Igbo Mass Readings for September 15 2024, Ụka nke Iri Abụọ na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 15 2024, Ụka nke Iri Abụọ na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 50:5-9

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya

Isi okwu: E were m azụ m nye ndị na-akụ m ihe.

Onyenweanyị Chineke na-emeghe ntị m ka m nụ ihe. Mụ onwe m enupụghị isi. Alaghachighị m azụ. Eweere m azụ m nye ndị na-akụ m ihe; bịakwa were ntị m nye ndị na efopụsị ahụ ọnụ.

Esepụghị m ihu m n’ebe ndị na-ekwa emu, na ndị na-agbụ m ọnụ mmiri nọ. Onyenweanyị Chineke bụ enyemaka m; n’ihi ya, ihere agaghị eme m. Agaghị m elekwa anya n’azụ.

O were m anya na ihere agaghị eme m. Onye na-ewelite aka nri m elu nọ nso. E nwere onye ọ bụla chọrọ ka mụ na ya chịpụ ya, ya bịa ka mụ na ya guzo ihu na ihu.

Onye ka mụ na ya ga-ekpe? Ya pụkwute m n’ogbo ikpe. Ị hụla na Onyenweanyị Chineke bụ enyemaka m. Ọ bụ onye ga-egosi na ikpe mara m?

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 114:1-6, 89, Az. 9

Azịza: Aga m aga n’ihu nke Onyenweanyị n’ala ndị dị ndụ. Ma ọ bụ Aleluya.

1. Ahụrụ m Onyenweanyị n’anya, n’ihi na Ọ nụla olu ekpere m;

n’ihi na O geere m ntị n’ụbọchị m kpọkuru Ya. Azịza.

2. Ụdọ ọnwụ gbara m gburugburu.

Ọnya nke ala mmụọ ejidela m.

Iwe na ọnụma juru m obi.

M wee kpọkuo aha Onyenweanyị:

“Onyenweanyị, zọpụta ndụ m.’ Azịza.

3. Onyenweanyị bụ onye amara na Onye aka Ya kwụ ọtọ.

N’ezie, Chineke anyị bụ onye ebere.

Ọ bụ aka na-echekwaba ụmụntakịrị.

E buturu m ala, ma Ọ zọpụtala m. Azịza.

4. N’ihi na Ọ tọhapụla mkpụrụ obi m n’ọnwụ.

O hichaala m anya mmiri n’anya,

bịakwa mee ka ụkwụ m ghara ịsọ ngọngọ.

Aga m aga n’ihu Onyenweanyị n’ala ndị dị ndụ. Azịza.

IHE ỌGUGU NKE ABỤỌ – 2:14-18

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Jemis dị asọ

Isi okwu: Okwukwe na-enweghị ezi ọrụ nwụrụ anwụ.

Ụmụnna m! Werenụ akụkọ onye na-ekwu na ya nwere okwukwe, ma e nwebeghị otu ọrụ ọma ọ bụla ọ rụrụ. Ụdị okwukwe ahụ, ọ ga-azọ ya? E nwee otu nwannne anyị nwoke, ma ọbụ nwanne anyị nwanyị, na-enweghị uwe ma ọ bụ ihe oriri ga-ezuru ya; ọ bụrụ na otu onye n’ime ụnụ asị ya: ‘Ya dịkwara gị mma!

Oyi atụkwala gị ọzọ! Rijukwaa afọ!’ n’enyeghị ya nke ọ bụla n’ihe ndị a e ji enyere ndụ aka, olee uru e ritere n’ekele ndị a? Otu ahụ ka okwukwe dị. Okwukwe na-enweghị ezi ọrụ nwụrụ anwụ.

Lee ihe a ga-agwa onye na-eme ụdị ihe a: “I kwuru na i nwere okwukwe, mana enwere m ezi ọrụ. Gosi m okwukwe gị na-enweghị ezi ọrụ, ka m were ezi ọrụ m gosi gị okwukwe m.”

MBEKU – Jọn 14:5

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị kwuru sị: “Abụ M Ụzọ, Eziokwu na Ndụ. O nweghị onye ọ bụla na-abịakwute Nna, e wepụ ma o si n’aka M.

Aleluya!

OZIỌMA – 8:27-35

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Isi okwu: Ị bụ Kristi. Nwa nke mmadụ aghaghị ịhụ ahụhụ.

Jesu na Ụmụazụ Ya pụrụ, na-agagharị n’obodo nta dị iche iche nke obodo Sizarịa Filipi. Mgbe ha na-aga n’ụzọ, Jesu jụrụ Ụmụazụ Ya, sị: “Onye ka ndị mmadụ na-asị na M bụ?”

Ha sị Ya: “Ụfọdụ na-ekwu na Ị bụ Jọn Ome Mmirichukwu; ụfọdụ na-ekwu na Ị bụ Ilaija; ndị ọzọ na-asị na Ị bụ otu n’ime ndị amụma.” O wee jụọ ha nke ha, sị: “Onye ka ụnụ onwe ụnụ na-eche na M bụ?”

Pita zara Ya sị: “Ị bụ Kristi” O wee dọọ ha aka na ntị ka ha ghara ịgwa onye ọ bụla na ya bụ Kristi. Jesu wee malite ikuziri Ụmụazụ Ya na: “Nwa nke Mmadụ aghaghị ịhụ ọtụtụ ahụhụ: Ndị okenye, na ndị isi nchụaja, na ndị ode-akwụkwọ aghaghị ịjụ Ya. A ghaghị igbu Ya. Ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị, Ọ ghaghị isi n’ọnwụ bilie.”

Ọ kọọrọ ha ihe a n’ezoghị ọnụ. Nke mere na Pita kpọọrọ Ya jee n’akụkụ, malite ịbara ya mba na ịta Ya ụta. Ma Jesu tụgharịrị, lee Ụmụazụ Ya anya, wee baara Pita mba sị: “Gafee M n’azụ, ekwensu!

N’ihi na ụdị echiche ị na-eche, adịghị ka nke Chineke; kama ị na-eche echiche ka mmadụ. Jesu bịakwara kpọkọta igwe mmadụ ahụ, na ndị Ụmụazụ Ya wee sị ha: “Onye ọ bụla chọrọ ịbụ onye na-eso M, ya jụ onwe ya; bịakwa buru obe ya sowe M.

Maka na onye ọ bụla chọrọ ichekwaba ndụ ya ga-atụfu ya. Ma onye ọ bụla tụfuru ndụ ya n’ihi M, na n’ihi Oziọma, ga-azọpụta ndụ ya.

Igbo Mass Readings for September 16 2024, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

Igbo Mass Readings for September 15 2024, Ụka nke Iri Abụọ na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Last Update: July 11, 2023