Igbo Mass Readings for March 23 2025, Ụka nke Atọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Atọ
Nke a bụ Igbo Mass Readings for March 23 2025, Ụka nke Atọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Atọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-8, 13-15
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ọpụpụ
Isi Okwu: “Abụ M”, ezitela M n’ebe ụnụ nọ.
Mosis na-elekọta igwe atụrụ ọgọ ya nwoke Jetro, onye bụ nna nwunye ya na ụkọchukwu nke Midia. Ọ chịịrị igwe atụrụ ya gaa ebe dị anya n’ime ọzara wee rute ugwu Horeb, nke bụ ugwu Chineke.
Ebe ahụ ka Mmụọ ozi nke Onyenweanyị bịakwutere ya n’ụdị ire ọkụ si n’etiti oke ọhịa. Mosis elee anya hụ ọhịa ma ọ dịghị ihe ọ bụla rechapụrụnụ. Mosis ewere kwuo sị: Aga m eje hụkwa ihe ịtụnanya nke a ugbu a. Onyenweanyị hụrụ ya mgbe ọ na-eje ka o jiri anya ya hụ.
O wee si n’ime etiti ọhịa ahụ kpọọ Mosis sị ya: “Mosis Mosis!” Ọ zara: “Lee m ebe a.” Ọ sị ya: “A bịakwala nso. Yipụ akpụkpọ ụkwụ gị n’ihi na ala ebe i guzo dị asọ. Abụ M Chineke nke nna gị. Chineke nke Ebreham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.”
Nke a mere Mosis ji kpuchie aka n’ihu ya; egwu ekweghị ya legide Chineke anya n’ihu. Onyenweanyị ekwuo sị: Ahụla M mmegbu a na-emegbu ndị nke M n’ala Ijipt.
Anụla M mkpu ha na-eti ka a bịa zọpụta ha n’aka ndị na-achị ha ka ohu. N’ezie, amatala M ahụhụ ha niile. Ọ bụ uche M ịgbapụta ha n’aka ndị Ijipt wee si n’ala ahụ duru ha dubata n’ala na-amịta nri n’uju bịakwa saa mbara; ala nke mmiri ara na mmanụ añụ jupụtara.
Mosis ewee sị Chineke: “Ihe ọ pụtara bụ na aga m ejekwuru ụmụ Izrel sị ha: “Chineke nke nna ụnụ ha zitere m ka m bịakwute ụnụ. “Mana ọ bụrụ na ha ajụọ m aha Ya, kedụ ihe m ga-agwa ha?”
Chineke asị Mosis: “Abụ M, Onye M bụ.” Nke a bụkwa ihe ị ga-agwa ụmụ Izrel: “Abụ M ezitela m ka m bịakwute ụnụ. “Chineke gwakwara Mosis okwu sị: “Ị ga-agwakwa ụmụ Izrel sị: Dinwenụ, Chineke nke nna ụnụ ha, Chineke nke Ebreham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb, ezitela m na-ebe ụnụ nọ. Nke a bụ aha m mgbe niile; site n’aha nke a ka a ga-eji kpọkuo M na ndụdụgandụ niile.”
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 102: 11-4,6-8, 11 Az. 8
Azịza: Dinwenụ bụ ebere na ịhụnanya.
1. Mkpụrụobi m nye Dinwenụ ekele.
Ka ihe niile m ji bụrụ mmadụ gọzie aha nsọ Ya.
Mkpụrụobi M nye Dinwenụ ekele.
E chefukwala ngọzi Ya niile.
Azịza: Dinwenụ bụ ebere na ịhụnanya.
2. Ọ bụ Ya na-agbaghara mmehie gị niile.
Ya bụ onye na-agwọ ọrịa gị niile;
onye na-esi n’ili a kpọghachi ndụ gị.
Ịhụnanya na ebere bụ okpu eze O nyere gị.
Azịza: Dinwenụ bụ ebere na ịhụnanya.
3. Dinwenụ na-eme ihe ziri ezi.
Ọ na-ekpere ndị a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi.
Ọ kụziiri Mosis ụzọ Ya;
Gosịkwa ụmụ Izrel aka ọrụ Ya.
Azịza: Dinwenụ bụ ebere na ịhụnanya.
4. Dinwenụ bụ ebere na ịhụnanya;
Ọ naghị ewe iwe ọkụ, ebere Ya ebuka.
Otu eluigwe si dị anya n’ebe ala dị,
otu ahụ ka ịhụnanya Ya si sie ike n’ebe ndị na-atụrụ Ya egwu nọ.
Azịza: Dinwenụ bụ ebere na ịhụnanya.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 10:1-6, 10-12
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt
Isi Okwu: “E dere akụkọ banyere ndụ ndị mmadụ na Mosis n’ime ọzara iji kuziere anyị ihe.”
Ụmụnna m, achọrọ m ka ụnụ cheta njem ndị nna nna anyị ha jere n’okpuru igwe ojii ahụ, nke duuru ha kụfee osimiri ahụ. N’ime otu igwe ojii ahụ na n’ime otu oke osimiri ahụ, e mere ha niile mmirichukwu dị ka ndị na-eso ụzọ Mosis.
Ha niile so rie otu nri nke mmụọ ahụ. Ha niile sokwa ñụọ otu ihe ọñụñụ nke mmụọ ahụ, ebe ọ bụ na ha niile ñụrụ mmiri mmụọ ahụ si na nkume ahụ nke na-eso ha mgbe ha na-eje.
Ma nkume ahụ bụ Kristi. Ma n’ihe ndị a niile, ndị ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha emeghị omume masịrị Chineke. N’ihi ya ka ozu ha jiri fesaa n’ime ọzara. Ma ihe ndị a bụụrụ anyị ihe ọmụma atụ na ihe ịdọ aka na ntị, ka anyị ghara ịbụ ndị agụụ, na-agụ ime ihe a machiri n’iwu, dịka ọ gụrụ nna nna anyị ha.
Ka anyị ghara ịtamu ntamu, dịka ụfọdụ n’ime ha tamuru; “Mmụọ ozi nke Mbibi ahụ” wee laa ha n’iyii. Ihe ndị a dakwasịrị ha bụ ihe ịdọ aka na ntị. E dere ha n’Akwụkwọ Nsọ ka anyị bụ ndị bi ugbu a bụ ngwụcha nke oge jiri ya mụrụ akọ.
Ọ bụrụ na Ị na-eche n’obi gị na i nweghị ike ime ihe ndị a, leziekwa onwe gị anya, n’ihi na Ị pụrụ ịdabakwa na mmehie.
MBEKU – Matiu 4:17
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Dinwenụ kwuru sị: chegharịanụ, n’ihi na alaeze eluigwe adịla nso.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 13:1-9
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Isi Okwu: Ọ bụrụ na ụnụ echegharịghị, ụnụ ga-anwụfu otu ha si nwụfuo.
Ọ bụ n’oge ahụ ka ụfọdụ mmadụ batara kọọrọ Jesu maka ndị Galili ahụ Paịlet gwakọtara ọbara ha na aja ha na-achụ. Jesu wee jụọ ha, sị: “Ụnụ chere na ndị Galili ahụ hụrụ ụdị ahụhụ ahụ n’ihi na njọ ha kariri njọ ibe ha?
Mba! Ọ karịghị! Mana agwa M ụnụ, ọ bụrụ na ụnụ echegharịghị, ụnụ niile ga-esikwa otu ahụ wee laa n’iyii. Ma ọ bụ kedụ maka mmadụ iri na asatọ ahụ ụlọ elu dagburu na Siloam?
Ụnụ na-eche na njọ ha metara karịrị nke mmadụ nke ndị ọzọ bi na Jerusalam? Ọ karịghị! Mana ana M agwa ụnụ, ọ bụrụ na ụnụ echegharịghị, ụnụ ga-esikwa otu ahụ wee laa n’iyi. Jesu wee tụọrọ ha ilu a: “Otu nwoke nwere osisi fiigi a kụrụ n’ubi ya.
Nwoke ahụ bịara ịchọ mkpụrụ n’elu ya, ma o nweghị nke ọ hụrụ. O wee sị onye na-elekọtara ya ubi ya: “Lee, kemgbe afọ atọ ka m na-abịa, na-achọ mkpụrụ fiigi a, ma o nweghị nke m na-ahụ. Gbuda ya!
Kedụ ihe ọ na-agbakpọrọ m ala? Ma onye na-elekọta ubi zara ya: Nna anyị ukwu, hapụkwuo ya n’afọ a; ka m gwuo ala gburugburu n’ukwu ya, wụsa ya ahịhịa rere ere. Ọ bụrụ na ọ mịa mkpụrụ n’afọ ọzọ, ọ dị mma; ma ọ bụrụ na ọ mịghị, i nweziri ike gbuda ya.'”
Igbo Mass Readings for March 24 2025, Mọnde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi
Igbo Mass Readings for March 23 2025, Ụka nke Atọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Atọ.