Igbo Mass Readings for September 17 2023, Ụka nke Iri Abụọ na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 17 2023, Ụka nke Iri Abụọ na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 27:30-28:7

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Sịrak

Isi okwu: Ọ bụrụ na ị gbaghara mmadụ ibe gị mmehie o mehiere gị, ị rịọ arịrịọ, a ga-agbaghara gị njọ gị.

Iwe na ọnụma jọrọ oke njọ. Ma onye mmehie jiri aka abụọ gudo ha n’obi. Ibọ ọbọ ga-anata ịbọ ọbọ n’aka Onyenweanyị, maka na ọ ga-echetacha mmehie ya niile.

Gbaghara mmegbu nke onye agbata obi gị megburu gị. I mee otu a, a ga-agbaghara mmehie nke gị mgbe i kpere ekpere. Mmadụ, o nwere ike iburu mmadụ ibe ya iro n’obi ma na-atụ anya na Onyenweanyị ga-agwọ ya?

Mmadụ, o nwere ike ịjụ imere mmadụ ibe ya ebere ma na-achọkwa ebere maka njọ nke ya? Ya bụrụ na ibu iwe na ọnụma n’obi na-amasị mmadụ bụ anụ ahụ, onye ga-agbaghara ya mmehie nke ya?

Cheta ụbọchị ikpeazụ gị. Wepụ aka n’ịkpọ asị. Cheta ọnwụ na ureghure. Wepụ aka na njọ. Cheta iwu Chineke. A kpọla mmadụ ibe gị asị. Cheta ọgbụgba ndụ nke onye kacha elu. Lefuru anya na mmehie e mehiere gị.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 102:1-4, 9-12. Az. 8

Azịza: Onyenweanyị dị ebere na obi ọma. Ọ naghị ewe iwe ọkụ. Obi ebere Ya ebuka.

1. Mkpụrụobi m gọzie Onyenweanyị.

Ihe niile dị n’ime m, too aha nsọ Ya.

Mkpụrụobi m, gọzie Onyenweanyị.

E chefukwala amara niile O meere gị. Azịza.

2. Ọ na-agbaghara gị arụ niile,

bịakwa na-agwọ gị ọrịa niile.

Ọ na-agbapụta ndụ gị na mbibi.

Ọ na-eji obi ọma na obi ebere ekpube gị okpu eze. Azịza.

3. Ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-aba mba,

ọ naghịkwa ebu iro na ọnụma n’obi ruo mgbe ebighị ebi.

Ọ naghị emesi anyị ike ka iwe Ya si dị.

Ọ naghị anacha anyị ụgwọ arụrụ ala niile anyị rụrụ. Azịza.

4. N’ihi na dịka eluigwe si karịa ala n’ịdị elu,

otu ahụ kwa ka obiọma Ya si buo oke ibu maka ndị na-atụrụ Ya egwu.

Dịka ọwụwa anyanwụ si tee anya n’ọdịda ya;

otu ahụ kwa ka o si eweti njọ anyị anya n’ebe anyị nọ. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 14:7-9

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara Ndị Rom

Isi Okwu: “Ma na ndụ, ma n’ọnwụ, anyị bụ nke Onyenweanyị.

E nweghị onye ọ bụla dị ndụ, sọ maka onwe ya. E nweghịkwa onye ọ bụla nwụrụ anwụ, sọ maka onwe ya. Ọ bụrụ na anyị dị ndụ, anyị dịịrị ya Onyenweanyị.

Ọ bụrụ na anyị nwụọ anwụ, anyị nwụụrụ ya Onyenweanyị. Ọ pụtara na, ma na ndụ ma n’ọnwụ, anyị bụ nke Onyenweanyị. Ihe a kọwara ihe kpatara Kristi ji nwụọ, bịakwa dị ndụ ọzọ. Ọ bụ ka O wee bụrụ Onyenwe ndị nwụrụ anwụ na ndị dị ndụ.

MBEKU – Jọn 13:34

Aleluya, aleluya!

Ana m enye ụnụ iwu ọhụrụ. Hụrịtaanụ onwe ụnụ n’anya dị ka m siri hụ ụnụ n’anya, Ọnyenweanyị n’ekwu.

Aleluya!

OZIỌMA – 18:21-35

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Asịghị M gị gbaghara sọ ugboro asaa; kama ugboro asaa, ugboro asaa, ụzọ iri asaa.

Pita bịakwutere Jesu, jụọ Ya sị: “Onyenweanyị, ugboro ole ka nwanne m ga-emehie megide m, m gbaghara ya? Ọ bụ ugboro asaa?” Jesu asị ya: “Mba! Ọ bụghị naanị ugboro asaa.

Kama ọ bụ ugboro iri asaa, ruo ụzọ asaa. N’ihi ya, e nwere ike iwere alaeze eluigwe, tụnyere otu eze kpebiri, na ya na ụmụodibo ya ga-apịazi akụ ya. Mgbe a malitere ịpịa akụ, a kpụtaara ya otu nwodibo ji ya ụgwọ ruru nde naịra abụọ.

Ma nwodibo ahụ enweghị ego e ji akwụ ụgwọ ahụ. Nna ya ukwu tiri iwu, ka e ree nwodibo ahụ, na nwunye ya na ụmụ ya, na ihe niile o nwere, iji reta ego e ji akwụ ụgwọ ahụ o jí.

Ma nwodibo ahụ dara n’ala, n’ụkwụ nna ya ukwu, rịọwa ya sị: ‘Nna m ukwu, biko, nwee ndidi; aga m akwụcha gị ụgwọ niile m ji.’ N’ihi ya, Onyenwe nwodibo ahụ jiri ebere, gbaghara ya ụgwọ niile ahụ o ji, wee hapụ ya ka ọ laa. “Ma nwodibo ahụ pụrụ, hụ nwodibo ibe ya ọzọ ji ya ụgwọ otu puku naịra.

O wee jidesie ya aka ike, machie ya aka n’akpịrị, sị ya: ‘Kwụọ m ụgwọ i ji m.’ Nwodibo ibe ya ahụ wee daa n’ala, rịọwa ya sị: ‘Biko nwee ndidi! Aga m akwụ gị ụgwọ gị.’

Ma o kweghị. Kama o jere tụba ya n’ụlọ mkpọrọ, ruo mgbe ọ kwụchara ya ụgwọ niile ahụ oji. “Mgbe ụmụodibo ibe ya hụrụ ihe o mere, o wutere ha hie nne.

Ha jere, kọọrọ nna ha ukwu ihe niile nwodibo ahụ mere. Nna ya ukwu kpọrọ nwodibo ahụ sị ya: “Ajọ odibo! Agbagharala m gị ụgwọ niile i ji m, n’ihi na ị rịọrọ m mgbaghara!

I cheghị na o kwesịrị ka i nwee obi ebere n’ahụ odibo ibe gị, dịka mụ onwe m si meere gị ebere?” “Nna ya ukwu were iwe nke ukwu, wee nyefee ya n’aka ndị ga-ata ya ahụhụ n’ụlọ mkpọrọ, ruo mgbe ọ kwụchara ụgwọ niile o ji, na-afọdụghị otu kọbọ.

“Otu a ka Nna M nke eluigwe ga-esi eme ụnụ, e wepụ ma onye ọ bụla n’ime ụnụ, o si n’ala obi ya gbaghara nwanne ya ihe ọ bụla o jiri mejọọ.”

Igbo Mass Readings for September 18 2023, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for September 17 2023, Ụka nke Iri Abụọ na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Last Update: July 11, 2023