Igbo Mass Readings for September 17 2028, Ụka nke Iri Abụọ na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 17 2028, Ụka nke Iri Abụọ na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 32:7-11, 13-14

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ọpụpụ

Isi Okwu: Dinwenụ medara obi were hapụ ịta ndị nke Ya ahụhụ ahụ O kwuru na Ya ga-ata ha.

Dinwenụ gwara Mosis sị: “Ngwa! Gbadawa ọsọsọ, n’ihi na ndị nke gị ahụ ị kpọpụtara n’ala Ijipt emeela arụ. N’atụfughị mgbe, ha ahapụla ụzọ ahụ M gosiri ha.

Ha jiri ọla kpụọrọ onwe ha nwa ehi, bịakwa na-esekpuru ya, na-achụnyere ya aja, na-etiku ya na-asị: “Ụmụ Izrel, lekwanụ Chukwu ụnụ! Onye ahụ kpọpụtara ụnụ n’ala ljipt,” Dinwenụ wee gwa Mosis sị: “Ahụla M na ndị a bụ ndị oke isi ike.

Ngwa! hapụ M, ka M were iwe ọkụ kpochapụ ha. Kama, ka M were gị mere nnukwu obodo.” Ma Mosis rịọrọ Dinwenụ Chineke ya sị: “Onyenwe m, gịnị bụ na ị na-ewere iwe ọkụ ekpochapụ ndị nke Gị?

Ọ bụkwa ndị a ka I jiri aka, I jiri bụrụ dikeọgụ, kpọpụta n’ala ljipt? Chetakwa ụmụodibo Gị bụ Ebreham, Aịzik na Jekọp, ndị I jiri onwe Gị ñụọrọ iyi, bịakwa kwee ha nkwa sị: “Aga M eme ka ụmụ ụnụ bawanye dịka kpakpando ghasara n’igwe.

Aga M enyekwa ụmụ ụnụ ala niile ahụ M kwere na nkwa, ka ọ bụru oke ha ketara; na oke ga-abụgide nke ha ruo mgbe ebighị ebi.” Dinwenụ bịara wetuo obi. O meghịkwa ndị nke ya ihe ọjọọ ahụ Ọ bara na mba, na Ọ ga-eme ha.”

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 50:3-4. 12-13. 17. 19. Az. Luk 15:18

Azịza: Aga m ahapụ ebe a lakwuru nna m.

1. Onyenweanyị, meere m ebere n’obi ọma Gị.

Site n’uju obi ebere Gị sachapụ oke mmehie m.

Sachawa m, sachapụ m njọ m, wụchapụ m, na njọ m. Azịza.

2. Onyenweanyị, kenye m obi dị ọcha, tinyekwa mmụọ kwụsiri ike n’ime m.

A chụpụkwala m n’ebe Ị nọ;

a napụkwala m mmụọ Gị dị asọ. Azịza.

3. Onyenweanyị, meghee egbugbere ọnụ m,

ka ire m wee kwupụta otito Gị.

Aja m na-achụnyere Chineke bụ obi loghara elogha.

Onyenweanyị, eledakwala anya n’obi cheghara echegha na obi umeala. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:12-17

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara Timoti

Isi Okwu: Kristi bịara n’ụwa ka Ọ gbapụta ndị njọ.

Ana m ekele Jesu Kristi Onyenweanyị, Onye nyere m ike ịrụ ọrụ. Ana m ekele Ya n’ihi na Ọ gụnyere m n’onye kwesịrị ntụkwasị obi, wee họpụta m ijere Ya ozi; ọ bụ ezie na-abụ m onye na-ekwulu Chineke na mbụ, na onye na-esogbu ndị otu Kristi na onye na-emenye Chineke na ndị Ya ihere n’ihu.

Ma otu ọ dị, Chineke meere m ebere, n’ihi na emere m ihe ndị a n’amaghị ama, mgbe m na-ekwerebeghị na Kristi. Onyenweanyị wụkwasịrị m amara Ya n’ụba, ya na okwukwe na ịhụnanya nke kwesịrị ntụkwasị obi, kwesịkwa ka anara ya nke ọma n’ụzọ niile ọ bụla, na Kristi Jesu bịara n’ụwa ịzọpụta ndị mmehie, ndị mụ onwe m bụ onye isi ha.

Ọ bụ n’ihi nke a ka Chineke ji meere m ebere. O mere ka Jesu Kristi site n’ụzọ O si meso m, bụ onye isi ndị mmehie, gosi ogologo ntachi obi O nwere n’ahụ ndị mmehie niile.

O mekwara nke a ka ọ bụrụ ihe ọmụmatụ maka ndị ga-ekwere na Ya n’ọdịnihu, bụ ndị na-achọ ka ha nweta ndụ ebighị ebi. Ka otito niile na nsọpụrụ niile dịrị Chineke bụ Eze mgbe niile, Onye na-adịghị anwụ anwụ, nke a na-apụghị ịhụ anya, Onye naanị Ya bụ Chineke, mgbe niile ebighị ebi, ebighị ebi! Amen!

MBEKU – 2 Kọr. 5:19

Aleluya, aleluya!

Chineke nọ n’ime Kristi kpezie esemokwu dị n’agbata Ya na ụwa. O nyela anyị okwu Ya banyere mkpezi ahụ.

Aleluya!

OZIỌMA – 15:1-32

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Isi Okwu: Añụrị ga-adị n’eluigwe maka otu onye njọ nke chegharịrị echegharị.

Οtu mgbe, ndị ọna-ụtụ na ndị omenjọ bịara gbaa Jesu gburugburu, ka ha wee nụrụ okwuchukwu. Ndị Farisii na ndị Ode-akwụkwọ malitere ntamu sị: “Nwoke a na-anabata ndị omenjọ nke ọma; bịakwa soro ha na-eri, na-añụ,” N’ihi nke a Jesu wee tụọrọ ha ilu a sị: “Ọ bụrụ na otu onye n’ime ụnụ nwere narị atụrụ, otu n’ime ha efuo, gịnị ka ọ ga-eme?

Ọ bụ na ọ gaghị ahapụ iri atụrụ itoolu na itoolu ahụ fọdụrụ afọdụ, gaa ịchọ otu ahụ furu efu, ruo mgbe ọ ga-achọta ya. Mgbe ọ chọtara ya, ọ ga-ekuru ya n’ubu ya, na-añụrị ọñụ.

Mgbe o ruru ụlọ, ọ ga-akpọkọta ndị enyi ya na ndị agbata obi ya, sị ha: ‘Soronụ m ñụrịwa ọñụ! N’ihi na achọtala m atụrụ m ahuụ furu efu.” “Ana M agwa ụnụ na, n’otu aka ahụ kwa, a ga-enwe ụdị ọñụ ahụ n’eluigwe n’isi otu onye mmehie chegharịrị echegharị, karịa ndị ezi omume, iri itoolu na itoolu ndị ọ na-adịghị mkpa na ha ga-echegharị.

“Ma ọ bụ, e nwee nwanyị nwere mkpụrụ ọlaọcha iri, ọ bụrụ na otu n’ime ha adafuo, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ bụ na ọ gaghị amụnye ọkụ, zaa ụlọ ya, gbaa mbọ ịchọta ego ya ahụ furu efu?

Ọ bụrụ na ọ chọta ya, ọ ga-akpọkọta ndị enyi ya, na ndị agbata obi ya, sị ha: ‘Sonụ m ñụrịwa! N’ihi na achọtala m ego m ahụ furu efu. Ana M agwa ụnụ na, n’otu aka ahụ kwa, ndị Mmụọma Chineke ga-anụrị ọñụ n’isi otu onye mmehie chegharịrị echegharị.” [Jesu wee gwa ha: “Otu nwoke nwere ụmụ nwoke abụọ.

Nke nta n’ime ha wee sị nna ya: ‘Nna m! kee akụ na ụba gị, bunye m nke ruuru m. Nna ha wee kewaara ha mmadụ abụọ akụ na ụba ya. Mgbe abalị olemole gachara, nwa ya nwoke nke nta ahụ bukọtara akụ na ụba niile ahụ o ketara, wee gawa n’ala ndị mba ọzọ dị anya. N’ebe ahụ ka o sitere n’ibi ndụ aghara na ịla n’iyii, rifuchaa akụ na ụba ahụ o ketara.

“Mgbe akụ na ụba ya gwụrụ, oke ụnwụ bidoro n’ala ahụ, wee ‘ghụọ ya anya na ndụ’. Ọ gbalara na be otu ọgaranya, onye ebe ahụ, onye mere ya ohu na-azụ ezi.

Ọ bụrụ na e nyere ya mgbugbo nri ezi, obi ga-atọ ya ụtọ iji ya rijuo afọ. Ma o nweghị onye kwere enye ya ihe ọ bụla. Mgbe o mechara nweta onwe ya, ọ jụrụ onwe ya sị: ‘Mmadụ ole bụ ndị e goro ego n’ọrụ n’obi nna m?

O nweghị nke ọ bụla n’ime ha anaghị eriju afọ. Ma lee ka m nọ ebe a na-anwụ n’agụụ! Aga m ahapụ ebe a, lakwuru nna m, sị ya: “Nna m! Emehiela m Chineke, emehiekwala m gị!

Etosịghị m ka a kpọ m nwa gị ọzọ! Were m ka otu n’ime ndị i goro ego n’ọrụ!” “Ihe a ka o bu n’uche wee bilie ịlakwuru nna ya. Ma mgbe ọ nọrịị ebe dị anya na-alọta, nna ya lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, nwee ọmịko n’ahụ ya.

Nna ya gbaara ọsọ, makụọ ya, kelee ya. Ma nwa ahụ sịrị nna ya: ‘Nna m, biko, emehiela m Chineke, emehiela m gị! Ekwesịghị m ka a kpọkwa m nwa gị ọzọ. Ma nna ya sịrị ụmụ odibo ya: ‘Ngwa! meenụ ọsọsọ!

Yiwenụ ya uwe mwụda kacha ibe ya mma! Gbabanụ ya ọla n’aka! Gbabanụ ya akpụkpọ ụkwụ n’ụkwụ! Sekpụtanụ nwa ehi ahụ gbara abụba, gbuonụ ya, ka anyị kpọọnụ oriri, ñụrịkwaa ọñụ.

N’ihi na nwa m nwụrụ anwụ adịla ndụ ọzọ! A hụla nwa m ahụ furu efu!’ E wee bido oriri, na ịñụrị ọñụ. “Ma mgbe ihe ndị a na-eme, nwa ya nke diọkpara nọ n’ubi.

Mgbe ọ na-alọta, ruo nso n’ụlọ, ọ nụrụ ka ụda egwu na-akpọtụ, bịakwa hụ egwu a na-agba. O wee kpọọ otu odibo nna ya, wee jụwa ya ihe merenụ.

Odibo ahụ sịrị ya: ‘nwanne gị lọtara. Nna gị wee gbuo nwa ehi ahụ gbara abụba, n’ihi na ọ lọtara n’udo, na ahụ mgbasike. Ma iwe were diọkpara ahụ nke ukwuu.

O wee jụ ịbanye n’ụlọ. Nna ya pụtara, rịọwa ya ka ọ bata. “Ma ọ sịrị nna ya: “Kemgbe afọ ole ka m nọ, na-atara gị ahụhụ? O nwebeghị mgbe ọ bụla m nupuru isi n’ihe ị gwara m.

Ma ọ dịghị mgbe ọ bụla ị kpụnyere m, ma ọ bụna otu nwa mkpị, ka mụ na ndị enyi m rie, wee ñụrịa. Ma mgbe nwa gị nke a, ya na ụmụ nwanyị akwụna ripịasịrị ihe niile i ji biri, lọtara, i wee gbuoro ya nwa ehi ahụ gbara abụba!

Olee isi ya?’ Nna ya wee zaa ya: ‘Nwa m, mụ na gị nọ mgbe niile. Ihe niile m nwere bụkwa nke gị. O kwesịrị ekwesị ka anyị rie, obi tọọ anyị ụtọ, ka anyị ñụrịkwaa ọñụ, n’ihi na nwanne gị nwụrụ anwụ, bịakwara dị ndụ ọzọ; o furu efu, e wee hụ ya.

Igbo Mass Readings for September 18 2028, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for September 17 2028, Ụka nke Iri Abụọ na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

Last Update: July 11, 2023