nwela chi ọzọ beere sọ M. (A pịrịla onwe gị arụsị n’oyiyi ihe ọ bụla dị na mbara igwe ma ọ bụ nke dị n’elu ala, ma ọ bụ na mmiri dị n’okpuru ala.

Advertisement

Akpọrọla ha isi ala. E fekwala ha. N’ihi na Mụ onwe M bụ Dinwenụ Chineke gị bụ onye anya ọkụ. Ana M ewere ajọ omume nna bịa leta ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha ruo ndụdụgandụ nke atọ na nke anọ maka ndị kpọrọ M asị.

Ma ana M ehukwasa amara M n’isi nnụ kwuru nnụ ndị hụrụ M n’anya, na-edebe iwu M). A kpọla aha Dinwenụ Chineke gị na nkịtị, n’ihi na Chineke agaghị ahapụ iwere ahụhụ nye onye ọ bụla na-akpọ aha Ya na nkịtị.

Cheta ka i debe ụbọchị ụka asọ. (I nwere ụbọchị isii ịrụcha ọrụ gị niile; ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị ezumike Dinwenụ Chineke gị. Ị gaghị arụ ọrụ ọ bụla ụbọchị ahụ, ma gị, ma nwa gị nwoke, ma nwa gị nwanyị, ma ụmụ odibo gị nwoke ma ụmụ odibo gị nwanyị, ma anụ bi n’ụlọ gị, ma onye ọbịa bi na be gị.

N’ihi na n’ụbọchị isii ka Dinwenụ kechara eluigwe na ụwa, na osimiri na ihe niile dị n’ime ha. Ma n’ụbọchị nke asaa, O zuru ike. N’ihi nke a ka Dinwenụ jiri gozie ụbọchị ezumike, bịakwa doo Ya asọ). Sọpụrụ nna gị na nne gị ka i wee bie ogologo ndụ n’ala Dinwenụ Chineke gị na-enye gị.

Advertisement

E gbule ọchụ.

A kwala iko

E zula ohi

A gbala ama asị gbagide mmadụ ibe gị.

Advertisement

E nwela anya ukwu n’ebe nwunye mmadụ ibe gị nọ. E nwela anya ukwu n’ọkụ mmadụ ibe gị, ma ọ bụ ụlọ ya, ma ọ bụ ohu ya nwoke, ma ọ bụ ohu ya nwanyị, ma ọ bụ ehi ya, ma ọ bụ ịnyịnya ya, ma ọ bụ ihe ya ọ bụla.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 18:8-11 Az. Jn. 6:69

Azịza: Onyenweanyị, ọ bụ Gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi.

1. Iwu nke Onyenweanyị zuru oke.

Ọ na-enye agbamume n’obi.

Advertisement

Iwu nke Onyenweanyị kwesịrị ntụkwasị obi.

Ọ na-enye onye umeala amamihe. Azịza.

2. Atụmatụ nke Onyenweanyị ziri ezi;

ha na-enye obi añụrị.

Advertisement

Iwu nke Onyenweanyị doro anya;

Ọ na-enye anyị ihe. Azịza.

3. Egwu nke Onyenweanyị dị asọ;

Ọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.

Advertisement

Usoro iwu nke Onyenweanyị bụ ezi okwu;

Ha niile kwụgbado ọtọ. Azịza.

4. Ha niile dara oke ọnụ karịa ọlaedo;

Karịchaa ọlaedo kachasị na mma.

Advertisement

Ha na-atọ ụtọ karịa mmanụ añụ;

Karịakwa mmanụ añụ si n’ụbụbọya pụta. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:22-25

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt

Isi Okwu: Anyị nọ n’ebe a, na-agbasa ozi nke Kristi a kpọdoro n’obe; ọ bụ ihe mgbachi ụzọ n’ebe ndị mmadụ nọ; ma n’ebe ndị a họtara ahọta nọ, ọ bụ amamihe Chineke.

Advertisement

Ndị Juu na-achọ ihe ịrịba-ama; ndị Grik na-achọ amamihe. Ma anyị onwe anyị na-ekwusa Kristi, Onye a kpọgburu n’obe; n’ebe ndị Juu nọ, ọ bụ ọdachi dachiri ụzọ; bụrụkwa isi mgbaka n’ebe ndị mba ọzọ nọ.

Ma n’ebe ndị niile Chineke kpọrọ nọ, ma ndị Juu ma ndị Grik, Kristi bụ ike nke Chineke na amamihe nke Chukwu. N’ihi na nzuzu Chineke kariri amamihe nke mmadụ. Ọzọ, adịghị ike Chineke karikwara ịdị ike nke mmadụ.

MBEKU – Jọn 11:25-26

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

Onyenweanyị kwuru sị: Mụ onwe M bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ. Onye ọ bụla kwere na M agaghị anwụ ma ọlị.

Advertisement

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

OZIỌMA – 2:13-25

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Isi Okwu: Mebienụ Ụlọ Nsọ a, aga M arụchikwa ya n’ụbọchị nke atọ.

Mgbe oge Emume Ngabiga nke ndị Juu na-eru nso, Jesu jere Jerusalem. N’Ụlọ Nsọ, ka Ọ hụrụ ndị na-ere ehi, na atụrụ na nduru, na ndị na-agbanwo ego ka ha nọ ọdụ n’oche.

Advertisement

Jesu weere ụdọ mee ụtalị, si n’Ụlọ Nsọ chụpụ anụ ahụ niile, ma atụrụ ma ehi. O wee kpuo oche ndị na-agbanwo ego ihu n’ala fesaa ego ha. Ọ sịrị ndị na-ere nduru: “Chịpụnụ ihe ndị a n’ebe a!

Ụnụ ejila ụlọ Nna M emere ụlọ ahịa!” Ndị Ụmụazụ Ya wee cheta na-edere ya n’Akwụkwọ Nsọ, sị: “Ihe banyere ụlọ Gị na-agụ m oke agụụ n’obi.” Ndị Juu wee jụwa Ya, sị: “Ole ihe ịrịba-ama Ị ga-eji egosị anyị na ihe a I mere ziri ezi?

Jesu wee zaa ha sị: “Kwatuonụ Ụlọ Nsọ nke a. Aga M ewuchikwa ya n’ụbọchị atọ.”Ndị Juu wee tie mkpu sị: “Iri afọ anọ na isii ka e ji wuo Ụlọ Nsọ a. Olee otu Ị ga-esi wulie ya n’ụbọchị atọ”?

Ma Jesu na-ekwu banyere Ụlọ Nsọ nke bụ ahụ Ya. Ya mere, mgbe O siri n’ọnwụ bilie, Ụmụazụ Ya chetara na O kwuru ya ekwu. Ha wee kwere n’Akwụkwọ Nsọ na n’okwu Jesu kwuru.

Advertisement

Mgbe Jesu nọ na Jerusalem, n’oge Emume Ngabiga, ọtụtụ mmadụ kweere n’aha Ya, n’ihi na ha hụrụ nnukwu ihe ịrịba-ama nke Ọ na-arụ. Ma Jesu atụkwasịghị ha obi n’ihi na Ọ maara nke ọma ihe dị n’obi mmadụ niile.

Ọ dịghị Ya mkpa ka onye ọ bụla kọọrọ Ya ihe banyere ụmụ mmadụ. N’ihi na Ya onwe Ya maara ihe dị n’obi mmadụ.

Igbo Mass Readings for March 4 2024, Mọnde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi

Igbo Mass Readings for March 3 2024, Ụka nke Atọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Abụọ.

Advertisement

Catholic Lector is the founder of Catholiclectionary.com. I am a Theologian, a commissioned Lector, and Liturgy Minister. I lead the team that operates Catholiclectionary.com which is a Catholic Church-related website that provides you, on daily basis, with the following: (a) Catholic Daily Mass Readings (b) Reflections on the Daily Mass Readings (c) Daily Prayers (d) Catholic Hymns, and (e) Saints of the Day. I and my team work for the collective growth in spiritual lives of all the faithful.

Advertisement

Get Daily Mass Readings through Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.