Igbo Mass Readings for August 31 2025, Ụka nke Iri Abụọ na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 31 2025, Ụka nke Iri Abụọ na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:17-20.28-29

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Sirak

Isi Okwu: Butuo onwe gị ka i were nweta amara n’ihu Chineke.

Nwa m, were obi umeala na-arụ ọrụ dịịrị gị. Nke a ga-eme ka a hụ gị n’anya karịa onye na-enyefusi akụ na ụba ya. Mgbe ọkwa gị rịgooro elu karịa, mgbe ahụ ka ị ga-ebuda onwe gị n’ihe niile karịa, ka i were nweta amara n’ihu Onyenweanyị.

Ọ bụ ezie na ike Onyenweanyị ebuka, ma Ọ na-anara ofufe onye obi umeala. Ọrịa onye nganga enweghị ngwọta n’ihi na ihe ọjọọ agbaala mgbọrọgwụ n’ime ya. Mkpụrụobi onye nwere ọgụgụ isi ga na-enweta amamihe; ntị maara ihe ji ezigbo obi anụrụ okwu nke amamihe.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 67:4-7.10-11 Az. 11

Azịza: Chineke, i ji obi ọma Gị kwadooro ndị ogbenye ebe obibi.

1. Ndị ezi omume ga-añụrị ọñụ na egorikwa n’ihu Chineke.

Ha ga na-ete egwu ọñụ.

Kweerenụ Chineke ukwe; bụọrọnụ aha Ya abụ.

Aha Ya bụ Dinwenụ. Azịza

2. Nna nke ụmụ ogbenye,

Onye nchedo ụmụ nwanyị isimkpe,

Ya ka Chineke bụ n’ụlọ nsọ Ya.

Chineke, Onye na-enye ndị na-enweghị ụlọ ebe obibi.

Ọ na-eme ka ndị e ji eji nwere onwe ha. Azịza.

3. Chineke, I meela ka nnukwu mmiri zoo.

Mgbe ndị nke Gị dara mba, I nyere ha ndụ ọhụrụ.

Chineke anyị, ọ bụ n’ebe ahụ ka ndị nke Gị chọtara ụlọ obibi,

nke I kwadoro ndị ogbenye n’obi ọma Gị. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 12:18-19. 22-24

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi e degaara ndị Hibru

Isi Okwu: Ụnụ abịaruola n’ugwu nke Zayọn, na obodo Chineke dị ndụ.

Ụnụ abịaruola nso n’ugwu ahụ, a naghị emetụ aka, na ọkụ ore gidi gidi, ma ọ bụ ọchịchịrị, na itiri, na oke ifufe, na ụda opi na egbe eluigwe, na ụda olu, ndị mmadụ nụrụ wee rịọ ka a ghara ịgwa ha okwu ọzọ.

Kama ụnụ bịarutere n’Ugwu Zayọn, nke bụ obodo mara mma nke Chineké dị ndụ. Ọ bụkwa Jerusalem nke eluigwe, ebe nnụ kwụrụ nnụ, ndị mmụọma zukọrọ na mmemme.

Ha na Nzukọ niile, ebe onye ọ bụla bụ diọkpara na diala nke eluigwe. Ụnụ bịakwutere Chineke n’onwe Ya, Diokpe bụ E Kwuchaa Ọ Gwụ. E dokọtara ụnụ na mmụọ nke ndị nsọ, ndị e merela ka ha zuo oke. Ụnụ bịakwutere Jesu, Onye bụ Ọgba Ụkọ nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ.

MBEKU – Matiu. 11:29

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị kwuru sị: “Burunụ ibu M n’ubu ụnụ, sinụ n’aka M mụrụ ihe; n’ihi na adị M nwayọọ, dịkwa obi umeala.

Aleluya.

OZIỌMA – 14:1,7-14

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Isi Okwu: Onye ọ bụla buliri onwe ya elu, a ga-ebuda ya. Ma onye ọ bụla budatara onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.

N’otu ụbọchị izuike, Jesu gara ebe a kpọrọ Ya oriri n’ụlọ otu onye isi nke ndị Farisii. Ndị mmadụ wee na-enyochapụta ihe Ọ ga-eme. Ma Jesu kwuru okwu banyere otu ụfọdụ mmadụ n’ime ndị a kpọrọ ya na ha oriri si ahọrọ naanị oche dị mkpa naanị oche dị mkpa.

O kwuru okwu a n’ilu sị: “Mgbe ọ bụla mmadụ kpọrọ ụnụ oriri agbamakwụkwọ, ụnụ ejila aka ụnụ buru ụzọ họrọ isi oche. N’ihi na eleghị anya, onye kpọrọ gị oriri kpọkwara onye ọzọ ka gị na nsọpụrụ.

Onye kpọrọ gị na ya ga-abịakwute gị sị: “Nye nwoke a oche.” N’oge ahụ ị ga-eji ihere ma bilie, gbada n’oche ikpeazụ. Mgbe ọ bụla mmadụ kpọrọ gị oriri, gaa nọdụ n’oche dịkarịsịrị ala, ka ọ ga-abụ, mgbe onye kpọrọ gị oriri batara, ya asị gị, ‘Enyi m, bilie gaa n’isi oche!’

Mgbe ahụ, Ị ga-enwe nsọpụrụ n’ihu ndị niile akpọrọ gị na ha oriri. N’ihi na onye ọ bụla na-eweli onwe ya elu, a ga-ebuda ya. Ma onye ọ bụla na-eweda onwe ya ala, a ga-eweli ya elu.”

Jesu wee sịkwa onye kpọrọ Ya oriri: “Mgbe ọ bụla i siri oriri, ma ọ bụ n’ehihie ma ọ bụ n’anyasị, a kpọla naanị ndị enyi gị, ma ọ bụ ụmụnne gị, ma ọ bụ ndị ikwu na ibe gị, ma ọ bụ ndị agbata obi gị bara ọgaranya.

N’ihi na ha ga-akpọkwa gị oriri n’ụlọ ha, wee si n’ụzọ dị otu a kwụghachi gị ụgwọ ihe ha riri n’ụlọ gị. Kama, mgbe ọ bụla i siri oriri ukwu, kpọọ ndị ogbenye na ndị ụbịam, ndị ngwụrọ na ndị ìsì.

Ọ ga-adị gị obi mma na ha bụ ndị na-enweghị ike ịkwụghachi gị ụgwọ ya; n’ihi na a ga-akwụghachi ụgwọ ya na mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume.”

Igbo Mass Readings for September 1 2025, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for August 31 2025, Ụka nke Iri Abụọ na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.