Igbo Mass Readings for October 4 2026, Ụka nke Iri Abụọ na Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 4 2026, Ụka nke Iri Abụọ na Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:1-7

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya

Isi Okwu: Ubi vaịnị nke Onyenweanyị bụ ezi-na-ụlọ Izrel

Ugbu a, ka m kwee ukwe maka enyi m. Ukwe m na-ekwere enyi m gbasara ubi vaịnị ya. Enyi m kọrọ ubi vaịnị na nwa ugwu nta bụ ala na-eme nri. O gwuzere ala nke ọma, bịakwa wepụsịa nkume niile dị na ya.

Ọ kụrụ ọkachamma dị na mkpụrụ vaịnị n’ime ya. O wuru ụlọ elu maka iche nche n’ime ubi vaịnị ahụ, bịakwa wapụta ebe a na-apịpụta mmanya. Mgbe ahụ ka ọ bịara tụba anya inweta ọkachamma.

Kama ọkachamma, ihe ọ mịịrị ya bụ vaịnị ọhịa. Ugbu a, ndị bi na Jerusalem na ndị Juda niile, kpeerenụ m ikpe dị n’agbata m na ubi vaịnị m. Kedụ ihe ọzọ m kwesịrị imere ubi vaịnị m, nke m na-emebeghị?

Mgbe m tụrụ anya inweta ọkachamma dị na vaịnị, gịnị kpatara o ji mịara m vaịnị ọhịa? Ugbu a, aga m agwa ụnụ ebumnobi m maka ubi vaịnị m. A ga m ewepụsị ogige a gbara ya, ka ọ ghọọ ebe ụmụ anụmanụ na-akpara nri.

A ga m akwada mgbidi e wuru ya, ka a zọtọọ ya n’ụkwụ. N’ezie, aga m ala ya n’iyii. A gaghị m asụchakwa ya ọzọ, ma ọ bụ kọsa ya ọgụ. A ga m ahapụya ka ogwu na uke too n’ime ya.

Aga m enye igwe ojii iwu ka ọ ghara izosa mmiri n’ubi ahụ. Ubi vaịnị Onyenweanyị nke igwe ndị agha bụ ụlọ Izrel. Mkpụrụ akụkụ ahụ dị ya n’obi bụ ndị Juda. Ebe ọ chọrọ ikpe ziri ezi ka ọ hụrụ ịkwafu ọbara. O lere anya ezi omume, wee hụ iti mkpu.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 79:9, 12-16, 19-20. Az. Aịz.5:7

Azịza: Ubi Vaịnị nke Onyenweanyị bụ ụlọ nke Izrel.

1. Nwa osisi vaịnị I siri n’Ijipt foro,

wee chụsaa mba dị iche iche iji kụnye ya.

Ngalaba ya gbasara wee ruo n’oke osimiri.

Ome ya garuru n’osimiri.

Azịza: Ubi Vaịnị nke Onyenweanyị bụ ụlọ nke Izrel.

2. N’ihi gịnị ka I ji kwada ogige a gbara ya,

nke na, ndị ọganụzọ na-aghọrọ mkpụrụ ya otu o si masị ha?

Ezi-ọhịa na-atakwosi ya.

Ụmụ anụ ọhịa jiri ya mere nri.

Azịza: Ubi Vaịnị nke Onyenweanyị bụ ụlọ nke Izrel.

3. Onyenweanyị nke igwe ndị agha,

biko sikwa n’igwe ledata anya ọzọ.

Ị hụla! Kpachapụrụ osisi vaịnị a anya.

Chekwaba ihe I jiri aka nri Gị kụọ.

Azịza: Ubi Vaịnị nke Onyenweanyị bụ ụlọ nke Izrel.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:6-9

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ ozi Pọl dị asọ degaara Ndị Filipịa

Isi okwu: Chineke nke udo ga-anọnyere ụnụ.

Ụnụ echegbula onwe ụnụ n’ihe ọ bụla. Kama, n’ihe niile, werenụ ekpere, na-arịrịọ, na ekele mee ka Chineke mara ihe na-akpa ụnụ. Udo nke Chineke, nke kariri nghọta nke mmadụ, ga-echedo obi ụnụ na echiche ụnụ n’ime Kristi Jesu.

Ụmụnna m, na nkwubi okwu, meenụ ka obi ụnụ jupụta n’ihe niile bụ ezi okwu, ihe niile kwesịrị nsọpụrụ, na ihe niile e jiri amara mee. Ọ bụrụ na ọ dị ihe ọ bụla mabigara mma oke, ma ọ bụ nke kwesịrị otito karịsịa, na-echenụ uche banyere ihe ndị a.

Na-emenụ ihe niile ụnụ mụtara na ndụ m na nke ụnụ natara n’aka m, na ihe niile ụnụ nụrụ n’ọnụ m, na nke ụnụ hụrụ n’omume m. Chineke nke udo ga-anọnyekwara ụnụ.

MBEKU – Eph. 1, 17-18

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị meghee obi anyị, ka anyị nụ okwu nke Nwa Gị.

Aleluya!

OZIỌMA – 21:33-43

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Ọ ga-ewere ubi vaịnị ahụ nyefee n’aka ndị ọrụ ngo ọzọ.

Jesu gwara ndị isi nchụaja na ndị okenye sị: “Nụrụnụ ilu ọzọ: Otu onye kọrọ ubi vaịnị n’ala ya, gbaa ya ogige gburugburu; tinye ebe a ga-apịpụta mmanya, bịakwa wuo ulo elu n’ubi ahụ.

Mgbe ahụ ka o weere ubi vaịnị ahụ, nyefee n’aka ndị na-elekọta ubi ahụ, wee gawa obodo ọzọ. “Mgbe o ruru oge owuwe ihe ubi, onye nwe ubi zipụrụ ụmụ odibo ya, ka ha natara ya ndị na-elekọta ubi ahụ, oke ruuru ya.

Ma ndị na-elekọta ubi ahụ, jidere ụmụ odibo ya; merụọ otu ahụ, kụgbuo otu akụgbuo, tụọ nke ọzọ nkume. “Ọzọ, o zigakwara ụmụ odibo ọzọ karịrị ndị nke mbụ n’ọnụ ọgụgụ. Ma ndị ọrụ ubi ahụ mekwara ha, ihe ha mere ndị mbụ.

N’ikpeazụ, o zigara ọkpara ya, sị: ‘Ha ga-asọpụrụ ọkpara m. Ma mgbe ndị ọrụ ubi ahụ hụrụ ọkpara ya, ha gbara izu n’etiti onwe ha sị: ‘Onye a bụ onye ga-eri ya ekpe!

Bịanụ ka anyị gbuo ya, were ihe niile ahụ, ọ ga-erite n’ekpe! Ha wee gide ya, sepụ ya n’ubi vaịnị ahụ, gbuo ya. Mgbe onye nwe ubi vaịnị bịara, gịnị ka ụnụ chere ọ ga-eme ndị ahụ o tinyere ilekọtara ya ubi ya?”

Ha wee sị Ya: “Ọ ga-ala agbụrụ ọjọọ ahụ n’iyi, n’ụzọ jọrọ njọ, bịakwa were ubi ya tinye n’aka ndị nlekọta ọzọ, ndị ga-enye ya oke ruuru ya na mgbe ya.” Jesu wee sị ha: “Ọ bụ na ụnụ agụtabeghị ya n’Akwụkwọ Nsọ? ‘Na nkume ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ, aghọọla ide bu ụlọ!

Ihe a bụ aka ọrụ nke Onyenweanyị! Ọ gbara anyị gharị, mgbe anyị hụrụ ya!’ “N’ihi nke a, ka M ji sị ụnụ: ‘A ga-anapụ ụnụ Alaeze Chineke, were ya nye ndị mba ọzọ, ndị ga-amịta ezigbo mkpụrụ n’uju.”

Igbo Mass Readings for October 5 2026, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

Igbo Mass Readings for October 4 2026, Ụka nke Iri Abụọ na Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.